Naira to dollar: Ihe mere naịra ji ama afọ n'ala ma a tụnyere ya dọla na ego ndị ọzọ

Naira to dollar: Ihe mere naịra ji ama afọ n'ala ma a tụnyere ya dọla na ego ndị ọzọ

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere ego na akụnaụba bụ Victor Aluyi akọwaala ụfọdụ ihe mere akwụkwọ ego naịra jiri adala ala ma a tụnyere ya ego ndị ọzọ ọkachasị dọla.

O kwuru na ihe kacha akwatu naịra bụ na ndị chọrọ ego dọla karịrị akarị mana Naịjirịa enweghi ego ha ga-eji mezuo atụmatụ ijiko egoọnụ dọla n’ahịa niile na Naịjirịa ugbua.

Ọ dịla anya naịra malitere ịda n’ahịa megide ego dọla mana nke ugbua, a ga-asịzi na oji imi gwuo olulu n’ala ma wubanye jiri aja kpochie onwe ya.

Ihe so bute nke a bụ na ndị na-agbanwe ego a kpọrọ Bureau de Change maọbụ ahịa ojii Black Market n’Abuja kwuru na ha na-akwụsịzi ọrụ.

Nke a mere ego naịrịa jiri daa ruo otu puku naịra na narị iri ise na iri abụọ na ise kwa otu dọla.

Ọnọdụ a metụtara ma onye ukwu ma onye nta jiri bee nwịị maka ọdịda a na-emetụta ndụ ndị ha n’ụzọ niile.

Aluyi rụtụrụaka n'ụfọdụ ihe gọọmentị nwereike ime iji hụụ na naịra bilitere ọzọ nke gụnyere;

  • Gọọmentị itinyekwu dọla n’ime azụmaahịa dị iche iche na Naịjirịa.
  • Gọọmentị welite aka na mmepụta mmanụ agbidi ka o welite ego ha na-enweta n'orire mmanụ agbịdị.
  • Ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank' ịkwụ ụgwọ niile ha ji ndị ha na ya na-azọkọ ahịa n'akwụkwọ ego dọla.
  • Gọọmentị welite ego ha ji azụ ahịa ka ndị mmadụ na-ewebatakwu ego na Naịjirịa.

Kirie ihe o kwuru n'uju;