Kwalite udo, belata ụbịam... Ihe ndị Ebonyi chọrọ n'aka gọvanọ ọhụrụ ha
Dịka a họpụtarala onye ọhụrụ ga-anọchi David Umahi dịka gọvanọ ọhụrụ n'Ebonyi Steeti, ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ ekwuola ihe ha na-atụ anya n'aka Francis Nwifuru ony meriri ntuliaka ahụ.
Ndị gwara BBC Igbo kwuru na ihe ka ha mkpa bụ ime ka ndị ntorobịa nwee ọrụ, nke a ga-ebelata ụbịam ma belatakwa mpụ dị icheiche dịka izu ohi na igbu mmadụ.
Ha kwukwara mkpa ọ dị na gọọmentị ga-emetụ ndụ ndị nkịtị aka n'abụghị naanị iwepụta ọrụ maka ndị guru akwụkwọ n'ogogo mahadum.

Francis Nwifuru - Gọvanọ ọhụrụ Ebonyi
Francis Nwifuru bụ onye kacha bụrụ nwata a họpụtarala ịbụ gọvanọ Ebonyi steeti dịka ọ dị afọ 47.
Ọ bụ ya ji ọkwa 'Speaker' n'ụlọ omeiwu Ebonyi Steeti ugbua, bụ ọkwa nke ọ ga-ahapụ ma bụrụzie gọvanọ n'ụbọchị Mee 29, 2023.
Nwifuru kwere nkwa na otu ebe ọ ga-eleba anya bụ na ngalaba agụmakwụkwọ nakwa ngalaba ahụike nke steeti ahụ.


