Pulmonary fibrosis, Vitiligo, Alopecia na ọrịa ndị ọzọ bụ ọ gbara Igbo gharịị

Alopdecia, Pulmonary Fibrosis na Vitiligo

Ebe foto si, BBC/Getty

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Enwere ọrịa dị iche uche na-arịa mmadụ, ọtụtụ ha na-edo anya dịka e nwere ọtụtụ ndị mmadụ na-arịa ya nke merela ka e nwee nchọpụta niji ghọta ha nakwa ụzọ ọgwụgwụ ha.

Mana e nwere ọrịa ndị bụ ọgbara Igbo gharịị n'ihi na ọ na-atụwanye atụnwanye nke mere ka ọtụtụ na-aghọtahie ha maọbụ na-asọ ndị ọ na-arịa asọ.

Ọrịa ndị ahụ gụnyere Pulmonary fribosis, vitiligo alopecia, haemophila dgz.

1. Pulmonary fibrosis

Igwe e ji eku ume

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ ọrịa na-emetụta ngụ site ime ya ka ọ taa ọnya ma nwekwaa apa ọnya, nke na-eme ka ngụ onye ahụ ghara ị na-arụ ọrụ ka o kwesịrị.

Njirimara: Njirimara ọrịa a gụnyere ikuli ume elu, ụkwara ọkpọnkụ, ike ọgwụgwụ, ịta ahụ, nakwa ahụ mgbu.

Ihe nwere ike ibute ya: Otu 'American Lung Asssociation' kọwara na ịnọ ebe ihe mmekpa ahụ dịka 'asbestọs' nsị nnụnụ maọbụ nsị anụmanụ ndị ọzọ maọbụ ịṅụ sịga nwere ike ịkpalite ọrịa ngụ a.

Ọgwụgwụ: Dịka ndị ụlọọgwụ Mayo Clinic sị kọwaa na websaịtị ha, a naghị agwọ ọrịa 'pulmonary fibrosis' agwọ kama a na-eleta onye ọ na-arịa.

Iji maa atụ, a na-enye onye ume na-ara ahụ n'ihi ọrịa ahụ igwe nkuume ma na-agbakwa ya ọgwụ 'antịbiotics iji belata nsogbu ndị so ọrịa ahụ.

2. Vitiligo

ONwoke nwere Vitiligo

Ebe foto si, Getty Images

Vitiligo bụ ọnọdụ ahụike na-emetụta anụ ahụ mmadụ n'ihi enweghi mmiri ahụ dị mkpa a kpọrọ 'melani' na Bekee.

Ọrịa a anaghị ahụ onye ọ na-eme kwa daa, emela ụfọdụ ndị ama ama dịka Michael Jackson bụ ọnọdụ anaghị ahụ.

Njirimara: Ọnọdụ ahụike a na-eme anụahụ mmadụ chagharịa na-emetụtakarị ọnụ, anya, mkpịsịaka, apata, abụ ime ọnụ maọbụ mbada ahụ onye na-arịa ya.

Ụdị vitilgo ole enwere

Otu na-agbasa ozi maka ọrịa a bụ 'Vitiligo Society' sị na ọ dị ụzọ atọ;

1. Nke na-eme otu ebe n'ahụ mmadụ, 2. Nke na-eme n'ọkara ahụ mmadụ 3. Nke na-emekaarị n'ahụ nile

Okwu sie ike...

Ọtụtụ mgbe, o nweghị mmekpa ahụ ọbụla vitiligo na-eme onye nwere ya.

Mana o nwere ike ibutere gị anya mgbu maọbụ nsogbu anụchaghị ihe ọfụma.

O nwere ike ime mmadụ ọ gaghị enwezi nkwenye na onwe ya.

Ihe ọzọ dị mkpa bụ na ihe ruru mmadụ pasentị 15 rue pasentị 25 nwere nsogbu vitiligo nwekwara ike inwe nsogbu ọrịa ime ahụ dịka ọrịa shụga, rheumatoid arthritis, ụkọ ọbara (perniiiuos anaenia).

Ọgwụgwọ: A naghị agwọ Vitiligoio agwọ kama o nwere ude dọkịta nwere ike inye gị iji gbajilata nchagha ahụ ahụ.

3. Alopecia

Onye nanwere nsogbu alopecia

Ọnọdụ a ma dịka Alopecia areata: bụ nsogbu na-eme ka ntutu ghara ịto mmadụ n'ahụ n'ebe niile a ha-ahụ ntutu dịka isi, ahụ, mpempe anya nakwa na agba.

Haemophila

Ọbara

Ebe foto si, Getty Images

Haemophila bụ ọrịa ọbara nke na-ame ọbara ịkwụsị ịgba mmadụ ma o merụọ ahụ maọbụ a waa ya ahụ.

Ihe na-ebute ọnọdụ a na-emekaarị ụmụnwoke na-esi n'ezinaụlọ.

Njirimara: Ihe ndị e ji ama onye nwere nsogbu a gụnyere; ezuimi (nosebleeds), ọbara ịdị na mammịrị ma ọbụ na nsị, ịgbabiga ọbara oke ma ị gbaa ọgwụ, nakwa ahụ mmadụ ịta nuukwu ọnya.

Okwu sie ike

Mayo Clinic kwuru na ọ bụrụ na mmadụ nwere 'haemophilia nke ọjọọ ya kupuo isi ya, na ọbara nwereike ịbanye n'ime ụbụrụ ya nke nwereike butere ya oke isi ọwụwa, ahụchaghị ụzọ ọfụma, ike ọgwụgwụ, ihe ọdịdọ.