Akwamozu mmadụ 22 nwụrụ mgbe ha gara iketa osikapa n'Okija, Anambra Steeti
A kwaala ozu mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ na nzọgbu nzọgbu mere n'ebe a na-eke osikapa n'Okija, Anambra Steeti n'ụbọchị 21 Disemba afọ 2024.
E mere ofufe akwamozu ha niile n'obodo Okija n'ụbọchị Fraịde 10 Disemba 2025 bụ ebe ndị ezinaụlọ nwụrụ anwụ, ndị obodo, ndị ndu obodo na ndị ọzọ kwanyeere ndị a ugwu ikpeazụ.
Ọ bụ ụlọọrụ enyemaka bụ Obijackson Foundation kere osikapa ahụ haziri ya bụ ofufe akwamozu, ebe onye nwee ya bụ Ernest Obiejesi tiri ezinaụlọ ndị a nwụrụ aka n'obi.
O kwere nkwa na ọ agaghị agbanarịpụ ezinaụlọ ndị a nwụrụ na ọ ga-akwado ha n'ụzọ ego nakwa n'ihe ndị ọzọ.
Igwe obodo Okija bụ Igwe Nnamdi Okezie gwara ndị obodo ya niile ka ha kara obi n'ọdachi dakwasịrị ha ma sị na ọ bụghị ihe e kere eke.
Ugbua, ezinaụlọ ọbụla na-elibeghi onye maọbụ ndị nke ha nwụrụ anwụ ga-agazi n'ihu lie ha.
Ndị uweojii kwuru na mmadụ 22 nwụrụ na

Ebe foto si, Screenshot
Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ na nzogbu nzọgbu mere ebe a na-eke osikapa n'obodo Okija nke okpuruọchịchị Ihiala dị n'Anambra Steeti na Satọde 21 Disemba, 2024.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga mere ka a mata nke a n'ozi o wepụtara ma kwuo na Kọmshọna uweojii bụ Nnaghe Obono Itam mere njem nleta n'ụlọọgwụ ebe ọtụtụ ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ.
N'okwu ya, "kọmishọna uweojii bụ Nnaghe Obono Itam mere njem nleta n'ụlọọgwụ ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ, o ji obi mgbawa kwuo na mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ n'ọdachi ahụ.
"Kọmishọna gakwara n'ihu tie ezinaụlọ ndị o metụtara aka n'obi ma kwuo ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa."
Ikenga kwukwara na ha ka na-eme nnyocha banyere etu ọdachi a si mee.
Gọomentị Anambra Steeti kwara arịrị maka ọnwụ ndị a

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
Gọọmentị Anambra Steeti kwara arịrị maka ndị a nwụrụ n'ebe ha gara iketa osikapa n'Okija.
Gọvanọ Chukwuma Soludo mgbe ọ na-ekwupụta arịrị ahụ, zigaara ezinaụlọ ndị o metụtara ozi itiaka n'obi, ọkachasị ụmụnwaanyị, ndị okenye, nwaanyị dị ime nakwa ndị na-eche nwa ara.
N'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Christian Aburime wepụtara, gọọmentị kwuru na ọ bụ ụlọọrụ Obi Jackson Foundation nke nwafọ Anambra bụ Ernest Obiejesi nwe haziri ya bụ ọgbakọ ikesa osikapa.
Ha kwuru na ebumnobi nwamadị a bụ inyere ndị obodo aka site n'ikesa akụrụngwa nri n'oge emume a, kama na ọ bụghị ya ga-eme ka a ghara ịhazi ihe ọfụma ka a na-eme nke a.
O kwukwara na ha amalitela ime nnyocha ịchọpụta etu ihe a si mee.
Ihe ụlọorụ Obijackson kere osikapa ahụ kwuru

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọorụ Obijackson Foundation eruola uju n'ihi ọdachi mere oge ha na-ekesara ndị mmadụ osikapa n'ọgbọ egwuruegwu Amaranta stadium dị n'Okija, Anambra steeti.
N'ozi ụlọọrụ Obijackson Foundation wepụtara n'ụbọchị Satọde 21 Disemba 2024, ha kwuputara na mmemme ahụ bụ nke ha na-eme kwa afọ iji kwalite ndụ ndị ụwa na-atụ n'ọnụ n'oge Ekeresimesi.
Ha jiri ozi ahụ kasie aka na-achi Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo obi, tinyere ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ nakwa ndị obodo Okija niile.
Mpaghara ozi ahụ kwuru sị "Ihe ọdachi a etiwaala anyị obi. Mmemme nkesa osikapa anyị na-eme kwa afọ bụ nke anyị ji egosi ịhụnanya ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ itinye ọṅụ n'ime obi ndị ụwa na-esiri ike. Na o butere ụdị iru uju dị etu a bụ nke na-ewute karịa ka ọnụ pụrụ ịkọ."
Ụlọọrụ ahụ gara n'ihu kelee ndị nchekwa na ndị ọrụ gbatagbata maka ịgbata ọsọ enyemaka n'oge dịka mbọ ndị ha gbara belatara ọnụọgụ ndị ọdachị ahụ gaara adakwasa.

Ebe foto si, @ObijacksonF/X
Etu ọdachi a si mee

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'Okija dịka ha gbakọrọ iketa osikapa na ihe enyemaka ndị ọzọ otu nwaafọ Okija na-eke maka emume ekeresimesi.
Dịka ozi si n'aka ndị uweojii si kwuo, na njiji ahụ jiri n'ụtụtụ Satọde 21, Disemba, 2024 dịka ọtụtụ ndị obodo ahụ dị n'Okija gbakọrọ ebe ha ga-eketa ihe enyemaka ahụ.
Mana tupu a malite ikesa osikapa ahụ, ndị mmadụ malitere ịbọ ihe onyinye ndị ahụ ụbọ nke mere ka a nzọgbu nzọgbu dị ebe ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ ma ndị ọzo merụọ ahụ
Ihe oyonyo na-efegharị na soshal midia gosịrị ọzu ụfọdụ mmadụ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụnwaanyị e kwuru na a zọgburu ebe ahụ.
Ebe ndị ọzọ a zọgburu mmadụ

Ebe foto si, NIGERIA POLICE FORCE
Cheta na a zọgburu opekatampe mmadụ iri (10) oge a na-ekesara ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na ndị okenye ihe oriri n'ụlọụka Holy Trinity Catholic Church dị na Maitama Abụja ụbọchị Satọde 21 Disemba, 2024.
Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun sịrị na ọ bụ nleghara anya nke ndị haziri mmemme ahụ butere ọnwụ mmadụ ndị ahụ.
N'aka nke ọzọ, a zọgburu ụmụaka iri atọ na ise n'Ibadan dị n'Oyo steeti n'ụbọchị Wenezde 18 Disemba 2024, na nzogbu-nzogbu mere n'ebe a na-eke osikapa nke ọ bụ Naomi Ogunseyi haziri.










