Afcon 2023: Kedụ mgbe asọmpi Iko Mba Afrịka ga-amalite?

Ebe foto si, BBC Sport
A mataka otu egwuregwu ndị ga-eso gbaa asọmpi a mana ị maara mgbe ọ ga-amalite nakwa etu ọ ga-esi metụta ndị ọgba bọọlụ na Premier League nakwa ndị ọzọ na mbaụwa?
N’ihe chụwara otu ọnwa n’ine Jenụwarị na Febụwari, ndị ọgba bọọlụ ụkwụ na-aghọ nkọ ga-achọ ịmabute iko a nke otu Confederation of African Football (CAF) na-ahazi kwa afọ abụọ.
Senegal bụ ndị ji iko a ga-akpọpụta ndị ọgba bọọlụ ha gụnyere Sadio Mane nke Al-Nassr na ọ bịara ọhụrụ bụ Nicolas Jackson nke Chelsea ebe Egypt bụ mba kachasị ibute iko ugboro asaa ga-akpọpụta onyendu ha bụ Mohamed Salah nke Liverpool.
Lee ihe i kwesịrị ịma maka asọmpi a, mgbe ọ ga-ebido na ndị ọgba bọọlụ ga-ahapụ otu egwuregwu ha n’ofesi.
Kedụ mgbe Afcon 2023 ga-amalite?
Asọmpi Afcon nke agba iri atọ na anọ (34th edition) ga-adị n’ụbọchị 13 Jenụwarị ruo 11 Febụwarị 2024.
Ọ ga-abụ ugboro abụọ mba Ivory Coast ga-ahazi asọmpi a, mgbe mbụ ha nabatara mba Afrịka ndị ọzọ bụ n’afọ 1984.
Na-agbanyeghi na ọ bụ n’afọ 2024 ka a ga-agba ya, mana ha e jiri maara ya bụ nke afọ 2023.
Asọmpi mbido ya ga-abụ n’etiti mba a na-ahazi ya e ji Enyi maara na mba ọzọ a ga-etinyere ha.
Otu egwuregwu ndị kachasị mee ọfụma n’agba nke mbụ ahụ ga-enwe ohere ịgafe n’agba mgbapụ, agba anọ nke ikpeazụ, agba abụọ nke ikpeazụ nakwa agba nke ikpeazụ kpọmkwem.
A ga-anọ n’ọgbọegwuregwu Alassane Ouattara dị n’Abidjan, isi obodo Ivory Coast gbaa asọmpi nke ikpeazụ n'ụbọchị 11 Febụwarị.

