"Anọ m na-ekiri ka idemmiri buuru ezinaụlọ m na-enweghi ihe m pụrụ ime"

Ebe foto si, Gift Ufuoma
- Onye dere ya, Azeezat Olaoluwa
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Mokwa Town
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Ndụ Adamu Yusuf gbanwere kamgbe ezinaụlọ ya mmadụ itoolu nwụrụ n'obodo Tiffin Maza, so n'otu n'ime obodo abụọ ebe idemmiri kachasị njọ mere na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.
Nwamadị a dị afọ 36 nwere otu nwa kwuru na nwunye ya na nwa ha mụrụ ọhụrụ so na ndị idemmiri a buuru n'isiụtụtụ ụbọchị Tọzde na Niger Steeti.
"Ọ bụ m kpọtere n'ụra mgbe idemmiri ahụ malitere, emere m ngwa ngwa kpọkọta ezinaụlọ m ọnụ ma gwaa onye ọbụla jide ibe ya aka. Dịka anyị pụrụ n'ezi, anyị hụrụ ka mmiri tojuru ebe niile n'ime ụlọ anyị nakwa mbaraezi. Ụjọ baara ha ahụ ma anyị ekesaa."
Nwunye ya na nwa ya ahụ ka si obodo Mokwa lọta n'ụbọchị gara aga, dịka ha gara na nke ndị ọgọ ya nọọ izuụka ole ma ole kamgbe ọ mụchara nwa.
"Anọ m na-ekiri ka idemmiri buuru ezinaụlọ m na-enweghi ihe m pụrụ ime. Afọrọ m ndụ maka na m ma ka e si egwu mmiri," ka Maazị Adamu kwuru.
Ndị ndu obodo kwuru na ndị nwụrụla n'idemmiri akarịala narị abụọ (200) n'ụbọchị Sọnde, ọnụọgụgụ gbagoterela karịa otu narị na iri (110) nwụrụla n'ụbọchị Fraịde. Ụjọ dị na ọnụọgụgụ ndị a nwereike ịrịkwu elu.

Ebe foto si, Gift Ufuoma
Ọnọdụ ndị mmafụ n'obodo Tiffin Maza n'ụbọchị Satọde ahụ bụ nke iru uju, mgbagwoju anya na ndị ihe funahụrụ.
Uwe ndị mmadụ ghasachara ebe niile, akwa ndina ha bụrụ ihe jupụtara na mmiri, mgbamgba nchekwa elu bụ ihe fọrọ n'ọtụtụ ụlọ ndị idemmiri a mebiri.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Naanị ihe n'elu aka ebe Maazị Adamu gozuru bụ ihe nwereike igosi na ọ bụ ebe ahụ ka ụlọ ya dịbu tupu idemmiri ahụ abịa.
"Ihe niile m nwere efuola n'idemmiri. Mana nke kachasị ewute m bụ ezinaụlọ m. Naanị ihe m nwere ugbua bụ uwe a m yi n'ahụ bụ nke ọyị m nwoke nyere m."
O kwuru na a hụla ozu otu n'ime ndị ezinaụlọ ya ma sị na "o kwetela na ndị agaghị adị ndụ".
Nwata akwụkwọ ọzọ dị afọ iri na itoolu na-ebe akwa arịrị kamgbe ọ nụrụ na onye nkuzi ya na ụmụ ya asatọ nọ n'ime ụlọ ha oge idemmiri buuru ụlọ ahụ.
"Ahụla ozu mmadụ abụọ; otu n'ime ha bụ obere nwa ya. Onye nkuzi m, nwa ya nke abụọ na ụmụ nne ya ndị ọzọ ka na-efu efu. Ụlọ dakwasịrị ma gbuo nwunye ya, onye nọ n'ezi mgbe ihe a mere."
Otu onye ọzo bụ Maazị Muhammed nwekwara ndị ezinaụlọ ya nwụrụ anwụ. O chetere nwanne nna ya nwụrụ n'ọdachi ahụ.
Mmiri ahụ gbaturu ala na Satọde dịka ndị bi ebe ahụ gbakọtara iti ndị o metụtara aka n'obi ma nye aka chọọ ndị ka na-efu efu.
Ụfọdụ gwara BBC na ogogo mmiri ahụ ruru fiit asaa (7ft) n'ụfọdụ obodo ha.
E nwere ushi ọjọọ na gburu gburu obodo Tiffin Maza, ndị bi ebe ahụ kwenyere na ọ bụ ozu ndị mmadụ tọọrọ n'ime ala aja ụrọ nke idemmiri ahụ sapụtara.
Ha na-agba mbọ ịchọpụta ozu ndị ahụ ma lie ha n'ụzọ ziri ezi ka e si lie ndị ọzọ kamgbe ụbọchị Tọzde.
Ahụtụbeghi m ụdịrị idemmiri a na ndụ m, mana obi jupụtara m n'ọṅụ na ezinaụlọ gbanahụrụ ya," otu nwaanyị dị afọ 65 bụ Ramat Sulaiman kwuru..
Ụlọ nwaanyị a mebisiri n'idemmiri ahụ, nke mere na ezinaụlọ enweghizi ebe obibi.

