King Charles Coronation: 'Eze ị ga-adị o!' E kpunyela Eze Charles III okpu Eze

Eze Charles III

Ebe foto si, PA Media

Ihe emebeghị kamgbe afọ 70 na mba England emeela. Eze Charles III ekpurula okpueze.

Okpueze a pụrụ iche a na-akpọ Okpueze St Edward dịwara narị kwuru narị afọ gara aga. Naanị taa ka eze ga-ekpu okpueze a tupu e bughachi ya na Tower nke London.

Ogologo ya dị 30cm ebe ọnụọgụgụ okwute pụrụ iche na ọla e ji achọ mma dị na ya dị 444, nke gụnyere sapphires, rubies, amethysts na topaz.

Onye ikpeazụ kpuru okpueze a bụ nne ya, Ezenwaanyị Elizabeth II, afo 70 gara aga.

Igwe ndị mmadụ nọ n'ụlọụka ebe emume a na-aga n'ihu kwuru sị: "Chukwu chebe onye eze! Eze ị ga-adị ogologo ndụ! Eze ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighiebi!"

Ọkpara eze bụ William bịakwara gbuo ikpere n'ihu nna ya ma kwe ya nkwa nkwado na irube isi.

Ka nke a mechara, e kpunyekwara Ezenwaanyị Camilla okpueze nke ya 'Queen Mary's Crown'.

Nwaeze Harry lara nanị ya ka ọ bịachara emume ichi eze nna ya

Nwaeze Harry

Ebe foto si, Getty Images

' Duke nke Sussex' bụ Harry bịara mmemme ochichi eze nna ya mana ọnọ nazụ az nwanne ya nwoke na Westminster Abbey.

Harry akpọghị nwunye ya bụ Meghan bụ onye nọ Amerịka bịa.

Ọ bakwara ụgbọelu laa ngwangwa e mechara n'ọdọụgbọelu'Heathrow'.

Etu ndị ezinaụlọ eze si nọrọ n'ụlọụka oge emume ahụ

E mere ka BBC mata na akpọghị ya bịa soro nihu ụlọelu ha dị n'obieze Buckingham Palace ka e mechara emume ikpunye okpua na-ahụ ya na ezinaụlọ ya n'ọha kemgbve o jiri dechaa akwụkwọ a kpọrọ "Spare".

Foto emume ichieze Eze Charles III

Eze Charles III na nwunye ya Ezenwaanyí Camilla
Nkọwa foto, Eze Charles III na nwunye ya, Ezenwaanyí Camilla
Eze Charles III

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eze Charles III
Ezenwaanyị Camilla

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oge e kpunyere Ezenwaanyị Camilla Okpueze
Ezenwaanyí Camilla

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyí Camilla
Okpueze Eze Charles III na nke Ezenwaanyị Camlilla

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Okpueze Eze Charles III na nke Ezenwaanyị Camlilla
Egbe a gbara iji kwanyere Eze Charles III ugwu

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Mgbapụ egbe mkpọnala iji kwanyere Eze Charles III ugwu

Eze Charles na nwunye ya erutela Westminster Abbey, emume ichieze amalitela

Eze Charles na nwunye ya

Ebe foto si, PA Media

Emume ichieze nke Eze Charles III amalitela ugbua n'ụlọụka Westminster Abbey dịka Eze na Ugoeze ya bataruru.

Ihe mbụ Eze kwuru bụ, "Abịara m, ọbụghị ka a gbaara m odibo, kama ka m bụrụ odibo."

Onye ụkọchukwu nọ n'isi emume ahụ bụ Achbishọp nke Canterbury kwuru sị: "Ana m egosipụtara ụnụ ugbua, Eze Charles, eze ụnụ na-enweghị mgbagha ọbụla..." ndị mmadụ ekwuo sị "Chukwu zọpụta onye eze!"

Eze Charles agawala ụlọụka Westminster Abbey ebe ndị ọbịa gbakọrọ maka emume ichieze nke taa

Ezecharles

Ebe foto si, Reuters

Eze Charles na Camilla, bụ nwunye eze, awụchiela n'obieze Buckingham ebe ha ga-esi malite njem gawa ụlọụka Westminster Abbey maka emume ichie eze.

Ọnụụzọ ụlọụka ahụ emepekwaala maka ọtụtụ ndị ọbịa pụrụ iche ga-eso gbaa akaebe na ya bụ emume.

Ndị 'House of Lords'

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ndị 'House of Lords'

Ndị otu ụlọ omeiwukwu a kpọrọ House of Lords - ọnụọgụgụ ha ruru 20 - bu ụzọ wuchie n'ụlọụka ahụ.

Ndị ọbịa ndị ọzọ jikwa nwayọ nwayọ na-abata dịka emume ahụ ga-amalite kpọmkwem n'lekere 11 nke ụtụtụ.

King Charles Coronation: Lee etu emume ichi eze nke Eze Charles III si aga

Eze Charles III na nwunye ya bụ Camilla

Nde kwuru nde ndị mmadụ si akụkụ mba ụwa niile ga-esonye n'emume ikpunye okpu eze nke eze Charles III.

Nke a bụ nnukwu emume nke ga-adị na Westminster Abbey taa bụ Satọde, ụbọchị isii nke ọnwa Mee 2023, dịka a ga-ekpube Eze Charles na oriakụ ya bụ Camilla, Ezenwaanyị, okpu eze.

