'Nwa m gwara m ka m mere ya soya milk tupu ha abata akwụkwọ, amaghị m na ọ bụ anya ikpeazụ m ga-ahụ ya'

Emmanuella Orakwelụ

Ebe foto si, Orakwelu family

Nkọwa foto, 'Nwa m gwara m ka m mere ya soya milk tupu ha abata akwụkwọ, amaghị m na ọ bụ anya ikpeazụ m ga-ahụ ya'

Otu nwaanyị nwa ya nwụrụ n'ụlọakwụkwọ dara na Jos n'izu uka gara aga, ekwuola etu ụlọakwụkwọ ahụ dara si gbuo otu nwa ya ma meru nke ọzọ ahụ.

Ụlọakwụkwọ Saints Academy dị na Jọs, isiobodo Platu steeti dara ụbọchị Fraide dagbuo ihe ruru ụmụakwụkwọ 20, merụọ ọtụtụ ahụ.

Nwaanyị ahụ aha bụ Oriakụ Ujunwa Orakwelu, onye Agulu dị n'okpuru ọchịchị Aniocha dị na Anambara steeti gwara BBC Igbo na ọ bụ onye agbataobi ya gwara na ụlọakwụkwọ ụmụaka ya dara.

"Ka onye agbataobi m jụrụ m ka ụmụaka a gara akwụkwọ ụbọchị Fraịde ahụ, obi mapụrụ n'ihi na e cherem na e nwere ọgbaghara na Jos, amaghị m na ọ bụ ọdachi ụlọ dara ada."

O kwuru na mgbe a gwara Ujunwa na ụlọakwụkwọ ụmụaka dara, ọ kpọrọ di ya, ha wee gbara ọsọ gawa ụlọakwụkwọ ahụ.

Oriakụ Orakwelu, onye gbara ama na ha si Ọwụwa Anyanwụ kwaga Jọs ọhụrụ maka azụmahịa kwuru sị, "Ka anyị na-eruta nso n'ụzọ ụlọakwụkwọ ahụ, ị gaghị ekweta na mmadụ ga-esi n'ụlọ ahụ pụta maka na ọ dara piata piata."

Ndị ọrụ gbata gbata na-achọ ịzọpụta ụmụakwụkwọ ka tọọrọ ebe ahụ

Ebe foto si, Getty

Nkọwa foto, Ebe ụlọ elu dara n'Abuja n'afọ 2023

"Anyị hụrụ ọtụtụ mmadụ ebe ahụ ka anyị rutara. Di m gara zụta ihe e ji egwu ala. Ndị mmadụ nọ ebe ahụ nyere aka na mbọ a gbara ịzọpụta ụmụaka ihe metụtara."

Otu onye gwara Ujunwa na a zọpụtala otu nwa ma buru gawa ụlọọgwụ.

"Mgbe m nụrụ ozi, mụ na di m gara n'ihu na-achọ nwa m nke ọzọ ka anyị mara ka anyị a ga-ahụ ya," ka o kwuru.

Ka obere oge gasiri, Ujunwa na di gara ụlọọgwụ ka ha hụ nwa ahụ meruru ahụ.

"Anyị gara ọtụtụ ụlọogwụ tupu anyị hụ nwa m. Ndị dọkịta gwara m na ọ gbajiri aka mana ha na-enye ya nleta."

Ọ gara n'ihu kwuo, "Anyị gara ụlọọgwụ JUTH na ndị ọzọ ebe anyị na-achọ nwa m nke ọzọ. Mana ka ọ kụrụ elekere asaa nke mgbede, mmadụ kpọrọ di m si ya bia ọba ozu ụlọọgwụ OLA ebe e gosiri ya nwa ya nwaanyị aha bụ Emmanuela Ujunwa Orakwelu gbara afọ 13 so na ndị nwụrụ anwụ"

Ujunwa kwuru na "Tupu nwa m nwaanyị agawa akwụkwọ ụbọchị ahụ, ọ gwara m ka m mere ya soya milk tupu ha abata akwụkwọ, mana amaghịm na ọ bụ anya ikpeazụ m ga-ahụ"

Ọ gbakwunyere na nwa ya nke ọzọ ka na-anata nleta n'ụlọọgwụ, dịka ha na-atu anya na ọ ga agbake n'oge na-adighị anya.

Gọvanọ Plateau Steeti ekwuola na-aga enwe abalị atọ iru uju maka ụmụakwụkwọ 22 ahụ nwụrụ na Jos

Foto Gọvanọ Plateau Steeti Caleb Mutfwang

Ebe foto si, Caleb Mutfwang X/NEMA X

Nkọwa foto, Foto Gọvanọ Plateau Steeti Caleb Mutfwang

Gọvanọ Plateau steeti bụ Caleb Mutfwang ekwuola na a ga-enwe ụbọchị iru uju abalị atọ nke ga-amalite taa bụ Satọde Julaị 13 ruo Monde 15 Julaị.

O mere ka amata na ọkọlọtọ obodo ga-efe n’ọkara mast ụbọchị atọ ahụ iji kwanyere ụmụakwụkwọ 22 ahụ nwụrụ n’ụlọelu ahụ dara na mpaghara Busa-buji n’okpuruọchịchị Jos North n'ụtụtụ Fraịde 12 Julaị, 2024.

