Ihe BBC chọpụtara gbasara ụmụaka bu ọrịa kansa e gwuru chandum n'ego a tụkọtara iji gwọọ ha ọrịa

Aha onyonyo, Ụmụaka bu ọrịa kansa e gwuru chandum n'ego a tụkọtara iji gwọọ ha
    • Onye dere ya, Simi Jolaoso
    • Onye dere ya, Jack Goodman
    • Onye dere ya, Sarah Buckley
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Eye Investigations
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 11

Ịdọaka na ntị: Ozi a na-enye nsogbu n'ahụ

Khalil, obere nwata nwoke mba Filipin, yi uwe na-acha ndụ ndụ nwere akara, a kpọrọ ya isi nkwọcha na igwe okwu dị n'ahụ ya. Ihe onyonyo chere ya n'ihu ebe ọ nọ n'ihu ụlọọgwụ.

Ebe foto si, Chance Letivka

O bere nwata nwoke nọ n'ihu ihe onyonyo. Ọ na-acha ntụtụ ma o nweghi ntụtụ n'isi ya.

"Adị m afọ asaa, enwere m ọrịa kansa," ka o kwuru. "Biko zọpụta ndụ ma nyere m aka."

Khalil - Onye foto ya nọ ebe a - achọghị ka esete ya n'onyonyo dịka nne ya bụ Aljin si kwuo. A gwara ya ka ọ kpụọ ya ntụtụ isi, ma sete ebe ndị ọrụ tinyere ya 'drip' adịgboroja, ma gwa ezinaụlọ ya ka ha mee ka ọ bụ ụbọhị ncheta ọmụmu ya. Ha nyere akwụkwọ ka ọ mụọ ma gụpụta ya na Bekee.

Ma ọ masịghị ya, ka Aljin kwuru, e dosara alịbasa e beriri eberi na ihe okpomọkụ 'menthol' e tinyere n'okpuru anya ya, ka o nwee ike ibe akwa.

Aljin nabatara nke ahụ na-agbanyeghi na ọ bụ ihe adịgboroja mana Khalil nwere ọrịa kansa n'ezie. A gwara ya n'ihe onyonyo ahụ ga-enye aka ka a tụkọọ ego maka ọgwụgwọ dị mma. A tụtara ego dị $27,000 (£20,204), dịka ihe ndekọ mgbasaozi a hụrụ n'aha Khalil si kwuo.

Mana a gwara Aljin na mgbasaozi ahụ kụrụ afọ n'ala, o kwuru na ọ nataghị ego ọbụla, naanị narị dọla asaa ($700) a kwụrụ ya maka ihe onyonyo n'ụbọchị ahụ. Khalil mechara nwụọ ka otu afọ gachara.

Na mbaụwa niile, ndị nne na nna ụmụaka na-arịa ọrịa nọ n'ọnụ ọnwụ ka a na-egwukaarị chandum site na mgbasaozi enyemaka n'ịntanetị dịka BBC World Service si chọpụta. Ndị ọha atụkọtala maka mgbasaozi a nke a sị bụ ịtụego maka ọgwụgwọ ịzọndụ. Anyị achọpụtala ezinaụlọ 15 bụ kwuru na onweghi ego ọbụla site n'ego ndị tụkọtara na mgbasaozi ahụ ma kwuo na ha amaghị na e bipụtala ihe onyonyo ya na-agbanyeghi ahụhụ ha tara n'ego a na-ese ya.

Ezinaụlọ itoolu anyị gwara okwu - bụ ndị e gwuru chandum n'otu ụzọ ahụ - kwuru na onweghi ego ọbụla ha nwetere n'ego dị nde dọla anọ ($4m) a tụkọtara n'aha ha.

Onye ọgba ama si n'ụlọọrụ ndị na-egwu chandum a gwara anyị na ha na-achọ "ụmụaka maara mma" dị afọ atọ ruo afọ itoolu"...na-ebughi ntụtụ".

Anyị achọpụtala otu onye so na ndị na-egwu chandum a dịka nwafọ mba Izrel bi na Kanada a kpọrọ Erez Hadari.

Nnyocha anyị malitere n'ọnwa Ọktoba 2023, mgbe otu mgbasaozi e mere na YouTube kpọtara uche anyị. "Achọghị m ịnwụ," otu nwata nwaanyị a kpọrọ Alexandra si na mba Gana na-ebe akwa. "Ọgwụgwọ m na-efu nnukwu ego."

Ego a tukọtaara ya site na mgbasaozi ahụ ruru $700,000 (£523,797).

