Cameroon na Nigeria: Ihe ị ga-ama maka asọmpi bọọlụ kachasị n'Africa

Ndị egwuregwu Kameroon, ọtụtụ ndị yi akwa Naịjirịia ka ha gbanwechara uwe - na-eme mmemme mmeri Afcon nke afọ 2000 megide Naịjirịa na Lagos

Ebe foto si, GETTY IMAGES

Nkọwa foto, Ndị egwuregwu Kemerun, ọtụtụ ndị yi akwa Naịjirịia ka ha gbanwechara uwe - na-eme mmemme mmeri Afcon nke afọ 2000 megide Naịjirịa
    • Onye dere ya, Isaiah Akinremi na Emmanuel Akindubuwa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa, Lagos

Iko mba Afrịka 2023, Agba 16: Naijiria v Kemerun

Mgbe Kemerun merichara Gambịa n' asọmpi ikpeazụ ha gbara na ndi njiko nke Ch were tozuo ibanye agba ọzọ, oge ahu ka ohere Kemerun na Naịjịrịa ịzụte n' agba nke 16 bidoro.

Mutiu Adepoju, onye bụbu onyeisi ndị Naijiria gwara BBC Sport Africa, "Asọmpị n' etịtị Naịjirịa na Kemerun bu otu n' asọmpi kasị na mba Afrịka."

"Kemerun mere ka Naịjirịa hara ibu iko mbaụwa Afrika n'asọmpị ha gbara ugboro atọ. O nweghị obodo ọzọ ga-anya isi nke ahụ n'Afrika."

'Naijiria 'na-aga agha dịka ụmụnne' - Osimhen

Egwuregwu Satọde n'ọgbọ egwuregwu 'Felix Houphouet-Boigny' dị n' Abidjan ga-abụ ihe dịka asọmpị ikpeazụ e ji buo iko nke Afcon afọ 1984 agbaburu n'otu ebe ahụ.

N'oge ahụ Kemerun, ya na ndị a ma ama na bọọlụ ha dịka Roger Milla, Joseph-Antoine Bell na Theophile Abega, meriri 3-1 megide otu ndị na-eto eto nke Naịjirịa nke Stephen Keshi nwụrụ anwụ duru.

Mmeri ọzọ na-agbawa ọbị dịịrị Naịjirịa n'afọ 1988 Afcon nke agbara na Morocco, ebe Kemerun buru iko mba Afrịka nke abụọ n'ihi ọkpụ goolu nke Emmanuel Kunde nwetara site na penariti.

Asọmpị ọzọ Naịjirịa na Kemerun gbara kpu ọkụ n' ọnụ bu nke a gbara na Legọs ,Afcon n' afọ 2000, nke Gana na Naijiria kwadoro.

Maka n' asọmpị ahụ bụ na Naịjirịa, 'Super Eagles' nwere nkwado siri ike, na nkwado ha n'otu aka ahụ ka ha na-achọ ịbọ ọbọ n'oge gara aga.

Benedict Akwuegbu, onye so na ndị otu egwuregwu 2000 gwara BBC Sport Africa, sị, "Enwere oke nchegbu n' ogige ahụ tupu asọmpi ikpeazụ, n'ihi na anyị ma na Kemerun nwere ọtụtụ ezigbo ndị egwuregwu ma ekwbe maka ihe merela eme n'akụkụ ha."

Nigeria vs Cameroon isi na isi n' AFCON

Ebe foto si, BBC SPORT

Afọ iri anọ Naịjirịa na Kemerun zutere na Abidjan...

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ịbọ ọbọ, ikike ịnya isi n'asọmpi mpaghara Afrịka ga-abụ isi okwu n'abalị Satọde na 20: 00 GMT, na-enwe ebe na nkeji iri na ise ga-akwado.

Ọ ga-abụ nzukọ nke iri abụọ na ise dara n'etiti Naịjirịa na Kemerun n'asọmpị niile ya n' ọgbakọ Afcon nke asatọ n'etiti ndị oke otu egwu bọọlụ abụọ.

