'Nye anyị mmiri, nye anyị nchekwa'... Arịrịọ ndị Enugwu na-arịọ Peter Mba

Aha onyonyo, 'Nye anyị mmiri, nye anyị nchekwa'... Arịrịọ ndị Enugwu na-arịọ Peter Mba

Peter Mba ga-amalite ọchịchị dịka gọvanọ Enugwu steeti n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ a, mana olileanya ndị mmadụ nwere n'ebe ọ nọ karịrị akarị.

BBC Igbo jụrụ ụfọdụ ndị bi n'Enugwu ajụjụ ihe ha na-atụ anya n'aka gọvanọ ọhụrụ ha, otu ọkpụrụkpụ ihe ha kwuru bụ maka nsogbu enweghị mmiri.

Kamgbe ọtụtụ afọ, ụkọ mmiri so n'ihe ndị mmadụ kacha eme mkpesa ya na mpaghara Enugwu, ma nebe ndị mepere emepe ma ime obodo.

Ime ka mmiri gbawa sokwa n'otu nkea Peter Mba kwere oge ọ na-aghagharị na-achụ nta vootu.

Ihe ọzọkwa ndị mmadụ rụtụrụ aka bụ iwulite ọnọdụ nchekwa n'Enugwu iji belata oke ogbugbu na ntọrọ mmadụ bụ nke na-emekarị na steeti ahụ n'ọdị nso a.

Iji maa atụ, n'ụbọchị Sọnde, Maachị 26, ndị ojiegbe wakporo ndị uweojii na mpaghara Uwani Enugwu ma gbagbuo mmadụ abụọ n'ime ha.

Akụkọ maka mwakpo ndị ojiegbe nakwa ntọrọ mmadụ bụzi chi bọọ a nụ ọzọ n'Enugwu.

Ndị mmadụ gwara BBC Igbo okwu kwuru na ha nwere nchekwube na ọchịchị Peter Mba ga-eweta ihe ọjọọ niile ndị a n'isi njebede.

Gere ihe ha kwuru n'uju n'onyonyo a dị n'elu.

Ndị kwuru okwu maka ihe ha na-atụ anya n'aka Gọvanọ Enugwu steeti na-abata ọhụrụ