"Ọ bụ ntigbu ka e tigburu nwanne m, ọ bụghị kansa gburu ya" - Ejima Osinachi

Amarachi Eze na Osinachi Nwachukwu
Nkọwa foto, Amarachi Eze gbara akaebe n'ụlọikpe, n'ikpe a na-ekpe Peter Nwachukwu bụ di ejima ya, Osinachi

Ejima Osinachi Nwachukwu bụ Amarachi Eze, agwala ụlọikpe na ọ bụghị ọrịa kansa gburu nwanne ya nwaanyị, ka ọ bụ oke iti ihe di ya na-eti ya.

Amarachi kwuru nke a n'ụlọikpe dị n'Abuja n'ụbọchị Tuzde, dịka ọ gbara akaebe n'ikpe a na-ekpe di Osinachi bụ Peter Nwachukwu.

Osinachi Nwachukwu bụ onye otiegwu ụka a ma ama nke lara mmụọ n'ọnwa Eprel 2022, mana a na-ebo ebubo na ọ bụ di ya ji aka tigbuo ya.

N'akaebe ya, Amarachi kwuru na ugboro ugboro ka Osinachi na-agwa ya na ya amaghị mere ihe mere di ya ji eti ya ihe ka anụmanụ.

Lee nchịkọta ihe o kwuru:

  • Oge ụfọdụ, Peter na-agba Osinachi ụkwụ n'obi ma ọ na-eti ya ihe.
  • Oge Osinachi dị ime nwa mbụ ya, Peter tiri ya ihe nke mere ke e buga ya ụlọọgwụ n'Enugwu.
  • N'otu oge, Osinachi kwuru na di ya ji 'mop' e ji ehicha ihe kụgide ya ihe ọ gbajie n'ahụ ya.
  • Oge e bugara Osinachi n'ụlọọgwụ etiti dị n'Abuja, di ya bụ Peter gara n'ihu na-emegbu ya.

Amarachi kwuru na ya nọ n'ụlọọgwụ oge Peter wetara mpụtara nnyocha nke kwuru na Osinachi enweghị kansa; nke a pụtara na ọ bụghị ọrịa kansa gburu ya.

Ụmụ Osinachi Nwachukwu abụọ ga-agba akaebe megide nna ha - Ọkaikpe

Osinachi Nwachukwu na di ya
Nkọwa foto, Gọọmentị Naịjirịa na-ebo Peter nwachukwu (yi mkpuchi imi) ebubo igbu nwunye ya bụ Osinachi Nwachukwu

Ọkaikpe N.K Nwosu Iheme, enyela iwu na ụmụ Osinachi Nwachukwu ga-eso gbaa akaebe n'ikpe a na-ekpe nna ha bụ Peter nwachukwu, maka ebubo igbu nne ha.

Tuzde, ụbọchị 21 nke ọnwa Jun, bụ ụbọchị nke abụọ ikpe Peter Nwachukwu malitere n'ụlọikpe dị n'Abuja, maka ebubo imekpa nwunye ya ahụ nke butere ọnwụ ya.

Aderonke Imana bụ ọkaiwu gọọmenti rịọrọ ụlọikpe ka e nye ohere ka ụmụ osinach abụọ soro gbaa akebe n'ikpe ahụ.

Ọ rịọkwara ka ụlọikpe kwe ka ụmụaka ahụ kpuchie ihu ha oge ha na-agba akaebe iji chekwaa ha.

Ọzọkwa bụ ka a ghara idu ha n'iyi tupu ha amalite ịgba akaebe ahụ, n'ihi na ha erubeghị afọ iri na asatọ.

Nke atọ bụ ka ndị niile ya bụ ikpe agbasaghị pụọ n'ime ụlọikpe oge ụmụaka ahụ ga-agba akaebe.

Ọkaikpe Nwosu-Iheme kwenyere n'arịrịọ ndị a ma nye iwu na ụmụaka ahụ ga-eso gbaa akaebe.

Akaebe nne Osinachi Nwachukwu gbara n'ụlọikpe maka ọnwụ nwa ya

Osinachi Nwachukwu na Nne ya

Nne Osinachi Nwachukwu agbaala akaebe n'ụlọikpe dịka a malitere ikpe Peter Nwachukwu ikpe maka igbu ọchụ.