Anyị hụrụ ihe onyonyo ụmụaka ọzọ na-arịa ọrịa si na mbaụwa na YouTube, ha niile yiri ibe ya - a rụpụtara ha ọfụma, ma ha ritere nnukwu ego. Ha niile gosiri ihe dị oke ngwa ngwa, ma jiri asụsụ na-enwe mwute.

Anyị kpebiri ime nnyocha banyere nke a. Anyị ji akụrụngwa 'geolocation, soshal midia nakwa ihe e ji achọpụta ihu mmadụ iji chọta ezinaụlọ ndị bicha n'ebe dị anya dịka Kolombia na Filipin.

Mgbasaozi ntụkọta ego e mere n'aha Ana - gosiri ka ọ na-ebe akwa, yiri ihe e ji eku ume n'ime, ihe e dere n'elu akwụkwọ ahụ kwuru "ọnwa abụọ iji bie ndụ"

Ebe foto si, Chance Letikva

Nkọwa foto, Mgbasaozi nke Chance Letikva mere n'aha Ana na Kolombia - Nke ha tụrụ asị na o nwere naanị ọnwa abụọ ka ọ nwụọ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ raara ahụ ịmata ma ego ole e nwetere site n'ọbaozi websaịtị ahụ ọ bụ eziokwu, anyị tinyere obere ego n'ọbaego abụọ ndị ahụ, ego dị n'ime ha gbagoro elu n'ọnụego ole ahụ anyị tinyere.

Otu onye anyị gwara okwu, sị na o nyere ego $180 n'ọbaego mgbasaozi Alexandra, ma nwete ozi na-asị ka o tinyekwuo, nke dịka ọ bụ Alexandra na nna ya dere ya.

Na mba Filipin, Aljin gwara anyị na nwa ya nwoke Khalil dara n'ute ọrịa ka ọ gbachara afọ asaa.

"Mgbe anyị chọpụtara na ọ bụ kansa, ọ dị ka a ga-asị na ụwa m agwụla," ka o kwuru

Aljin kwuru na ọgwụgwụ ha na-anatala n'otu ụlọọgwụ dị na Cebu na-adọla aka elekere azị, o zigaarala onye ọbụla ọ maara ozi maka enyemaka. Otu onye mere ka ọ mata otu nwoke ji ego achụntaego a kpọrọ Rhoie-Yncierto - onye sị ka e nye ihe onyonyo Khalil nke Aljin chọpụtara na ọ bụ maka ịtụ mgbere.

Otu nwoke ọzọ si Kanada bịa na Disemba 2022 kpọrọ onwe ya "Erez". Ọ kwụrụ ya ụgwọ ise ihe onyonyo, ma kwee ngwa ịkwụ ya $1,500 n'ime otu ọnwa ma ọ bụrụ na ihe onyonyo ahụ mụta ego n'aka ndị mmadụ.

Erez tuziri aka etu e si see Khalil ihe onyonyo n'otu ụlọọgwụ, - o were awa iri na abụọ iji see ya, Aljin kwuru.

Esere ese kọwara etu e si mee ihe onyonyo Khalil.

Ka ọtụtụ ọnwa gachara, ezinaụlọ a kwuru na ha anatabeghi ozi etu ihe onyonyo ahụ si mee. Aljin zigaara Erez ozi, onye gwara ya na ihe onyonyo ahụ "emeghi ọfụma".

"Dịka m si ghọta, ihe onyonyo amụtaghị ego ọbụla," ka o kwuru.

Mana anyị gwara ya na ndị mgbasaozi a naara ego dị $27,000 n'ọnwa Nọvemba afọ 2024, na na-aga n'ihu na-ana ego.

"Ọ bụrụ na m maara na a tụtara ego, a gaara m eche na Khalil ka gaara adị ndụ," Aljin kwuru. "Aghọtaghị m ihe ha ga-eji eme anyị ihe a."

Mgbe a jụrụ Rhoie Yncierto ihe ọ maara banyere ihe onyonyo ahụ, ọ gọrọ na ọ gwaghị ezinaụlọ ndị a kpụọ ụmụ ha isi ma sị na o nweghi ego o nwetere site n'ikpokọta ha ọnụ

O kwuru na o nweghi ikike n'etu ego ahụ si gaa, ma sị na ya na ezinaụlọ ndị a enweghi mmekọ ka e sechara ihe onyonyo ahụ. Mgbe anyị gwara ya na ha anataghị ego ọbụla, ọ sị na "o juru ya anya" ma sị na "ọmịiko ezinaụlọ ahụ na-eme ya."

