Mgbe ọbụla e mere ntuliaka, a na-emebisi ihe ndị Igbo - Ohaneze Ndigbo Osun steeti

Aha onyonyo, Mgbe ọbụla e mere ntuliaka, a na-emebisi ihe ndị Igbo - Ohaneze Ndigbo Osun steeti

"O mere n'afọ 2014, mee na 2018 nakwa mgbe e mere ntuliaka afọ 2015, ọ bụghị mbụ a na-eme ya" bụ ihe ndị ahịa n'Osogbo na-ekwu.

Ha na-akwa arịrị maka etu ndị agboro si kwasasịara ha ọdọahịa ebe ha na-akpọsa ahịa ha n'ebe akpọrọ 'Old Garage' n'Osogbo bụ isi obodo Osun steeti.

Ha kwukwara na ọ bụ n'ihi mmeri PDP meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde ka nke a ji mee.

"Ihe a ha mere adịghị anyị mma n'ihi na o nweghi ihe anyị onwe anyị zọrọ na ntuliaka a" bụ ihe ọzọ ha na-ekwu.

Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ, ha hụrụ ebe ụfọdụ n'ime ndị ahụ nọ n'anwụ na-arụzi ihe ndị agboro ahụ kwapịara.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Opalola Yemisi kwuru na ha anụbeghị maka ya bụ ihe mere ma kwuo na ha ga-amalite nnyocha banyere ya.

Mana ndị anyị jụrụ kwuru na ha agaala kpesa ihe mere n'aka ndị uweojii.

Ụlọahịa ndị akaturu

Kedụ etu ihe a siri bido?

E mere ntuliaka ọkwa Gọvanọ nke Ademola Adeleke otu PDP meriri dịka INEC si kpọpụta ya.

O teeghi aka nke a mechara, ihe onyonyo malitere ifesa ebe ndị Igbo e ji izụ ahịa mara na-ekwu na emebiri ihe ha n'Osogbo.

Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ndị agboro ahụ mere nke a bu n'uche na ọ bụ ndị Igbo tụnyeere PDP na ya bụ ntuliaka.

Onye ihe a metụtara gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ndị Igbo kpọbatara PDP n'ọkwa.

Nnyocha anyị gosikwara na ọ bụ naanị ọdọ ahịa nke ndị Igbo bụ ndị akwaturu n'ime ọdọ ahịa niile dị n'ebe akpọrọ 'Old Garage' dị n'Osogbo.

Nke a abụghị mbụ e ji ndị Igbo eme ndị a ga-ata ụta na ntuliaka maọbụ n'oge ọgbaghara.

Mgbe e mere ntuliaka afọ 2015 nakwa 2019, ndị agboro chụsasịrị ndị mmadụ ebe ha gara ime ntuliaka n'akụkụ ebe ndị Igbo kachasị bi dịka Surulere.

Ọzọ, mgbe ndị uweojii nwụchiri ndị gburu Deborah na Sokoto, emebisiri ngwa ahịa na ọdọ ahịa ndị Igbo dịka apụtara ime ngagharịiwe. Gọvanọ steeti ahụ mechara machie ngagharị n'ebe ahụ.