Anyị na-akatọ oku ntọhapụ Nnamdi Kanu – Otu ndị Ugwu Naịjịrịa (CNG)

Ebe foto si, Reuters
Otu jịkọrọ ndị mpaghara Ugwu Naịjirịa a na-akpọ Coalition of Northern Groups (CNG) ezipụtala ozi na-akatọ oku ụfọdụ na-akpọ ka atọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).
Oku ndị a na-ada na nso nso a dịka ndị darala n’oge gara aga na-arịọ gọọmentị etiti ha atọhapụ Nnamdi Kanu ọkachasị na-esighị n’ụzọ ikpe.
Nke a na-abịa dịka gọvanọ na-achị Anambra Steetị bụ Chukwuma Soludo kwuru na ọ ga-anabata Nnamdi Kanu n'obi ọchịchị ya ma ọ bụrụ ma a tọhapụ ya.
O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ banyere oku ọ kpọrọ ka Onyeisiala Muhammadu Buhari tọhapụ Kanu na Channels TV n'ụbọchị Tọzde 19 Jenụwarị 2023.
Ọnụ na-ekwuru otu CNG bụ Abdul-Azeez Suleiman kwuru ka gọọmentị etiti ghara ịnabata oku ndị n’ihi ha ga-ehibe ụkpụrụ ọjọọ nwereike imebi ihe na Naịjirịa.
Suleiman katọkwara oku ndị okenya otu Ohaneze ndigbo bụ ‘Council of Elders of Ohanaeze Ndigbo, Worldwide’ kpọrọ na nso nso a nke na-arịọ gọọmentị etiti ka atọhapụ Kanu.
Suleiman kwuru:
“Ndị isi Igbo ka ha nwechara ọgbakọ n'Abuja kwuru na ha na-akwado ime ọgbakọ udo ebe ha ga-akpa maka ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nakwa atụmatụ ntọhapụ Nnamdi Kanu.”
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Iji saa ma okwu Gọvanọ Soludo nakwa oku a ndị okenya Ohaneze ndigbo kwuru, o kwuru:
“Anyị kwenyesiriike na oku ndị a na-adapụtasiike ugbua site n’ọnụ ndị ọchịchị Igbo so n’otu ime ụzọ atụmatụ ha iji hụ na nkwewapụ akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa mezuru. Echiche a adị adị ugbua, a pụghịkwa izere ya ma ọ bụ bugharịa ya ọzọ dịka ọ ga e nweriri mpụtara dị egwu.”
Ọ gakwara n’ihu kwuo:
“Ọ bụghị agwa gosiri nkwado ọdịmma ala anyị dịka ọ bụkwa echieche gosiri enweghị ezi uche ipụta n’ihu ọha na-ekwu okwu ịkpuchite Ipob na ndị ọzọ na-akapata tigbuo zọgbuo maọbụ nkewa bụ ndị burula ya n’isi imezu ihe ndị nna ha malitere na 1966 bụ okwu imezu echiche nnwere onwe mba Biafra site n’ụzọ aka ike nakwa iyi ndụ egwu.”
Gọvanọ Chukwuma Soludo asabeghi okwu a mana bido na malite ọchịchị ya, o zoghi echiche ya banyere okwu Nnamdi Kanu.
Cheta na ọnwa abụọ ka ọchịchi ya malitere na ọ gara hụ Kanu n’ụlọ mkpọrọ DSS.
Nke mere n’ụbọchị Fraide, abalị 13 nke Ọnwa Mee 2022.
Ka ọ si njem ahụ lọta, o zipụtara ozi ma kwuo na ya na Kanu kpara maka etu a ga-esi weta udo na nchekwa tọọrọ atọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Soludo kwuru na Kanu gosiri obi mwute ya n'ụdị gbuo gbuo gbuo, ntọ na mpụ niile na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa nke otu dị iche iche na-eme ma na-ebo ndị otu Ipob.
O kwuru na Kanu kwere nkwa na ya nwetahala ohere ịgbasa ozi nye ndị na-eso ya, na ya ga-agwa ha okwu banyere nke a.
Ozi ya kwuru:
"Kanu kwere nkwa na ọ nwetahala ohere, na ọ ga-adị ya obi mma igbasa ozi ya ndị na eso ya ka ha chọọ udo."
"Anyị jikọọ aka ọnụ, anyị ga-eweghachi udo, nchekwa na ọganihu na Anambra nakwa Ọwụwa Anyanwụ."
N'oge gara aga, ọtụtụ ndị ọchịchị Igbo nakwa ndị okenye Igbo akpọkwa oku ka atọhapụ Kanu. Ụfọdụ n'ime ha mere njem ga hụ Onyeisiala Buhari n'obi ya maka okwu a n'afọ 2021.

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
Ihe gọvanọ Chukwu Soludo kwuru maka nabata Nnamdi Kanu n’obi ya
N’ozi nke otu CNG sara, Gọvanọ Soludo kwuru:
“Ana m akpoku Gọọmentị Etiti ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu n'ihi na ọ dị anyị mkpa ka o sonye n'ọgbakọ ịkpa maka nsogbu nchekwa e nwere n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa."
"Tọhapụrụ m Nnamdi Kanu, ekwetara m ịgba akaebe nye ya ịkpọta ya ụbọchị ọbụla a chọrọ ya."

Gịnị jịkọrọ Nnamdi Kanu n’okwu nchekwa Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa?
Kemgbe afọ ole m ole, nsogbu enweghị ezi nchekwa bịara selite isi ya n’akụkụ Ọwụwa anyanwụ Naijriịa. Otu ndị ojiegbe ndị iche iche pụtara na atọ ndị mmadụ, awakpo ndị mmadụ ọkachasị ndị ọrụ nchekwa ma na-awakpo ma na-agbakwa ụlọ gọọmentị dị iche iche ọkụ.
Ọnọdụ a malitere na-akawanye njọ kemgbe ebe afọ 2021. Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'Indigenous People of Biafra' nakwa ndị ọrụ nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN) nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a nakwa ntọrọ ndị a.
Gọọmentị Naịjirịa kemgbe afọ 2017 akpọpụtala aha ma na-ahụkwa otu Ipob dịka otu a machiri amachi.
Mana iji saa okwu ndị a, Ipob ekwuola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.
Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ ngalanba ndị uweojii pụrụiche bụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ya na Kenya na-afọ 2021 ma kpọlata ya Naịjirịa.
E boro Kanu ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu nakwa onye na-achọ ịkwatu ọchịchịonye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.










