Ihe ị ga-eme iji gbanarị ọrịa Marburg Virus na-efe ugbua

Aha onyonyo, Ihe ị kwesiri ima maka ọrịa Marburg
Ihe ị ga-eme iji gbanarị ọrịa Marburg Virus na-efe ugbua
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist

Dịka ngalaba WHO si kwuo, Marburg bụ ọrịa na-emesi mmadụ ike.

Ọ na-emekwa ka onye bu ya gbaa oke ọbara ma nkwaa ịba.

Ha sị na nje na-akpata ya so n'otu ezinaụlọ nje na-ebute ọrịa Ebola.

Aha ya si n'otu obodo a kpọrọ 'Marburg' na mba Jamini bụ otu n'ime obodo abụọ gụnyere Frankfurt bụ ebe ọrịa ahụ fesiri ike n'afọ 1967.

Ha kwuru na a na-ebute ya site na mmiri ọbụla si mmadụ bu ọrịa ahụ n'ahụ pụta, ndị gụnyere ọsụsọ, asọ mmiri, ọbara na mmri ahụ mmadụ ndị ọzọ.

Njirimara ọrịa 'Marburg'

Ịba/ahụ ọkụ

Ịnyụ pịrị pịrị ọbara dị na ya

Ịgba ọbara n'igburu eze

Ịgba ọbara n'anụ ahụ

Ịgba ọbara n'anya

Ịnyụ mamịrị ọbara dị na ya

Kirie ihe onyonyo a n'uju ka ị mara etu ị ga-esi chekwaa onwe gị n'ebe ọrịa a nọ.