Ụlọelu ọzọ adakwala n'Ọnịcha, otu onye nwereike ka tọrọ n'ime ya

N'ime izu abụọ ụlọelụ dara n'Oduigbo n'ahịa Ọchanja n'Ọnịcha Anambara steeti, ụlọelu ọzọ adakwala na steeti ahụ.
Ụlọelụ dị ogogo ise a ka na-arụ arụ dara ụbọchị ụka abalị 10 ọnwa Maachị na mpaghara Fegge n'Ọnịcha, Anambara Steeti.
Oge BBC Igbo gara ebe ụlọ ahụ dara ịhụ ihe mere, anyị zutere uzuzu ụlọ ahụ dị n'akụkụ ụlọ ndị ọzọ ebe ndị mmadụ bi.
Mana o nweghi onye ọrụ gọọmentị nọ ebe ahụ.

Ndị nọ oge ihe ahụ mere kwuru na ụlọ ahụ dara n'elekere ise nke isiụtụtụ ụbọchị ụka.
Otu onye gwara BBC Igbo okwu aha ya bụ Ismaila Usman kwuru na ọ bụ oge ya kpechara ekpere ụtụtụ ka ụlọ ahụ dara. N'okwu ya, "ekpechala m ekpere oge anyị malitere ịnụ mkpọtụ, anyị gbara ọsọ gbapụ, oge o mechara anyị alọghachite azụ."
"Ndị otu anyị nọ n'ime ya oge o mere dị mmadụ ise mana oge anyị gbachara ọsọ lọghachite azụ, anyị gara dọpụta ndị tọrọ n'ime uzuzu."
Onye ọzọ anyị na ya kwuru kpọpụtara aha ya ka Yusuf kwuru na ya onwe ya meruru ahụ dịka ha zọpụtachara ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ.
N'okwu ya, "ndị Igbo nyere anyị aka dọpụta ndị tọrọ n'ime ebe ahụ mana o nweghi onye nwụrụ n'ime ya."
"Otu onye ka nọ n'ime uzuzu ahụ" - Yusuf

Yusuf gwara BBc Igbo na ha chere na otu onye ka tọọrọ n'ime uzuzu ahụ.
Oge BBC Igbo jụrụ ya ihe o jiri chee nke a, n'okwu ya, 'anyị hụrụ ya oge ọ gara zụta akpụ ma banye n'ime ụlọ ahụ, o hiri n'ime ụlọ ahụ ma ọ pụtabeghi ruo ugbua, anyị ahụbeghikwa ya ruo ugbua."
Ha kwuru na ha akpọọla ekwentị ya, ọ kụchaa ma o nweghi onye zara ya.
Gọọmentị Anambara steeti ekwuola na ha kelere Chukwu maka na o nweghi onye nwụrụ n'ihe mberede ahụ.
Onyeisi Anambara State Physical Planning Board, Chike Mmaduekwe kwuru na gọọmentị nyere onye nwe ụlọ ahụ ikike ịrụ ụlọelụ ogogo atọ, o nupu isi rụọ ogogo ise.