Ebe foto si, Gift Ufuoma
O kwuru na ụmụaka otu narị (100) na-ehi n'ụlọakwụkwọ Koran dị nso n'ụlọ ya "ka idemmiri buchaara ha niile".
"Ọ bụ ihe mwute nye m. Ụmụaka ndị a bere akwa enyemaka, mana o nweghi onye pụrụ ihe ọbụla. Dịka mkpu akwa na-ala elu, ụlọ ha miri ala ma soro idemmiri."
Nwa yan woke bụ Saliu Sulaiman kwuru na obi agbawaala ya na o nweghizi ụlọ obibi.
"Ego m ruru $1,500 furu n'idemmiri a. Ọ bụ ego m nwetere n'ire akụrụngwa ọrụ ugbo m. Achọburụ ịlaghachị n'ime ụlọ wete ego a mana ebube idemmiri ahụ dị ukwuu," ka o kwuru.
"Akpa ahụekere m iri na otu na akpa akwa asaa m fukwara n'idemmiri ahụ. O nweghi ihe ọbụla mụ na nwunye wepụtara n'ụlọ anyị. Ozu ndị mmadụ jupụtara na mmiri ahụ."
O kwuru na ọ na-arọ nrọ ọjọọ kamgbe ahụ.
"Enwere m nkụda mmụọ".

Ebe foto si, Gift Ufuoma
Ndị ọrụ gọọmentị ekwubeghi ma ọdọmmiri dam gbawara nke butere idemmiri dịka ọtụtu akụkọ si ekwu.
Onyeisi mpaghara Mokwa bụ Alhaji Muhammadu Shaba Aliyu gwara BBC na e nwere ọdọmmiri dị ha nso nke nwereike ịsụpụta mmiri mgbe ọbụla mmiri zoro, ma kwuo na idemmiri ahụ karịrị akarị.
Ndị bi n'obodo gwara BBC na kwetere na ọ bụghi nnukwu mmiri ozuzo butere idemmiri ahụ
"Mmiri ozuzo agaghị ebutenwu idemmiri ahụ maka na o belatala aka, onweghi mmiri nọ ebe ọbụla. Anọ m n'ezi, n'otu ntabi anya ahụrụ m ka mmiri si na-asọpụta n'ike n'ike ma na-emebi ihe ọbụla nọ n'ụzọ ya," ka Maazị Muhammed kwuru.
Nwada Sulaiman kwuru: "Etetere m ka m kpee ekpere, mepee ụzọ mana ahụghị m mmiri ọbụla mana oge na-adịghị anya ka m bidoro na-anụ mkpu ndị mmadụ. Anyị amaghị ebe mmiri ahụ si. Ebe o si bụ ihe mgbagwoju anya.
"Ndị kwuru na ọ bụ mmiri ozuzo butere idemmiri ahụ na-atụ asị. Mmiri ozuzo akwụsịla tupu idemmiri ahụ abịa. Onweghi onye maara ihe butere idemmiri ahụ, o si na Chineke," ka Maazị Adamu kwuru.
Osote onyeisioche okpuruọchịchị Mokwa bụ Musa Alhaji Aliyu Kimboku kwukwara na ọ bụghị mmiri ozuzo butere idemmiri ahụ.
Ụlọọrụ gbata gbata bụ 'National Emergency Management Agency' kwuru na ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ma kwuo na e kesaala ihe enyemaka nye ndị na-enweghi ebe obibi e dugara n'ogige enyemaka ugbua.
Ụlọọru na-ahụ maka ihuelu igwe tọrọ arọ na mmiri ozuzo ga-ezo ụbọchị narị abụọ (200) na mpaghara Naịjirịa ahụ n'afọ a ma kwuo na ọ ga-anọte aka na mpaghara Ndịda.
Na mbido ọnwa Mee, gọọmentị etiti mere ka ndị mmadụ mata maka idemmiri ma kuziere ndị mmadụ ihe banyere ya.
A tụrụ anya na idemmiri a ga-emetụta steeti iri atọ na isii dị na Naịjirịa nke Niger steeti so n'ime ha.
Dịka ndị obodo a na-achịkọta onwe ha ọnụ site na mkpa mkpa idemmiri a bịakwutere ha, ọtụtụ ndị dịka Maazị Adamu kwuru na ọ gaghị echefu ihe a mere ezinaụlọ ya na-agbanyeghi na ọ nabatala ya.