Gọvanọ Plateau Steeti emechiela ụlọakwụkwọ ahụ dagburu ụmụakwụkwọ 22 na Jos

Gọvanọ nyere iwu a dịka ọ gachara mgbaru n'ebe ahụ

Ebe foto si, Caleb Mutfwang/Getty Images

Gọvanọ Plateau Steeti bụ Gabriel Mutfwang enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ Saints Academy bụ ụlọelu ogogo abụọ dara ma gbuo ụmụakwụkwọ 22 n'ụtụtụ Fraịde 12 Julaị, 2024.

Gọvanọ nyere iwu a n'ụbọchị Satọde mgbe ọ gara mgbaru n'ebe ụlọakwụkwọ a dara.

Ọ gakwara n'ihu kwuo ka a nwụchie ndị ọrụ ngwupụta ihe na-egwupụta ihe na gburu gburu ebe obibi ndị mmadụ na steeti ahụ.

Ndị ọrụ gbata gbata na-achọ ịzọpụta ụmụakwụkwọ ka tọọrọ ebe ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Ndị bi gburu gburu ebe ahụ kwuru na a na-egwupụtabu ihe n'ala ahụ tupu a rụọ ya ụlọakwụkwọ a. A na-eche na ọ bụ n'iyi ihe ndị a na-egwupụta ebe ahụ mere ụlọ a jiri daa.

Ndị uweojii na Jos kwuru na ọ bụ ụmụakwụkwọ 154 ka ụlọahụ dakwasịrị, a zọpụtara mmadụ 132 n'ime ha bụ ndị na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Ụlọakwụkwọ Saints Academy a dị na Busa-buji n’okpuruọchịchị Jos North zere dịka ọmụmụ ihe ka na-aga n’ihu.

Igwe mmadụ jupụtara n’ụlọakwụkwọ ahụ ebe ndị nne na nna na-achọ ụmụ ha. Ọtụtụ ndị hụrụla ozu ụmụ ha bere nnukwu akwa na-ekweghi odidi.

Ụlọakwụkwọ dara na Jos

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọrụ gbata gbata na Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency na ndị ọzọ na-agba mbọ ịzọpụta ụmụakwụkwọ ndị ka tọrọ n’ụvụrụ aja a.

N’ozi ha wepụtara n’akara soshal midia X, kwuru na ha azọpụtala ihe karịrị ụmụakwụkwọ iri anọ (40) ebe ọtụtụ ndị anwụọla mana a mabeghi kpọmkwem ọnụọgụgụ ha.

N’aka nke ọzọ kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Musa Ashoms kwuru na a zọpụtala ụmụakwụkwọ ruru 154, n’ime ndị a na mmadụ 22 anwụọla.

“N’ihe dịka elekere isii nke mgbede, egwupụtara mmadụ 154, n’ime ndị a e kwupụtala ọnwụ mmadụ 22 ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ nọ n’ụlọọgwụ dị iche iche anata ọgwụgwọ”.

“Gọvanọ Mutfwang enyela iwu pụrụiche ka ụlọọgwụ a nabata ndị niile merụrụ ahụ n’ihi ọdịda ụlọakwụkwọ ahụ.”

A sị na ụlọakwụkwọ nwere ụmụakwụkwọ karịrị otu puku n’ọnụọgụgụ.

Ndị ọrụ ahụike na-akpọ oku ka ndị mmadụ bịa nye ọbara n’efu iji zọọ ndụ ndị kwafuru nnukwu ọbara.

'Ụlọakwụkwọ a dara n'ihu anya m'

Anya hụrụ ka o si mee kọwara ihe ọ hụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Otu anya hụrụ ka ọdachi a si mee gwara BBC na ọ nọ n’ihu otu ụlọahịa dị n’ihu ụlọakwụkwọ mgbe ọ nụrụ nnukwu ụzụ.

“Mgbe m nụrụ ụda ahụ, ajụrụ m gịnị na-eme, m wee lepu anya hụụ na ụlọelu ogogo abụọ ahụ adaala ebe ụmụakwụkwọ nọ n’ime ya na-ele ule, anyị ji ọsọ gbaga ebe ahụ na-amaghị ihe anyị ga-eme maka na anyị ejighi ngwa ọrụ e nwereike iji zọpụta ndị tọrọ ebe ahụ.”

O kwuru na ha gbalịrị ike ha ịzọpụta mmadụ ole ma ole tupu ndị ọrụ gbata gbata erutezie ebe ahụ.

Foto si n’ụlọakwụkwọ ahụ dara

Ụlọakwụkwọ nwere ụmụakwụkwọ karịrị otu puku

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A sị na ụlọakwụkwọ nwere ụmụakwụkwọ karịrị otu puku
Ndị mmadụ gbakọrọ na-ekiri ụlọakwụkwọ a dara ada

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ na-ekiri ụlọakwụkwọ a dara ada
 Ụmụakwụkwọ na-ele ule mgbe ụlọakwụkwọ a dara

Ebe foto si, Getty

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ na-ele ule mgbe ụlọakwụkwọ a dara
Mgbe ndị ọrụ gbata gbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị ka tọọrọ n'ụvụrụ aja

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe ndị ọrụ gbata gbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị ka tọọrọ n'ụvụrụ aja