Lee ụfọdụ ọrịa mbọ aka gị na-agbara gị ama tupu o bido

Ebe foto si, WEBMD.COM
Ịkpachapụrụ mbọaka gị anya abụghị naanị ịkpa mbọ maọbụ ite ya uri 'nail polish'.
Ọ dị mkpa ịgbado anya mara mgbe ụcha mbọaka gị gbanwere, maka na nke a nwereike ịbụ ihe ịgba ama maka ọnọdụ ahụike gị.
Ọtụtụ ọrịa mmadụ na-arịa na-ebu ụzọ gosipụta onwe ya na mgbanwe ụcha mbọaka, mana ọ bụrụ na onye ahụ achọpụtaghị nke a n'oge, mmiri ncha abaa ya anya.

Ebe foto si, Iwaria
Mbọaka na-acha edo edo

Ebe foto si, Getty Images
"Mgbe mbọaka mmadụ chawara edo edo, nke a nwereike ịbụ ihe ngosi na ọbara kọrọ onye ahụ n'ahụ, nke bekee na-akpọ 'anemia'."
Onye kwuru nke a bụ Juliana Pickett, bụ ọkammụta n'ahụike akpụkpọahụ.
Pickett kwuru na ihe na-akpata nke a bụ "mgbe 'iron' kọrọ mmadụ n'ahụ".
Ihe ndị ọzọ nwereike ime ka mbọaka mmadụ chaa edo edo bụ nka maọbụkwa ọnọdụ mburupụtaụwa.
N'aka nke ọzọ mbọaka edoedo nwere ike ịbụ ngosipụta ọrịa akịrị, ọrịa taịrọịd, ọrịa shuga nakwa ọrịa mmịnwụ HIV.
Mbọaka nwere ntụpọ ọcha

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụrụ na mmadụ hụ kịrịkịrị ntụpọ ọcha ka ọ pụtara na mbọaka ya, nke a nwereike ịbụ maka ọnọdụ dị icheiche.
Otu n'ime ha bụ ọnọdụ a na-akpọ 'Leukonychia' nke na-eme ka kpọmkpọm maọbụ akara ọcha pụta na mbọaka mmadụ.
Ọnọdụ a bụ Leukonychia abụghị nke ọjọọ chaa chaa, mana o nwereike ịbụ ihe nrụtụ aka maka ọnọdụ ahụike ndị ọzọ.
Ọ bụzi nnyocha n'ụlọọgwụ ga-akọwa kpọmkwem ihe kpara ya.
Ọnọdụ akpụkpọ ahụ dịka 'atopic dermatitis' na 'psoriasis' nwekwara ike ime ka ntụpọ ọcha pụta na mbọaka mmadụ.
Mbọaka na-acha anụnụ

Ebe foto si, webmd.com
Ihe na-akpatakarị ụdị nke a abụghị ọrịa kpọmkwem, kama ọ bụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ nwereike ịkpata ya.
Ụdị ọgwụ na-akpatakarị ya bụ ụfọdụ ọgwụ e ji agwọ ọrịa ịba, pịmpụl, maọbụ otuto toro na mbọ aka.
Dọkịta akpụkpọ ahụ bụ Wilaria Zanilla kwuru na mgbe ọgwụ mmadụ na-aṅụ malitere ịgbanwe ụcha mbọaka ya, onye ahụ kwesịrị ịlaghachi n'ụlọọgwụ ka dọkịta ya kpebie ma ọ ga-akwụsị ịṅụ ọgwụ ahụ.
Ihe ọzọ nwereike ime ka mbọaka chaa anụnụ anụnụ bụ ọnọdụ ahụike a na-akpọ 'Cyanosis'.
Cyanosis bụ mgbe ikuku ndụ dị n'ọbara mmadụ ezughị oke dịka o kwesịrị.
Mbọaka na-acha mmeemmee

Ebe foto si, Getty Images
Mbọaka ịcha mmeemmee nwereike ịbụ ihe ngosipụta maka ụfọdụ ọrịa dịka lupus maọbụ arthritis.
Mgbe ụfọdụ ọ na-abụkwa ihe nje vaịrọs, fungaị maọbụ baktiria butere.
Akara ojii ịpụta na mbọ

Ebe foto si, Iwaria
Oge ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịhụ akara ojii kara ogologo na mbọaka ya, bekee na-akpọ nke a 'beavis lines' maọbụ 'melanonychia'.
Ọtụtụ oge, ọ na-abụ mburupụta ụwa. Ndị ojii si mpaghara Afrịka na-aka enwekarị ụdị ihe a.
Ihe na-akpata nke a nwere ike ịbụ oke ahụ ọkụ maọbụ onye gabigara ọgwụgwọ a na-akpọ 'chemotherapy'.
Oge ụfọdụ, akara ojii ahụ nwereike ịpụta ma ihe kụọ mmadụ na mbọ aka, maọbụ mmadụ sọọ aka ya n'ihe.
Mana ọ bụrụ na akara a dị ojii nke ukwuu ma pụtakwa naanị n'otu mbọaka, o nwereike ịbụ ihe ngosipụta maka ọrịa 'melanoma' nke bụ kansa akpụkpọ ahụ.
Mbọ na-etoba n'ime anụ ahụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ nje 'fungi' na-akpata ọnọdụ mbọ itobanye n'ime anụahụ mmadụ.
Onye nwere ọnọdụ dị otu a kwesịrị ị na-anata ọgwụgwọ kwa ọnwa isii ọbụla.
Ọ bụrụ na mbọaka ka ọ na-eme ya, onye ahụ kwesịrị ị na-aga ụlọọgwụ kwa ọnwa anọ ọbụla.
Nke a bụ maka na ya bụ ọnọdụ nwereike ịmalite ọzọ ma ọ bụrụ na onye ahụ kwụsị ịnata ọgwụgwọ.
Ịta mbọaka

Ebe foto si, webmd.com
Ịta mbọaka gị n'ọnụ abụghị ọrịa, mana ọ bụrụ na ọ marala mmadụ ahụ nke ukwuu, onye ahụ kwesịrị ịga hụ dọkịta.
Nke a nwereike ịbụ ihe nrụtụaka na onye ahụ nwereike inwe ọnọdụ a kpọrọ 'obsessive-compulsive disorder'.
Mgbe ụfọdụ kwa, ndị mmadụ na-ata mbọaka ha n'ihi ụjọ maọbụ obi mmapụ.

N'ikpeazụ, ọ dị mkpa ịmata na ọ bụghị oge niile ka mgbanwe ụcha mbọaka na-egosipụta otu ọrịa maọbụ nke ọzọ.
Ọtụtụ mgbanwe mbọaka bụ ọnọdụ dịịrị onwe ya, ọ dịghị mkpa ka mmadụ tụwa egwu.
Mana ọ bụrụ na ị na-atụ uche gbasara mgbanwe ụcha mbọaka gị, gaa hụ dọkịta gị.