Nke a bụ emume ichi eze nke iri anọ n'ọchịchị eze nke mba England kamgbe afọ 1066, ma bụrụkwa emume ichieze nke mbụ na mba England n'ime afọ 70 gara aga.

Taa ka a ga-ahụ emume ọdịnala dị icheiche bụ nke a malitere ime kamgbe ihe karịrị afọ otu puku gara aga.

Ndị ọbịa ga-anọ n'ime ebe a ga-ekpube Eze okpu bụ mmadụ 2,300, nke gụnyere ndị isi ala mba 100. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ga-esokwa nọrọ ebe ahụ.

Emume a ga-amalite kpọmkwem n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ma dịgide ruo ihe dịka awa abụọ.

Otu n'ime ihe ga-aka pụta ihe n'emume ichi eze a ga-abụ mgbe Eze Charles ga-ekpe ekpere nke mbụ ya dịka ọ na-erute nso n'Abbey, oge ọ ga-asị: "Abịara m, ọbụghị ka a gbaara m odibo, kama ka m bụrụ odibo."

E mechaa emume a, Eze na Camilla ga-ahapụ Westminster Abbey laghachi n'obieze Buckingham Palace.

Ndịọrụ nchekwa ruru 11,500 ga-anọ n'ọrụ na mpaghara dị icheiche n'ihi emume a

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ndịọrụ nchekwa ruru 11,500 ga-anọ n'ọrụ na mpaghara dị icheiche na Londond taa n'ihi emume a

Ndị ọrụ nchekwa karịrị 5000 esila mpaghara dị icheiche bata na n'ọdọ ụgbọ oloko Waterloo nke dị na London, ha ga-esi ebe ahụ zọrọ ije gafee akwa mmiri Westminster.

Puku kwuru puku ndị mmadụ agbakọọla n'okporoụzọ ebe Eze Charles na Ugoeze Camilla ga-esi gafee, n'agbanyeghị na nnyocha ihu eligwe gosiri na mmiri ga-ezo taa.

Otu n'ime ndị a bụ nwata nwoke dị afọ iri aha ya bụ Hudson, onye hụrụ emume dị icheiche n'obie eze England n'ime afọ olemole gara aga, dịka agbamakwụkwọ Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan, emume afọ 70 Ezenwaanyị Elizabeth II nọrọ n'ocheeze, nakwa emume nkwanye ugwu ikpeazụ nke Ezenwaanyị Elizabeth II.

"Obi m bụ sọ aṅụrị maka emume taa," Hudson gwara BBC. "Obi dị m ụtọ na m ga-ahụ eze oge ọ ga-eji ụgbọala ọlaedo ya pụrụ iche gafee, nakwa ụgbọelu dị icheiche."

Ụgbọala ọlaedo pụrụ iche a ga-eji buru eze na nwunye ya laghachi n'obieze Buckingham

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ụgbọala ọlaedo pụrụ iche a ga-eji buru eze na nwunye ya laghachi n'obieze Buckingham

Charles bụụrụ Eze nke United Kingdom na mpaghara 14 ndị ọzọ n'ọnwa Sepụtember 2022, oge nne ya bụ Elizabeth nwụrụ dịka ọ nọchara afọ 70 n'oche eze.

O ruola ọtụtụ ọnwa kamgbe a malitere nkwado maka emume ichieze nke a, ga-abụ nke ugboro 40 a ga-eme na Westminster Abbey kamgbe 1066.

Achbishọp nke Canterbury bụ Justin Welby ga-anọ n'isi ofufe nru a, ebe ndị ọbịa ndị ọzọ dịka nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Jill Biden na onyeisiala Emmanuel Macron nke mba France ga-esonye.

Oge kachasị n'emume a ga-abụ oge a ga-ekpukwasa Okpueze nke St Edward n'isi Eze Charles, nke bụ oge mgbịrịmgba niile dị n'ụlọụka ahụ ga-ebido kụwa, ebe ndị agha nọ nso n'akụkụ ga-agbapụ otu ọnụ egbe na nkwanye ugwu.

A ga-ekpukwasakwa Camilla okpu - nke ga-emezi ka a malite ịkpọ ya "Ezenwaanyị Camilla".

Otu na-akpọ oku ka a kwụsị usoro ọchịchị eze na mba England

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Otu 'Republic' na-akpọ oku ka a kwụsị usoro ọchịchị eze na mba England

N'agbanyeghị ọtụtụ ndị na-enwe aṅụrị maka emume ichieze a, enwekwara ụfọdụ ndị na-eme ngagharịiwe ma na-akpọ oku ka a kwụsị usoro ọchịchị Eze na mba England.

Otu a na-akpọ 'Republic', bụ ndị na-ekwusi okwu ike ka akwụsị usoro ọchịchị Eze, amalitela ịgbakọ n'ọgbọ Trafalgar Square, iji kwụpụta obi ha.

Ndị otu a na-ekwu na ha nwere ikike ime ngagharịiwe mana ndị uweojii adọọla aka na ntị na ha agaghị ekwe ka ihe ọbụla kụsaa emume ichie eze a.

Ihe ruru ndị ọrụ nchekwa 11,5000 ga-anọ n'ọrụ taa iji hụ n'emume a gara nke ọma.