Ihe i kwesịrị ịma maka Antimicrobial Resistance
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji, Makuochi Okafor na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist, Senior Journalist na Video Journalist
Antimicrobial Resistance bụ AMR n'ịchafụ Bekee bụ ihe iyi egwu nyere ahụike nke na-apụta ihe mgbe ụmụ nje dịka bacteria, virus, fungi na parasite nwogharịrị ọnọdụ ha iji nwee ike nagide ọgwụ ndị e ji egbu ha a na-akpọ 'antimicrobials'.
Antimicrobials bụ ọgwụ dị iche iche e ji agwọ ọrịa dị mmadụ na anụmanụ n'ahụ. Ọ bụrụ ma ọrịa enwogharịa ọnọdụ ya iji nagide ọgwụ ndị a, ọ na-eme ka ọ hịa ahụ ịgwọ ha ma meekwa ka ogogo ọrịa ji efesa rịa elu.
N'afọ 2019, AMR metụtara ihe ruru nde mmadụ ise (5m) ma gbuo opekatampe mmadụ otu nde na ụma iri abụọ na asaa (1.27) gburugburu ụwa.
Sepsis bụ ọnọdụ ọjọọ na-eme ka nchekwa ahụ mmadụ buo agha megide ọrịa karịa etu o kwesịrị. Ọnọdụ a nwere ike imetụta okenye na nwata.
N'afọ 2020, ụmụaka nde abụọ na ụma anọ (2.4m) a mụrụ ọhụrụ nwụrụ n'ime ọnwa mbụ a mụrụ ha n'ihi sepsis, ọtụtụ n'ime ha bụ na mpaghara ịkpa Afrịka.
Ọ bụ ọgwụ antibiotics ka e ji agwọ sepsis mana ka o sinadị, ha na-ebute AMR ọ bụrụ ma emetọọ ha.
A chọpụtala na Naịjirịa bụ otu n'ime mba ndị kachasị emetọ ọgwụ 'antibiotics' dịka nchọcha Gavi mere na nso nso a chọpụtara na otu ọgwụ e ji agwọ ọrịa pneumonia anaghịzi arụ ọrụ n'ahụ ọtụtụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ n'ihi mmetọ ọgwụ antibiotics.
Ihe ndị na-ebute Antimicrobial Resistance
Ọtụtụ oge, ihe ndị na-ebute AMR gụnyere:
- ịṅụ ọgwụ aghara aghara
- aṅụghị ọgwụ dịka Dọkịta siri nye nkwado
- aṅụzughị ọgwụ dịka o si kwesị
Ihe ndị a pụrụ ime iji gbochie Antimicrobial Resistance
- aṅụla ọgwụ ọbụla na-ebughị ụzọ nata nkwado Dọkịta
- ọ bụrụ na ahụ gị na-egosi ihe dị aṅaa, hapụ iji aka gị nye onwe gị ọgwụ ma gbara ọsọ gaa hụ Dọkịta
- hụ na ị ṅụrụ ọgwụ gị dịka Dọkịta siri nye ntụziaka
- kwụsị ikekọrịta ọgwụ
Kedụ ihe Gọọmenti Naịjirịa na-eme gbasara Antimicrobial Resistance?
Ụlọọrụ World Health Organisation bụ WHO n'ịchafụ Bekee kwuru na Naịjirịa amalitela ibu agha megide Anti-Microbial Resistance.
Nke a bụ site n'atụmatụ ha kpọrọ Second Action Plan on Antimicrobial Resistance (AMR 2.0).
Ha kwputara nke a n'Abụja n'ụbọchị 20 Ọktoba 2024.