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe mere n’agba itozuoke?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nke a bụ ugboro atọ mba iri abụọ na anọ ga-eso gbaa asọmpi a kamgbe a gbanwere ya na 2019.
Na-agbanyeghi na Ivory Coast bụ mba na-ahazi ya mana ha so gbaa asọmpi itozuoke ebe ha so Zambia na-azụ gbaa ndị abụọ n’otu H. Mba iri abụọ ndị ọzọ sonyere ndị a dịka ha tozukwara oke.
Mba niile ga-esonye n’asọmpi a agbabuola n’otu n’ime ugboro abụọ a gbara asọmpi a ewepụ mba Zambia maburu iko n’afọ 2012 bụ ndị na-abịaghachị kamgbe afọ 2015 nakwa Mozambique bụ ndị na-abịa kamgbe afọ 2010.
Mba Central African Republic gaara ịbụ ndị na-abịa asọmpi a n’afọ mana ha mara afọ n’ala mgbe Ghana meriri n’asọmpi ikpe azụ.
Mba Gabon bụ ebe Pierre-Emerick Aubameyang bụ mba kachasị maa afọ n’ala n’etozughi oke, ha bịala asọmpi a ugboro atọ n’ime ugboro anọ.
Mgbe a ga-ahọrọ ndị ga-ezute ibe ha na etu e si eme ya?
A ga-ahọrọ mba ga-ezute ibe ha n’asọmpi Afcon n’Abidjan n’ụbọchị 12 Ọktoba n’elekere asatọ nke abalị. (1900 GMT).
Dịka etu Fifa siri hazie ya, aha mba iri abụọ na anọ ga-anọ n’ime ito anọ. Mba Ivory Coast bụ n’ogogo itoolu n’Afrịka mana e tinyere ha n’ite nke mbụ.
ITE MBỤ - Ivory Coast (*50), Morocco (13), Senegal (20), Tunisia (29), Algeria (34), Egypt (35)
ITE ABỤỌ - Naịjirịa (40), Kameruun (41), Mali (49), Burkina Faso (58), Ghana (60), DR Congo (64)
ITE ATỌ - Saụt Afrịka (65), Cape Verde (71), Guinea (81), Zambia (82), Equatorial Guinea (92), Mauritania (99)
ITE ANỌ - Guinea-Bissau (106), Mozambique (113), Namibia (114), Angola (117), The Gambia (118), Tanzania (122)
(*ogogo ha nọ na fifa)
A ga-ekewa otu egwuregwu ndị a n’ime otu isii nwere mmadụ anọ n’ime ha. Tupu e ahọpụta ndị a, a ha-adị mbụ mawapụta ebe ndị ha ga-anọ agba asọmpi a.
A ga-agba asọmpi ndị a n’ọgbọegwuregwu isii dị n’obodo ise;
- Ọgbọegwuregwu Alassane Ouattara, Abidjan (mmadụ 60,000)
- Ọgbọegwuregwu Felix Houphouet Boigny, Abidjan (mmadụ 33,000)
- Ọgbọegwuregwu Stade de la Paix, Bouake (mmadụ 40,000)
- Ọgbọegwuregwu Amadou Gon Coulibaly, Korhogo (mmadụ 20,000)
- Ọgbọegwuregwu Laurent Pokou, San Pedro (mmadụ 20,000)
- Ọgbọegwuregwu Charles Konan Banny, Yamoussoukro (mmadụ 20,000)
Otu caf na-akpọtọta ndị a ma ama n’Afrịka gbarala bọọlụ n’oge gara aga ka ha mee nhọpụta a.
Ị ga-atụ anya ịhụ ndị a ma ama n’Ivory Coast gụnyere Kolo na Yaya Toure, mmadụ abụọ ndị gbaara otu Enyi bọọlụ ma merie mba Ghana iji mabute iko a nke ugboro abụọ n’afọ 2015.

Ebe foto si, BBC Sport
Kedụ mgbe ndị na-agba bọọlụ na Premier agaghị anọ ya?
Nke a bụ ntuziaka na-aegosi asọmpi ndị na-agba bọọlụ na Premier League agaghi esonye na ya, ọkachasị ma mba ha na-eme ọfụ n’asọmpi Afcon.
Ezumike Winter: 15-28 Jenụwarị
Asọmpi ikpeazụ ha nwereike ịgba n’otu ha: Ngwụcha izuụka Jenụwarị 6/7 (agba atọ nke FA Cup)
Opekatampe asọmpi ha agaghị eso gbaa: Otu (Asọmpi Premier League)
Asọmpi kachasị ha agaghị eso gbaa: Asatọ (Premier League anọ, agba anọ nke FA Cup, ụkwụ abụọ na nke abụọ n’asọmpi semi-final nke Iko Carabao Cup, ụkwụ mbụ mke agba mgbapụ Champions League)
Mgbe ha nwereike ịlọghachị: 27 Jenụwarị (agbapụ n’agba mbụ), 4 Febụwarị (Agba mgbapụ) 11 Febụwarị (agba anọ nke ikpeazụ), 18 Febụwarị (agba abụọ nke ikpeazụ)