Onweghi onye na-aza Erez aha ya dị n'akwụkwọ ụlọọrụ Chance Letikva. Mana ụlọọrụ ya abụọ anyị nyochara ka ụlọọrụ ọzọ a kpọrọ Walls of Hope, nke e debara aha ya n'Izrel nakwa Kanada na-akwado. Aha onyeisi nke Kanada bụ Erez Hadari.

Foto ya nọ n'ịntanetị gosiri mgbe ọ nọ n'emume ndị okpukperechi Juu na Filipin, New York na Miami. Anyị gosiri ya Aljin, ọ sị na ọ bụ otu onye ahụ o zutere.

Anyị jụrụ Hadari maka ihe onyonyo mgbasaozi ahụ na Filipin. Ọ zaghị

Anyị zutere ezinaụlọ ndị ọzọ aka Hadari dị na mgbasaozi ntụkọta ego ha - n'otu obodo dị na mba Kolombia na ọzọ dị na Yukren.

Dịka o si dị na nke Khalil, ndị obodo bịara ozi enyemaka. E sere ụmụaka ndị a foto mee ka ha bee akwa adịgboroja ka a kwụọ ha ụgwọ, mana ha na-ataghị ego ọzọ ọbụla.

Na Sucre dị na ugwu Kolombia, Sergio Care kwuru na ọ jụrụ ịnabata enyemaka ahụ na mbụ. Otu a kpọrọ Isabel bịakwutere ya, sị ka o nyere aka n'okwu ego maka nwa ya nwaanyị dị afọ asatọ a kpọrọ Ana, bụ onye nwere ọrịa ụbụrụ isi 'tumour'.

Isabel chọtara ya n'ụlọọgwụ ebe a na-agwọ Ana, ya na otu nwoke ọzọ sị na ọ bụ onye ọrụ otu ụlọọrụ enyemaka.

Nkọwa Sergio nyere banyere nwoke ahụ gosiri na ọ bụ Erez Hadari - ha kọtakwara ya na foto anyị gosiri ya.

"O nyere m olileanya...E nweghi m ego maka ọdịnihu."

Edemede e nyere Ana

Ihe ndị a chọrọ n'aka ezinaụlọ ahụ agwụghị n'ise onyonyoo.

Isabel gara n'ihu na-akpọ n'ekwentị, na-achọ ka e nyekwuo ya foto Ana mgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ. Oge Sergio na-azaghị, Isabel malitere izigara Ana ozi ekwentị n'onwe ya, nke anyị nụrụla ụfọdụ n'ime ha.

Ana gwara Isabel na ya enweghịzi foro ọzọ ọ ga-eziga. Isabel zara ya sị: "Nke a dị ezigbo njọ Ana, ezigbo njo n'ezie."

N'ọnwa Jenụwarị afọ a, Ana bụ onye gbakerela ugbua gbara mbọ ịchọpụta ihe mere ego e kwere ya na nkwa.

"Ụlọọrụ enyemaka ahụ efuola," ka Isabel gwara ya n'ozi ekwentị nke o ji olu ya zite. "E zigaghị onyonyoo gị. Chaachaa. O nweghị ihe e ji ya mee, ị nụla?"

Mana anyị nwereike ịhụ na ezipụla onyonyoo ahụ, ma n'ọnwa Eprel 2024, gosiri na ọ kpatala ihe ruru $250,000 (£187,070).

 Ana na nna ya nọ n'otu obodo na Kolombịa
Nkọwa foto, Ana na nna ya nọ n'otu obodo na Kolombịa

N'ọnwa Ọktoba, anyị manyere Isabel Hernandez ka ọ gwa anyị okwu n'onyonyoo.

Enyi ya si Izrel, ọ kọwara, akpọnyela ya onye kwere nkwa inye ya ọrụ "n'otu ụlọọrụ obi ebere" na-achọ inyere ụmụaka nwere ọrịa kansa aka. Ọ jụrụ ịkpọ aha onye ọ rụụrụ ọrụ.

A gwara ya na ọ bụ naanị otu mgbasaozi o nyere aka hazie ka e bipụtara, ka o kwuru, mana ọ gaghị nke ọma.

Anyị gosiri Isabel na e zipụla mgbasaozi abụọ, dịka otu n'ime ha kpatarala ihe karịrị $700,000 (£523,797).

"Ekwesịrị m ịrịọ [ndị ezinaụlọ] ha mgbaghara," ka o kwuru. "Ọ bụrụ na m maara ihe na-eme, agaghị m eme ihe dị etu a."

