Etu ndị ọrụ Inec n'Abia si jichie onyeisi ha maka ụgwọ o ji ha kemgbe 2019

Ndị kwụ n'ụlọorụ Inec dị na Abia steeti

Ndị ọrụ ngalaba na-elekọta ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) n'Abia steeti, jichiri onyeisi ha ihe ruru awa abụọ n'ụbọchị Tuzde.

Ha mere nke a n'ihi iwe ụgwọ eji ha maka ọrụ ndị ha rụgasịrị gụnyere nke ntụliaka afọ 2019.

Otu onye n'ime ha gwara BBC na nwoke ahụ aha ya bụ Joseph Iloh, na-akwado ịpụ n'ọkwa ahụ dịka ọ nọchara afọ ise na ya, bịara n'ụlọorụ iburu ngwongwo ya mgbe ndị ọrụ gbakọrọ ịgosi iwe ha.

Ha gara n'ihu gbachie ụzọ ọpụpụ ụlọọrụ ahụ ma jirikwa ụgbọala ha gbochie ọnụ ụzọ ebe ahụ na-ekwusi ike na Iloh agaghị apụ rue mgbe ọ kwụrụ ha ụgwọ niile o jibu ha.

Ụgbọala Inec eji nọchie ụzọ ụlọọrụ ahụ
Nkọwa foto, Ụgbọala Inec ahụ eji nọchie ụzọ ụlọọrụ ha dị n'Abia steeti

Mgbe Iloh hụrụ na ndị ahụ anaghị egwu egwu, o nyere iwu ka a kwụọ ndị ahụ ụgwọ nke atụmatụ ndebanye aha a na-eme ugbua.

Ọ bụ mgbe nke a mere ka ndị ahụ pụziri n'ụzọ ma kwe ka nwoke ahụ gaara onwe ya ebe ọ na-aga dịka awa abụọ gachara.

Otu onye ọrụ n'ebe ahụ aha ya bụ Ulunma kwuru na ụgwọ ndị e ji ha gụnyere ọrụ ntuliaka e mere n'afọ 2019, ntụliaka imeụlọ nke pati dị icheiche mere n'afọ a nakwa ndenye aha maka ntuliaka nke na-aga n'ihu ugbua.

Mgbe BBC Igbo gara n'ụlọorụ Inec ahụ dị n'Abia, a hụrụ ụfọdụ ndị ọrụ ahụ ebe ha na-akwụgharị na-aṅụrị maka ụgwọ ndị a kwụrụ ha.

Ndị ọrụ Inec n'Abia steeti

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Joseph Iloh n'ekwentị, ọ kọwara ihe mere e ji jide ndị ahụ ụgwọ.

Ọ sị na wuru wuru dị n'aha ndị rụrụ ọrụ e dere nke mere na e kwesịrị ịme ya nnyocha ọfụma tupu a kwụọ ụgwọ.

Iloh kwetara na enwere ụgwọ ndị ọzọ e ji ndị ọrụ ahụ n'ezie.