Ndị ojiegbe egbuola ndị 'civil defence' atọ n'Imo steeti n'ụbọchị Mọnde

Ebe foto si, Getty Images
Obi mmapụ na ụjọ ji ndị mmadụ bi n'obodo Obiangwu nke dị n'okpuru ọchịchị Ngor-Okpala n'Imo Steeti, n'ụtụtụ Mọnde a dịka ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ma gbuo ndị ọrụ nchekwa 'civil defence' atọ.
Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na mwakpo a mere n'isi ụtụtụ taa bụ Mọnde, ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa 'Nigeria Security and Civil Defence Corps' nọ n'ụgbọala ha oge ndị ojiegbe ahụ wakporo ha ma kwaa ha mgbọ.
"Ihe a mere na mpaghara ahịa Eke Isu n'obodo Obiangwu n'isi ụtụtụ Mọnde. Ozu ha ka dị ebe a nọrọ gbuo ha dịka m na-ekwu okwu a ugbua. Ndị agha ejupụtala n'obodo anyị ugbua na-ejide onye ntorobịa ọbụla ha hụrụ," ka nwa amadị ahụ kwuru.
Onyonyo etu e si gbuo ndị ọrụ nchekwa a efesaala na soshal mịdịa dị icheiche ugbua.
Mgbe BBC jụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, o kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu nakwa na ndị ọrụ nchekwa NSCDC atọ tufuru ndụ ha.
"Mana ndị ọrụ nchekwa agaala n'obodo ahụ ugbua iji mee ka udo lọghachi," Okoye kwuru.
O kwukwara na nnyocha amalitela, na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi zuru oke gbasara ya bụ mwakpo n'oge adịghị anya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mwakpo a na-abịa dịka akụkọ pụtakwara maka mwakpo ndị ojiegbe wakporo ndị uweojii na mpaghara Uwani n'Enugwu ma gbuo ndị uweojii abụọ n'ụbọchị Sọnde, Maachị 26.
Ụbọchị Mọnde na mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ ụbọchị ndị mmadụ ji anọ n'ụlọ n'ihi iwu nke ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere.
Ipob tinyere iwu a iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si nwuchie onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa ka e kpee ya ikpe.
Ọ bụ eziokwu na Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ndị ojiegbe na ka na-agakwa n'ihu na-awakpo ndị mmadụ pụtara ịga mkpa ha n'ụbọchị Mọnde ọbụla.
Kamgbe ahụ kwa ejidere Nnamdi Kanu, mwakpo na mmebi ụlọọrụ gọọmentị dị icheiche akala njọ. Mwakpo nakwa ogbugbu ndị ọrụ nchekwa abụrụkwala ihe a na-anụ kwa mgbe kwa mgbe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Mana Ipob na-agọ na ọ bụghị ha na-eme mwakpo ndị a, n'agbanyeghị nke, gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ Ipob, bụ ndị ha kpọrọ otu oyi egwu, na-akpa ike ọjọọ a.