Na Yukren, anyị chọpụtara na onye gakwuuru nne nwata na-ejighị ahụ bụ onye e weere n'ọrụ ebe a nọọrọ see onyonyoo mgbasaozi ahụ.

Tetiana Khaliavka haziri ise onyonyoo nke nwata dị afọ ise aha ya bụ Viktoriia, onye nwere ọrịa kansa ụbụrụ, n'ụlọọgwụ Angelholm Clinic dị na Chernivtsi.

Otu ozi a gbasara na Facebook nke si na mgbasaozi Chance Letikva gosiri Viktoriia na nne ya bụ Olena Firsova ka ha nọ ọdụ n'elu akwa. "Ahụrụ m mbọ ị na-agba ịnapụta nwa m nwaanyị, dịka nke ahụ na-emetụ anyị n'ahụ. Ọ bụ ọsọ a na-agba megide oge iji kpata ego a chọrọ maka ọgwụgwọ Viktoriia," ka isiokwu ya kwuru.

Olena kwuru na ya edeghị ihe ọbụla maọbụ kwuo ihe ndị dị etu a, dịka ya amaghị na e zipụla mgbasaozi ahụ.

O gosiri na ọ kpatala ihe karịrị €280,000 (£244,000).

Tetiana, dịka a gwara anyị, bụ ya na-ahụ maka ịma ọkwa azụmaahịa na nzirịtaozi n'ụlọọrụ Angelholm.

Ụlọọgwụ ahụ gwara BBC na nso nso a na ọ kwadoghị ka e see onyonyoo na mbaraezi ya, ma gbakwunye na: "Ụlọọgwụ a enwebeghị mgbe ha sonyeere maọbụ kwado atụmatụ ịtụkọta ego ọbụla site n'aka otu ọbụla."

Angelholm kwuru na ya akagbuola ọrụ Tetiana Khaliavka.

Olena na nwa ya nwaanyị bụ Viktoriia, onye a chọpụtara nwere kansa ụbụrụ ọzọ na nso nso a
Nkọwa foto, Olena na nwa ya nwaanyị bụ Viktoriia, onye a chọpụtara nwere kansa ụbụrụ ọzọ na nso nso a

Olena gosiri anyị ọrụngo a gwara ya binye aka.

Na mgbakwunye nyere $1,500 (£1,122) a kwụrụ ezinaụlọ ahụ dịka ụgwọ ise onyonyoo n'ụbọchị ahụ, o kwuru na ha ga-enweta $8,000 (£5,986) ngwangwa ha nwetazuru ebumnobi ịkpata ego. Ego ole ọ ga-abụ bụnke a kpọghị aha.

Ọrụngo ahụ gosiri ebe dị na New York maka Chance Letikva. Na websaịtị ụlọọrụ ahụ, ọzọ dị ya, na Beit Shemesh, ihe dịka otu elekere site na Jerusalem. Anyị gara ebe abụọ ahụ, mana o nweghị ihe dịka ya anyị hụrụ.

Anyị chọpụtakwara na Chance Letikva dịka ọ bụ otu n'ime ụlọọrụ ndị ahụ.

Nwoke ahụ sere onyonyoo mgbasaozi Viktoriia gwara onye nhazi anyị, bụ mere ka aga-asị na ọ bụ enyi nwa na-ejighị ahụ, na ya na-arụrụ ụlọọrụ ndị ọzọ dị etu ahụ ọrụ.

"Oge ọbụla, ọ na-abụ nke dị iche," nwoke ahụ, onye kọwara onwe ya dịka "Oleh" gwara ya. "Ọ naghị amasị m ikwu ya etu a, mana ha na-arụ ọrụ dịka ndị nwere njikọ."

"Ihe dịka ụlọọrụ iri na abụọ ndị ọzọ dị etu ahụ" rịọrọ maka "ihe", ka o kwuru, ma kpọọ aha abụọ n'ime ha, Saint Teresa na Little Angels, ndị e debanyere aha ha n'Amerịka.

Oge anyị tulere akwụkwọ ndebanye aha ha, anyị chọpụtara aha Erez Hadari ọzọ.

Ihe na-edoghị anya bụ ebe ego ndị ha kpatara maka ụmụaka ahụ gara.

Ihe karịrị otu afọ e sechara Viktoriia onyonyoo, nne ya bụ Olena kpọrọ Oleh, onye ihe e ji mara ya n'ịntaneetị dịka ọ bụ Alex Kohen, iji chọpụta. N'ime obere oge, onye si na Chance Letikva kpọrọ iji kwuo na e jirila ego ndị a kpatara kwụọ ụgwọ maka ọkwa mgbasaozi, ka o kwuru.