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ maka ndị Saụdi Arebia na ndị ọzọ?
Saudi Pro League
Ezumike Winter: 29 Disemba - 14 Febụwarị
Asọmpi ikpeazụ ha nwereike ịgba n’otu ha: 28 Disemba (Pro League)
Opekatampe asọmpi ha agaghị eso gbaa: O nweghi
Asọmpi kachasị ha agaghị eso gbaa: Atọ (Saudi Super Cup semi-finals and final, Asian Champions League last 16 first leg). N’ihi ezumike Winter, enweghi asọpmpi Pro League ndị ọgba bọọlụ agaghị eso gbaa.
Mgbe ha nwereike ịlọghachị: Asọmpi Saudi Super Cup na Jenụwrị (ọpụpụ n’agba nke mbụ), 17 Febụwarị (agba mgbapụ)
Spanish La Liga
Ezumike Winter: 22 Disemba - 1 Jenụwarị
Asọmpi ikpeazụ ha nwereike ịgba n’otu ha: Ngwụcha izuụka 6/7 ọnwa Jenụwarị (Copa del Rey agba 32)
Opekatampe asọmpi ha agaghị eso gbaa: Abụọ (La Liga)
Asọmpi kachasị ha agaghị eso gbaa: iri na otu (La Liga ise, Copa del Rey agba mgbapụ agba anọ nke ikpeazụ, ụkwụ mbụ agba abụọ nke ikpeazụ, agba abụọ nke ikpeazụ na agba ikpeazụ nke Supercopa de Espana, ụkụ mbụ nke agba mgbapụ Champions League)
Mgbe ha nwereike ịlọghachị: 27 Jenụwarị (ọpụpụ agba mbụ), 4 Febụwarị (agba mgbapụ), 7 Febụwarị (agba anọ nke ikpeazu), 17 Febụwarị (agba semi-finals na agba nke ikpeazụ)
Italian Serie A
Ezumike Winter: E nweghi
Asọmpi ikpeazụ ha nwereike ịgba n’otu ha: Ngwụcha izuụka 6/7 ọnwa Jenụwarị (Serie A)
Opekatampe asọmpi ha agaghị eso gbaa: Abụọ (Serie A)
Asọmpi kachasị ha agaghị eso gbaa: Iri na otu (Isii Serie A, Supercoppa Italiana agba semi-finals na agba ikpeazụ, Coppa Italia ndị ikpeazụ 16 nakwa agba quarter-finals, Champions League ndị ikpeazụ 16 <first leg>)
Mgbe ha nwereike ịlọghachị: 27 Jenụwarị (ọpụpụ agba mbụ), 4 Febụwarị (agba mgbapụ), 7 Febụwarị (agba anọ nke ikpeazu), 17 Febụwarị (agba semi-finals na agba nke ikpeazụ)

Ebe foto si, Getty Images
French Ligue 1
Ezumike Winter: 21 Disemba - 13 Jenụwarị
Asọmpi ikpeazụ ha nwereike ịgba n’otu ha: Ngwụcha izuụka nke 6/7 n'ọnwa Jenụwarị (Coupe de France last 32)
Opekatampe asọmpi ha agaghị eso gbaa: Abụọ (Ligue 1)
Asọmpi kachasị ha agaghị eso gbaa: Asaa (Ise Ligue 1, Coupe de France ndị ikpeazụ 32 na ndị ikpeazụ 16, Champions League ndị ikpeazụ 16 <first leg>)
Mgbe ha nwereike ịlọghachị: 27 Jenụwarị (ọpụpụ agba mbụ), 4 Febụwarị (agba mgbapụ), 7 Febụwarị (agba anọ nke ikpeazu), 17 Febụwarị (agba semi-finals na agba nke ikpeazụ)
German Bundesliga
Ezumike Winter: 18 Disemba - 11 Jenụwarị
Asọmpi ikpeazụ ha nwereike ịgba n’otu ha: Ngwụcha izuụka 16/17 n'ọnwa Disemba (Bundesliga)
Opekatampe asọmpi ha agaghị eso gbaa: Abụọ (Bundesliga)
Asọmpi kachasị ha agaghị eso gbaa: Asaa (Ise Bundesliga, DFB-Pokal agba quarter-finals, Champions League agba nke nkupu <last 16 first leg>)
Mgbe ha nwereike ịlọghachị: 27 Jenụwarị (ọpụpụ agba mbụ), 4 Febụwarị (agba mgbapụ), 7 Febụwarị (agba anọ nke ikpeazu), 17 Febụwarị (agba semi-finals na agba nke ikpeazụ)








