You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mmanụanwụ ọ ka shuga mma n'ezie?
Gịṅị bụ mmanụ anwụ?
Mmanụ anwụ bụ mmanụ na-acha edo edo nke anwụ na-emepụta ma ha wekọtachaa ihe a kpọrọ 'nectar' n'ukwu osisi ndị na-ama ododo. a na-edebe ya n'ime ọgba mmanụ anwụ 'honeycomb' iji nye anwụ ndị ahụ nri n'oge oyi.
N'oge gboo na mba Gris, a na-ahụta mmanụ anwụ ka 'nri ndị chi' ebe a na-ahụta ya ka ọgwụ e ji agwọ ọtụtụ ihe na Chaịna.
Ihe mmanụ anwụ na-enye n'ahụ
Oge ọ dị n'agbidi etu chi siri kee ya, o nwere amino acid, antiogzidant, vaitamin, mineral, na shuga. O nwere ọtụtụ fruktose mere na ọ na-atọkarị shuga ụtọ mana na a tulee ya ka nri ndị nwere shuga na mgbadume, ọ nọ n'etiti.
Ihe o nwere n'ime otu ngaji (20g) mmanụ anwụ:
• 58kcal / 246KJ
• 15.3g mgbadume
• 15.4g shuga
• 0.1g protin
• 0g abụba
Uru mmanụ anwụ bara n'ahụike
Uru mmanụ anwụ bara n'ahụike dabere n'etu e siri hazigharịa ya nakwa ụdịrị ododo anwụ tụrụ oge ọ na-anakọta ododo.
Mmanụ anwụ nke a na-esibeghi n'ọkụ, sachaa ya maọbụ hazigharịa ya n'ụzọ ọbụla na-akacha enye aka n'ahụike maka na akụrụngwa ndị dị na ya apụbeghi site na nsikwa maọbụ nhazigharị.
a na-eji mmanụ eme ọgwụ e ji echekwa ọnya kamgbe ọtụtụ narị afọ n'ụlọọgwụ. A na-eche na ọ na-enye aka agwọ ọnya dịka ọkụ na ndị ọzọ na-emighi emi ọsịsọ.
N'ihi na ihe dị n'ime mmanụ anụ bụ ọkacha shuga dịka 'glucose na fructose' bụ ụdị shuga abụọ na-adọta mmiri, mmanụ anwụ na-adọrọ mmiri dị n'ọnwa ma mee ya ị takọrọ ghara inye ohere ka nje biri n'ime ya.
Mmanụ anwụ ọkachasị ndị na-achatụ ojii nwere kemikal ndị iti kpọrọ 'flavonoids'
A na-ekwu na ya bụ 'flavonoid' ahụ nwere ihe ndị na-achụ nje bakteria na nke vaịral nakwa nje nwereike ime ka ọnya na-enwuru ọkụ ọsọ. N'ihi flaonoid ahụ, ụfọdụ na-elezi anya na mmanụ anwụ ka mma karịa shuga.
Mana agbanyeghi na mmanụ gunyere ka nri ndị na-ebughi mgbadume karịa, ọ ka nwekwara ọtụtụ ihe a kpọrọ 'calories' nke nwerieke ike ime ka shuga dị n'ọbara mmadụ gbalie elu nke pụtara ka ndị mmadụ jiri uche ha ma ha ne-eri ya.
Mmanụ anwụ ọ ka mma karịa shuga?
Mmanụ anwụ nwere ihe a kpọrọ GI nke pekarịrị shuga nke pụtara na ọ naghị ebulie shuga nọ n'ọbara mmadụ ọsịsọ. Mmanụ anụ ka shuga atọ ụtọ nke pụara na ị gaghị na-etinye ọtụtụ ya mana ọ kakwa shuga nwee nke a kpọrọ kaloris na-ebu mmadụ ibu. Nke mere na ị ga na-etinye anya na ngaji ole ị na-ekuru.
Ọ bụrụ na mmanụ anwụ ka gị mma, gbalia nweta nke a na-ahazigharịbeghi etu ọbụla bụ nke nwere akụrụngwa ya niile karịa shuga ọcha ma gị nwere nwayọọ na-eri ya. Ma chetakwa na ihe ọbụla mmanụ anwụ na-enye n'ahụ dị ntakịrị nke bụ na e nwerike ichefu ya.
Mmadụ niile enwereike iri mmanụ anwụ?
A na-ahụ mmanụ anwụ ka 'shuga' efu bụ nke a na-ekwu ka e belata aka etu e si etinye ya na nri - ya bụ na-agbanyeghi na ọ dị mma onye ọbụla nwereike iri mana ka e rie ya n'usoro e siri kwuo ka e rie ya.
Maka ọrịa shuga, maọbụ ndị na-achọ ibelata shuga dị ha n'ọbara, e nweghi uru dị ọkpụrụkpụ ọ bara iji mmanụ anwụ dochie shuga na nri maka na ha abụọ ga-emetụtakwa shuga dị n'ọbara gị na ngwucgha.
Gụnyere nke a, ụmụaka niile na-erubeghi otu afọ erikwala mmanụ anwụ agbidi maọbụ mmanụ anwụ e mepụtara n'igwe nke a bụ maka na ha nwereike ibute otu ihe a kpọrọ 'botulism'.
Agbanyeghi na mmanụ anwụ na-amasị ọtụtụ n'ime anyị itinye na nri, ọ na-aghụ amasịkwa onye niile. Mmanụ anwụ abụghịkwanụ 'vegan' nke pụtara na o siteghi n'osisi n'ihi na imepụta mmanụ anwụ na-ebute mmekpa ahụ nye anwụ ndị ahụ bụ ndị rụrụ nnukwute ọrụ imepụta ya maka onwe ya na ihe ha ga-eri n'oge oyi.