Osinachi Nwachukwu Burial: Etu mmemme akwamozu ya si gaa taa n'Isuochi

Osinachi Nwachukwu Burial

Taa bụ Satọde, ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Jun 2022, ka a dọnyere ahụ Osinachi Nwachukwu, bụ otiegwu ụka a ma ama, n'ime ili.

Osinachi lara mmụọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprel 2022, n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti dị n'Abuja.

Anya mmiri na akwa arịrị ka ndị enyi, ndị ikwu na ibe, ụmụ, nakwa ndị ezinụlọ ya niile ji sị ya jee nke ọma.

E liri Osinachi Nwachukwu na be nna ya bụ Isuochi, nke dị n'Abia Steeti, n'agbanyeghị na di ya bụ Peter Nwachukwu bụ onye Ukpor dị n'Anambra steeti.

Ihe kpatara nke a bụ maka na ezinụlọ Osinachi na-ebo ebubo na ọ bụ di ya bụ Peter ji aka tigbuo ya.

Ha kwuru na oge Osinachi dị ndụ, di ya ekweghị ka ya na ụmụnne ya nwee mmekọrịta ọbụla.

Peter Nwachukwu
Nkọwa foto, Peter Nwachukwu (yi akwa ọcha) di Osinachi nọ n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka a na-ekpe ya ikpe maka igbu ọchụ

Ha na-ekwukwa na Peter na-akụ Osinachi ihe kapịnta na-akụ osisi oge ọbụla ọ masịrị ya.

Ha na-ekwu na ọ bụ ihe niile Peter na-eti Osinachi kpataara ya ọrịa nke mechara gbuo ya.

Ka ọ dị ugbua, gọọmentị Naịjirịa anwụchiela Peter Nwachukwu ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo igbu ọchụ.

Lee foto etu akwamozu ahụ si gaa taa

Osinachi Nwachukwu Burial

Ebe foto si, Obasi John

Nkọwa foto, Ụgbọala e ji buru ozu Osinachi
Osinachi Nwachukwu Burial
Nkọwa foto, Ihe ngosi ụzọ maka ndị na-aga akwamozu Osinachi
Osinachi Nwachukwu Burial

Ebe foto si, Obasi John

Nkọwa foto, Ndị bu ozu Osinachi aga n'ili
Osinachi Nwachukwu Burial

Ebe foto si, Obasi John

Nkọwa foto, Ndị bu ozu Osinachi aga n'ili
Osinachi Nwachukwu Burial

Ebe foto si, Obasi John

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-akwanyere Osinachi Nwachukwu ugwu ikpeazụ n'ime ụlọ
Osinachi Nwachukwu Burial
Nkọwa foto, Ebe a ga-anọ kwanyere Osinachi Nwachukwu ugwu ikpeazụ

Ebe ikpe di Osinachi, Peter Nwachukwu, kwụ ugbua

Peter Nwachukwu Facebook Page

Ebe foto si, Peter Nwachukwu Facebook Page

Gọọmentị Naịjiria amalitela ikpe Peter Nwachukwu ikpe dịka ha sị na ọ kpachapụrụ anya gbuo ọchụ nke Bekee kpọrọ 'culpable homicide'.

Gọọmentị Naijiria wepụtara ya bụ ebubo dị iri abụọ na atọ (23) n'isi Peter Nwachukwu, sị na mmadụ ịkpachapụ anya gbuo mmadụ ibe ya bụ arụ megidere "section 221" nke iwu igbu mmadụ na Naịjiria, wee kwuo na ntaramahụhụ dịrị onye ahụ bụ ọnwụ.

Aha onyonyo, A nọ m n'anyammiri ụbọchị Osinachi na di ya gbara akwụkwọ - Ejima Osinachi Nwachukwu

Ikpe ahụ bu akara, CR/199/2022 bụ nke onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka iwakpo mmadụ na iti mmadụ ihe (Head, Sexual and Gender-Based Violence) na Mịnịstrị nke Ikpenkwụmọtọ (Ministry of Justice) bụ Nwaada Yewande Gbola-Awopetun, wegara n'ụlọikpe etiti dị n'Abuja, n'ụbọchị 20 nke ọnwa Mee afọ 2022.

Osinachi gbara afọ iri anọ na abụọ (42) bụ onye isi ọgụ egwu n'ụlọụka Dunamis International dị n'Abuja tupu o zute ọnwụ ya.

Ndị uweojii kpaara di Osinachi aka dịka ndị otu ya bụ nwaanyị nwụrụ anwụ boro Peter ebubo na aka ya dị n'ọnwụ nwunye ya bụ onye ha sị na ọ na-akụ ihe tinka kụrụ pan otu o siri masị ya kwa mgbe kwa mgbe.

Gịnị gburu Osinachi Nwachukwu?

Aha onyonyo, Osinachi Nwachukwu: 'Di Osinachi enweghị m bịara nwa m ọmụgwụ ọbụla' - Mrs Madu

Akụkọ mbụ pụtaranụ kwuru na ọ bụ ọrịa kansa akpịrị gburu Osinachi Nwachukwu mana ndị ma Osinachi ọfụma mechara kwuwe n'elu soshal midia na di ya na-emekpa ya ahụ kamgbe.

Ndị a ma ama dịka ọgụ egwu ụka akpọrọ Frank Edwards kwuputara na ọ bụ site na mmekpa ahụ di Osinachi nyere ya, butere ọnwụ ya.

Ezinụlọ Osinachi pụtakwara ma kwuo udiri agwa ọjọ Peter Nwachukwu kpasoro ha mgbe nwanne ha dị ndụ.

Ebubo ndị a bụ ihe mere ka ndị uweojii Naịjirịa ga-anwụchie di Osinachi bụ Peter Nwachukwu ma na-enyocha ya.

Gọọmenti Naịjirịa ṅụrụ iyi site n'ọnụ minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Tallen Pauline na ha ga-enwetere Osinachi ikpe ziri ezi.