Nke a bụkwa ihe Maazị Hadari gwara Aljin, nne Khalil, oge ọ pịasuru ya n'ekwentị.

"A na-akwụ ụgwọ maka mgbasaozi. N'ihi ya, ụlọọrụ a tụfuru ego," ka Maazị Hadari gwara ya, na-enyeghị ya ihe akaebe ọbụla iji kwado nke a.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọrụ obi ebere gwara anyị na mgbasaozi ekwesịghị ịkarị 20% nke ego niile a kpatara.

Onye e weburu n'ọrụ ịkpọta ụmụaka maka mgbasaozi Chance Letikva kọwara etu e si họrọ ndị pụtara.

A gwara ha gaa n'ụlọọgwụ ndị na-ahụ maka ọrịa kansa, ka ha sịrị, dịka o kwuru okwu na nzuzo.

"Ha na-achọkarị ụmụaka mara mma ma dị ọcha. Nwata ahụ kwesịrị ịnọ n'agbata afọ atọ na afọ itoolu. Ha kwesịrị ịma ka e si ekwu okwu nke ọma. Ha agaghị enwe ntutuisi," ka ha gwara anyị.

"Ha jụrụ m maka foto, iji hụ ma nwata ahụ o kwesịrị ekwesị, ma aga m ezigara ya Erez."

Onye kpughere nke a gwara anyị na Maazị Hadari ga-ezigara onyeọzọ foto ahụ n'Izrel, onye ọ kpọghị aha ya.

Gbasara Maazị Hadari n'onwe ya, anyị gbara mbọ izute ya n'ebe ndị ọ gwara anyị dị na Kanada mana anyị ahụghị ya. Ọ zaghachiri otu ozi anyị zigaara ya, nke jụrụ gbasara ego ndị ọ na-anakọta, site n'ikwu na ụlọọrụ ahụ "enwebeghị mgbe ha rụrụ ọrụ", na-ekwughị nke ọ bụ. Ọ zaghachighị ozi ndị ọzọ anyị zigaara ya tinyekwara leta ndị rụtụrụ aka n'ajụjụ nakwa ebubo anyị.

Aljin Erez Hadari zigaara nne Khalil foto onwe ya nke a

Ebe foto si, Erez Hadari

Nkọwa foto, Aljin Erez Hadari zigaara nne Khalil foto onwe ya nke a

Mgbasaozi ndị Chance Letikva haziri maka ụmụaka abụọ ndị nwụụ anwụ bụ Khalil na nwa Meziko a kpọrọ Hector ka yikwara ịnara ego.

Ngalaba ụlọọrụ Chance Letikva dị na mba Amerịka dịka o nwere ihe jikọtara ya na ụlọọrụ ọhụrụ a kpọrọ Saint Raphael, nke wepụtarala ọtụtụ mgbasaozi, opekatampe, abụọ ndị e sere n'ụlọọgwụ Angelholm clinic dị na Yukren.

Olena bụ nne Viktoriia kwuru na a chọpụtara na nwa ya nwaanyị nwere nsogbu ụbụrụ ọzọ. O kwuru na ihe ndị anyị chọpụtara agbawaala ya obi.

"Oge nwa gị...nọ n'agbata ndụ na ọnwụ, ma onye ọzọ e were ya na-akpa ego. N'eziokwu, nke ahụ jọgburu onwe ya. Ọ bụ ego ọgwụ."

BBC kpọtụụrụ Tetiana Khaliavka na Alex Kohen nakwa ụlọọrụ Chance Letikva, Walls of Hope, Saint Raphael, Little Angels na Saint Teresa, ma kpọọ ha oku ka ha saa ebubo ndị e boro ha. O nweghị nke ọbụla n'ime ha zaghachiri.

Ụlọọrụ Israeli Corporations Authority, nke na-elekọta ụlọọrụ abụghị nke gọọmenti na mba ahụ gwara anyị na ọ bụrụ na ha nwere ihe akaebe na ndị hiwere ụlọọrụ ndị ahụ ji ha "ekpuchi mpụ", na a pụrụ ịnapụ ha ikike na mba Izrel dịkwa ka a pụrụ igbochi onye hiwere ya ịrụ ọrụ na ngalaba ahụ.

Ndị nlekọta na mba UK bụ Charity Commission nyere ndị na-achọ inye ụlọọrụ obi ebe onyinye ndụmọdụ ka ha tulee ma otu ndị ahụ ha debanyere aha ha, ma hụkwa ha ha kpọtụụrụ ndị na-ahụ maka nnakọ ego, ma ọ bụrụ na o doghị ha anya.