Chika Idoko vs PDP Enugu: Ụlọikpe Ukwu dị n'Enugwu enyela PDP mmeri n'ikpe ha na Chika Idoko

Ụlọ ikpe elu nke Enugwu Steeti

Ikpe na-aga kamgbe n'etiti pati Peoples Democratic Party (PDP) nke Enugwu Steeti na Mazi Chika Idoko abịala n'isi njedebe dịka ụlọikpe Ukwu nyere PDP mmeri.

Ọkaikpe Folashade Giwa-Ogunjobi kwuru na ya akagbuola ma kposaa ikpe ahụ ma kwuo na akwụkwọ nwamadị a bụ Chika Idoko gbara PDP achịtaghị aja (Locus standi).

Ihe nke a pụtara bụ na nwamadị ahụ abụghị onye pati PDP, n'ihi ya, onweghị ihe gbasara ya n'ihe na-eme n'etiti PDP na INEC.

Ọkaiwu Amucheazi kọwara na Ọkaikpe ahụ atụpụla ya bụ ikpe dịka okwu ahụ achịtaghị aja ọbụla.

Ihe ndị ọzọ mere tupu ekpebie ikpe a

Aha onyonyo, Ụlọikpe ehigharịala ikpe na-agbagha PDP isonye ntuliaka gọvanọ Enugu

Ụlọikpe nke Etiti dị n' Enugwu edobela abalị 15 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023 maka ikpebi ikpe ma ọ ga-akagbu PDP Enugwu ịzọ ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu na ntuliaka na-abịa

Otu nwoke bugara ya bụ mkpesa n'ụlọikpe bụ Chika Emmanuel Idoko kwuru na ya gbadoro ụkwụ na ihe iwu ntuliaka (Electoral act "section 77 sub 3)nke nyere iwu ka pati ọbụla buga akwụkwọ ndebanye aha ha( register) nye INEC ihe dịka ụbọchị iri atọ tupu oge ezuo.

Mana dịka ya bụ akwụkwọ ọ gbara nke akara ya FHC/EN/CS/217/2022,Idoko kwuru na ndị pati PDP wegara Inec akwụkwọ ndị otu ha n' ụbọchị isii nke ọnwa Mee,afọ 2022, ka ya bụ oge gara.

N'ikpe ahụ nke Chika Idoko kpụpụ ndị INEC, ndị PDP, nakwa ndị ji pati PDP azọ ọkwa ọbụla n'Enugwu, ọ rịọrọ ụlọikpe ka ọ kagbuo ma kwụsị ndị otu PDP iso zọọ ọkwa na steeti ahụ na ntuliaka na-abịa.

Ụnyaahụ(2/2/2023) dịka ya bụ ikpe na-ebiri ọkụ, ọkaiwu na-ekwuchitere Chika Emmanuel Idoko ọnụ ya bụ T Ekpeyong kwuru na nwa amadi ahụ kwusiri ike ikwu na Electoral Act nke Section 77 bụ nke gbadoro ụkwụ were na-asị ụlọikpe kagbuo ndị PDP iso zọọ ọkwa ọbụla.

Ndị ọkaiwu

Ndị ọkaiwu nnukwu bụ SAN gbakọrọ maka ikwuchite ọnụ ndị agbara akwụkwọ bụ Peter Mbah na ndị niile na-aga ụlọomeiwu n' Enugwu steeti nakwa Ụlọomeiwu nke Etiti bụ Onyechi Ikpeazu SAN, Anthony Ani SAN, Justina Offia (Mrs) SAN, nakwa Ogochukwu Onyekwuluje SAN.

Ndị ọkaiwu ukwu ahụ kwuru na mazi Chika Idoko abụghị onye PDP, na ọ bụ onye Pati ADC, nke a mere na o nweghị ebe mgbakwasị ụkwụ( Locus Standi)" ịi gba PDP akwụkwọ.

Ha kwukwara na o buteghi ya bụ ikpe n'oge nke mere ka ọ gaghara ịdịkwa ire( (statute of Limitation) oge INEC nyere maka mkpesa gafee.

Ọkaiwu Peter Mbah

Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ na March 2022 ka ha nyere INEC aha, kama ha wegara nke a na-akpọ soft copy na may 2022, nkea mere na ha adaghị iwu Were yọọ ụlọ ikpe ka ọkachapụ ya bụ ikpe.

Okwuchite ọnụ Mazị Chika Idoko gwara ụlọikpe ka ọ kagbuo pati PDP n'Enugwu nakwa ndị niile na-azọ ọkwa n'ihi na ha jị ihe gosiri na ha dara iwu Electoral Act.

Jọstịs Folashade Giwa-Ogunbanjo gechara ihe niile ha kwuru were dobe ya bụ ikpe n'ụbọchị Febụwarị 15,2023 ka ya kabie ya bụ ikpe.