Naijiria nwere ndekọ dị mma n'isi na isi nke mmeri 12 n' asatọ agbatara ndị ha na ha na-asọmpi, bụ ndị kwetere na ha meriri n'asọmpi ka ukwuu.

Patrick Suffo bụbu onye na-agbara Kemerun gwara BBC World Football' sị,"Kemerun na Naijiria bụ ndị agbataobi, ya mere ha bụ ndị na-asọ mpi n'oge gara aga."

Otu abụọ ahụ atachiela obi n'isi mmalite nke mkpọsa ha na mba Ivory Coast, ebe Super Eagles nyere gọọlụ naanị ugboro abụọ mgbe egwuregwu ha na ebịdọ, n'agbanyeghị na ha na-anya isi omimi mwakpo nke gụnyere onye egwuregwu bọọlụ Africa nke afọ Victor Osimhen.

Akwuegbu kwuru sị,"Onye nchịkwa (Jose Peseiro) chọrọ onye na-akwado ya ka ya na Osimhengbaa bọọlụ."

"Anyi ga enye gọọlụ ma ọ bụrụ na anyị ga esọ usoro omenala anyị bụ 4-4-2 anyị."

Nzukọ Afcon ikpeazụ n'etiti Nigeria na Cameroon bịara n'otu ọkwa nke asọmpi na Egypt na 2019.

Onye egwu bọọlụ Watford na Manchester United mbụ bụ Odion Ighalo nyere gọọlụ ugboro abụọ ka Super Eagles jịri merie Indomitable Lions 3-2, tupu Naịjirịa turu ugo ndị nke atọ.

"Enweghị ohere maka mmejọ, karịsịa mgbe gị na ndị egwuregwu dị ka Cameroon na asọmpị" Adepoju dị afọ 53 kwuru.

"Anyị ga-ewere ohere anyị nyee gọọlụ n'ihi na ha nwere ike ghara ịbịa ọzọ."

Onye egwu Nigeria Victor Osimhen (n'aka ekpe) na onye egwu Cameroon Karl Toko Ekambi (n'aka nri) nwere otu goolu n'asọmpi Afcon.

Ebe foto si, BBC SPOR

Kedu ihe ndị egwu bọọlụ Naijiria na-amasị na-ekwu na Legọs?

Onye na-akwado Naijiria bụ Lanre Vigo kwuru sị, "Ọ bụ egwuregwu kachasị ukwuu n'egwuregwu bọọlụ Afrịka, ụjọ na-atụ m mgbe ọbụla Naijiria na-ezute Kemerun n'ọkwa ọ bụla. M na-ekiri Afcon 2000 ikpeazụ mgbe m bụ nwata na ihe ncheta nke mmeri ahụ apụbeghị n'uche m oge ọbụla anyị na ha ha na-ezute. Enwere m olileanya. Eagles meriri na Satọde."

Onye njikwa egwuregwu n'ime ime obodo bụ Anthony Adeboye kwuru sị, "M na-ekiri asọmpi Afcon nke 1984 ebe otu ndị ntorobịa Naijiria meriri n' otu ndị Kemerun siri ike.

"Ndị otuegwu bọọlụ Naijiria dị ugbua dị nnọọ mma karịa ndị na-emegide anyị. Naanị anyị kwesịrị ịrụ ọrụ na ụzọ anyị si eme egwuregwu ahụ ma lekwasị anya na imeri ma ọlị. ego."

Onye nkuzi bọọlụ bụ Seun Savage sịrị,"Ọ na-adị ka agha mgbe ọ bụla Naijiria na-ezute Kamerun. Onye ọ bụla maara na ọ bụ egwuregwu dị mkpa, ebe mpako na ịnya isi dị n'ihe ize ndụ. Anyị enweghị ike ichefu mmeri ikpeazụ nke Afcon atọ, n'ihi ya, anyị na-ewere egwuregwu ọ bụla dị ka a. ọrụ ịbọ ọbọ."