Dịka ya bụ ikpe malitere n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja taa bụ Mọnde, abalị iri abụọ nke ọnwa Jun 2022, Nne Osinachi bụ Caroline Madu kwuru na anya ikpeazụ ọ hụrụ nwa ya nwaanyị bụ n'ọnwa Disemba 2021, n'ọgbakọ ndị ụka ha.

Caroline Madu, nne Osinachi, kwuru sị: "Oge Osinachi na-arịa ọrịa, achọrọ ịbịa leta ya, mana ọ gwara na ọ ga-ebu ụzọ rịọ di ya, maka na ọ bụrụ na mụ bịa, di ya ga-egbu ya."

O ji anya mmiri gwa ụlọikpe ahụ na Peter Nwachukwu kwuru na ọ bụ onye oziọma oge ọ bịara ịlụ nwa ya nwaanyị bụ Osinachi, "mana kamgbe ọ lụrụ ya, ọ na-akụ ya ihe dịka Kapịnta na-akụ osisi".

Oriaku Madu gara n'ihu kwuo na mgbe niile Osinachi dị ime, di ya na-eti ya ihe, "oge m chọrọ ịbịa nọnyere ya n'afọ ime, di ya ekweghị".

O kwuru na e nwere otu oge ya dara n'ọrịa, ndị mmadụ rịọrọ Peter Nwachukwu ka o kwere ka ọ bịa n'ụlọ ya n'Abuja iji gaa ụlọọgwụ.

"N'oge ahụ, echetara m otu ụbọchị anyị gara ekpere n'ụlọụka, mana Peter gbahapụrụ mụ na Osinachi ebe ahụ, buru ụmụ ya n'ụgbọala lawa," Oriaku Madu kwuru.

Osinachi Nwachukwu

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Egwu buputere Osinachi bụ "Ekwueme" nke ya na Prospa Ochimana tiri

Gbasara ọnọdụ ahụike nwa ya nwaanyị, Oriaku Madu kwuru na Osinachi gwara ya na o nwere ọrịa 'ulcer', mana ọ bụ di ya na-ekwu na ihe gburu ya bụ kansa ngụgụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'elekere asaa nke abalị ụbọchị Osinachi nwụrụ, oge akụkọ gbasarala na redio, TV nakwa soshal midia, ka di ya bụ Peter kpọrọ ya ịkọrọ ya na nwa ya nwaanyị alaala mmụọ.

Oge ọkaiwu Peter Nwachukwu gbara ya ajụjụ ọnụ, oriaku Madu kwuru na ya amaghị ma nwa ya o nwere ọrịa ọzọ ọ rịara, karịa 'ulcer' nke ọ gwara ya maka ya.

Lee ebubo e boro Peter Nwachukwu

Peter Nwachukwu
Nkọwa foto, Pete Nwachukwu (yi akwa ọcha) bụ di Osinachi Nwachukwu, onye a na-ebo ebubo na ọ bụ ya gburu nwunye ya

Ha dị ebubo iri abụọ na atọ nke gọọmentị Naịjirịa boro Peter Nwachukwu gbasara imekpa nwunye ya bụ Osinachi ahụ nke butere ọnwụ ya.

Ebubo ndị a gụnyere:

  • Iji aka ike chụpụ mmadụ n'ụlọ di ya
  • Isi n'ime ụgbọala na-agba agba, kwapụ nwunye ya bụ Osinachi.
  • Ịnapụ Osinachi ikike nnwere onwe ya nke Bekee na-akpọ 'personal liberty'.
  • Iji okwu ọjọọ dị icheiche emekpa Osinachi ahụ. Bekee kpọrọ ya 'verbal ana psychological abuse'.
  • Ịnapụ Osinachi ikike iji ego ya gboo mkpa dịịrị ya.
  • Iji aka ike kewapụ Osinachi n'ebe nne ya na ụmụnne ya nọ
  • Imekpa ụmụ ya ahụ site n'iti ha ihe ugboro ugboro
  • Igbochi ụmụ ya ime mkpesa gbasara etu o si emekpa nne ha bụ Osinachi ahụ; dgz