Ihe mere m ji akụzi maka ahụike na soshal midia - Doctor Aproko

Aha onyonyo, Aproko Doctor: "Obi na-adị m ụtọ ịnụ akụkọ etu ihe m na-eme si agbanwe ndụ ndị mmadụ"

Chinoso Egemba e ji 'Aproko Doctor' maara akọwaala ihe etu o si banye n'ọrụ ịkpa iji soshal midia na ịkpaọchị akụziri ndị mmadụ maka ahụike ha.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ sị na ọ bụ onye dọkịnta Bekee na otu ihe dị ya mkpa nke ukwuu bụ ahụike ndị mmadụ.

Egemba sị na otu onyinye o nwere bụ iji ụzọ dị mfe akọwara ndị mmadụ ihe mgbagwoju anya dị n'ahụike ha.

Ọ sị na njem a malitere mgbe ọ nọ n'ụlọakwụkwọ, na otu nwoke nwere ọrịa mkpọnwụ ahụ a kpọrọ 'transient stroke' bịakwutere ha.

Na ha kọwaara nwoke ahụ ihe ọ ga-eme banyere ọrịa a mana o nwoke a mechara nwụọ ka izuụka abụọ gachara.

Na ọ bịara na-ajụ onwe ya "kedụ ihe mere nwoke a jiri nwụọ etu?" Dịka ọ na-eme nke a na ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ihe ọbụla banyere ahụike ha, ụfọdụ anaghị aghọta ihe dọkịnta na-ekwu.

Ọ sị na ọ bụ maka inyere ndị mmadụ aka mere o jiri kpebie iji soshal midia agbaso ozi ikuziri ndị mmadụ ihe banyere ahụike.

Kirie ihe o kwuru n'uju

Aproko Doctor

Ebe foto si, Aproko Doctor