Etu nsogbu iweta ego dọla ga-esi metụta gị na azụmahịa gị

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ego dọla dị ụkọ ugbua na Naịjirịa, ụfọdụ ụlọakụ amalitela itinye mmachị ka ndị mmadụ ghara iji ọbaego Naịra ha zụta ihe maọbụ mee azụmahịa ọbụla nke metụtara ego dọla.
Cheta na e nwegbuola mgbe gọọmentị Naịjirịa tinyere iwu na naanị ego dọla iri abụọ ($20) ka ndị mmadụ ga-enweike iji zụọ ahịa n’ọbaego Naịra ha n’otu ọnwa.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Dịka a na-atụ anya na e nwereike inwe mmachị ndị ọzọ nyiri nke a, kedụ ka iwu ndị a ga-esị metụta gị?
Iji dọla kwụọ ụgwọ n’ịntanetị agaghịzị adị mfe: Ụfọdụ ihe obere ego nke ndị mmadụ na-ejibu ọnụego dọla iri abụọ azụta n’ịntanetị agaghịzị abụ ihe ga-ekwe omume. Dịka iwu ndị ọzọ kpachịrị iji dọla zụọ ahịa na-amụbanwanye, ndị ahịa na-atụbata ibu ga-enwezi nsogbu n’azụmahịa ha n’ihi ọtụtụ ihe ha na-ere na Naịjịrịa na-esi mba ofesi abata. Nke a gụnyekwara ndị na-eji ego ịntanetị nke a na-akpọ ‘Cyrptocurrency’ azụ ahịa.

Ebe foto si, AFP
Ime njem gaa ofesi:Dịka ọtụtụ ndị bi na Naịjirịa na-apụ maka njem nlereanya, agụmakwụkwọ, ịmalaite ọrụ na mba ofesi maọbụ ọpụpụ n’ihi na ha achọghịzị ibi na Naịjirịa, ime njem gaa mba ofesi nwereike ịkwụsịtụ. Otu nwaamadị na-arụ ọrụ n’ụlọakụ ukwu Naịjirịa na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na nke a bụ n’ihi ọtụtụ ụlọọrụ ụgbọelụ na-arụ ọrụ na Naịjirịa bụ nke mba ofesi – Nke a pụtara na ha na-ezipụ ego dọla mana n’ihi iwu ndị ụlọakụ ukwu Naịjirịa tinyerela, ime nke a adịghịzị mfe. Na nso nso a, minista na-ahụ maka njem ụgbọelu Naịjirịa bụ Hadi Sirika kwuru na ndị ọrụ ụgbọelu ọbụla e jidere na-ana ndị njem ego dọla ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha.
Agụmakwụkwọ: Ụmụafọ Naịjirịa na-aga mba ofesi aghara aghara maka agụmakwụkwọ ha ọkachasị dịka otu ndị nkuzi mahadum bụ Asuu na-eme abụbụọrụ kemgbe. Iwu mmachị iji ego dọla zụọ ahịa na Naịjirịa nwereike imetụta ụmụakwụkwọ na-achọ izipụ ego ụgwọ akwụkwọ ha dịka nke a agaghịzị adị mfe, nke a so n’ihe onye otu nwoke ọzọ aha ya bụ Amara na-arụbu n’ụlọakụ Naịjriịa kọwara BBC Igbo.
Ụgwọ Naịjirịa ji mba ndị ọzọ: Naịjirịa ebirila ọtụtụ ego n’aka mba ndị ọzọ na nso nso a n’ihi ndakpo akụnụba ha, nke a sokwa akwanye ọkụ na nsogbu ego dọla Naịjria na-enwe. Gọọmentị na-ekwu na ha na-eji ego ndị a arụ ọrụ mmepe obodo.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndị na-akpata nsogbu iji dọla zụọ ahịa na Naịjirịa
Nwaamadị ahụ na-arụ n’ụlọakụ ukwu Naịjirịa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwukwara na ọ bụ ọtụtụ ihe jịkọrọ aka ọnụ na-akpata nsogbu ndị a.
Ọnụego mmanụ agbịdị n’ụwa: Dịka agha Russia na Ukraine ka na-aga n’ihu, mba Russia so na mba kacha emepụta mmanụ agbịdị n’ụwa danyere n’ọnọdụ mere ka mmepụta nakwa ọnụego mmanụ agbịdị ha ria elu. Nke a pụtara na mmepụta mmanụ agbịdị ha anaghịzị ezu obodo ndị chọrọ ịzụ ya. Nke a mekwara ka ọnụ ego mmanụ agbịdị rielu. Dịka nwaamadị ahụ siri kwuo, Naịjirịa na-emepụta mmanụ agbịdị na-eresi ndị mba ofesi. Ego dọla bụ ego Naịjirịa ji azụ ahịa na ihe ọbụla metụtara mba ofesi ndị ọzọ. Ihe ọbụla metụtara dọla na-emetụta azụmahịa nakwa akụnụba Naịjirịa.
Nsogbu Naịjịrịa na-enwe na mmepụta mmanụ agbịdị: Dịka nwaamadị ọkaibe n’ihe gbasara ego siri kwuo, Naịjirịa na-eresi ndị mba ọzọ mmanụ agbịdị n’ọnụego dọla. Izu ohi mmanụ agbịdị na-emetụta mmanụ agbịdị Naịjịrịa na-emepụta. Chetakwa na Naịjịrịa enweghị ụlọọrụ ebe a na-agbanwe mmanụ agbịdị nke Bekee na-akpọ ‘Refinery’, nke sokwa na-enye Naịjirịa nsogbu na mmepụta mmanụ agbịdị bara ụba.

Ebe foto si, Getty Images
Nchepụta ụzọ ndị ọzọ eji emepụta ọkụ latrịk na mmanụ ụgbọala: Ọtụtụ mba ụwa anaghịzị iji mmanụ agbịdị emepụta ọkụ latrịk ha nwezịrị ụzọ ndị ọzọ nke a na-akpọ 'alternative energy' na Bekee. Nke a gụnyere: ‘wind energy’, 'solar energy' ‘nuclear power plants’ ‘green energy’ wdgz.
Na nchịkọta, Naịjirịa enweghịzị ọtụtụ ego dọla etu ọdịbụ na mbụ ọkachasị n’ọbaego ha nke a na-akpọ ‘Foreign reserve’ n Bekee. Nke a mere gọọmentị ji emepụta iwu dị iche iche nakwa ụzọ ndị aga eji mee ka ọnụego dọla ga-eji daa n’ebe Naịra nọ.









