Senegal vs Algeria: Onye ga-amaburu Iko Afcon taa?

Ebe foto si, Getty Images
Mba Senegal na Algeria ga-ezute taa n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Kaịro di n'Ijipt n'asọmpi agbachaa ekuru nwa nke Africa Cup of Nations.
Mgbe Algeria rutere agba ikpeazu asọmpị a bụ afọ iri abụọ n'itoolu gara aga.
Amụbeghị ọtụtụ ndị sọ asọ mpị a mgbe ahụ.
Mgbe ahụ bụ afọ 1990 mgbe ha na Naịjirịa zutere na be ha.
Ha ji otu ọkpụ asataghị asata wee sị Naịjirịa ha were ọla ọcha kasie onwe ha obi.

Ebe foto si, Getty Images
O ruola afọ 17 kemgbe Senegal tụrụ ụkwụ na agba ikpeazụ Afcon. Nke a bụ n'afọ 2002.
Onye nkuzi ha ugbua bụ Aliou Cisse so na ndị sọrọ mpị mgbe ahụ Kameroon ji ọkpụ atọ asatara abụọ merịe ha n'agba penarịtị.
Nke a bụ nzute nke abụọ Ọlgeria na Senegal na-ezute onwe ha n'asọmpị Iko Mba Afịrịka nke afọ a.
Aljeria ji otu ọkpụ asataghị asata merie Senegal na nzute ahụ.
Etu mba abụọ a kwụ n'asọmpị a
Senegal:

Sengal agbaala asọmpị isii. N'ime ya ha meriri anọ, gbaa nhatanha otu ma gbara aka n'otu.
Ha nyekwara gọọlụ asatọ
Onye egwu ha ama ama bụ Sadio Mane
Algeria:

Ebe foto si, EPA
Algeria agbaala asọmpi isii. Merie ise n'ime ha ma gbaa nhatanha n'otu.
Ha enyeela goolu 12
Onye egwu ha ukwu na-atụ nkọ bụ Riyad Mahrez.












