'Ike Ekweremadu agwaghị onye ọbụla n'ezinụlọ anyị tupu ọ kpọrọ nwa anyị' - Ezinụlọ Daniel
"Ọ bụrụ na ọ bụghị ntọrọ ka Ekweremadu na ndị be ya tọọrọ nwanne m Daniel, gịnị mere na ha ajụghị ese maka ndị mụrụ ya, maọbụ ndị ezinụlọ ya?"
Nke a bụ ajụjụ nwanne Daniel na-ajụ. Daniel (ọ bụghị ezigbo aha ya) bụ nwata nwoke ahụ dị afọ 21, onye Sinetọ Ike Ekweremadu tụrụ mgbere gaa mba UK ịga wepu akụrụ ya tinyere nwa ya nwaanyị bụ Sonia.
BBC chọpụtara ihe omimi ọhụrụ banyere etu e jiri si na Naịjịrịa tụọ nwata nwoke a bụ Daniel mgbere gaa mba Briten.
Nke a bụ mbụ mba Briten na-ama mmadụ ikpe maka ịtụ mmadụ mgbere maka atụmatụ ịwara ime ahụ ya. Cheta na ụlọikpe nyere iwu ka a hapụ ịkpọpụta ezigbo aha nwata nwoke ahụ, maọbụ gosi ihu ya, iji chekwaa ya.
Nnyocha a chọpụtara na ezinaụlọ nwata nwoke ahụ a tụrụ mgbere gaa Briten nọzị n’arịrị kemgbe. Nwanne ya nwoke gwara BBC na “Ezinaụlọ anyị niile na-ebe akwa kemgbe dịka nna anyị akwaala arịrị nke ukwuu ma daa n'ute ọrịa”.
Ike Ekweremadu onye bụbu sịnetọ n’ụlọọmeiwu Naịjirịa natara ntaramahụhụ maka okwu a dịka ya bụ okwu dakwasịrị ya, nwunye ya nakwa otu nwoke ọzọ n’isi.

Ebe foto si, Met Police
E jidere Ekweremadu na nwunye ya na Briten n'ụbọchị 23 nke ọnwa Juun 2022 maka ebubo ịtụ mgbere ime ahụ mmadụ.
E mechara maa Ekweremadu, nwunye ya bụ Beatrice, na otu dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta, ikpe n'ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee, maka okwu ịgba ohu ọgbara ọhụrụ nakwa ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ.
Otu ikpe kpere ikpe Ekweremadu chọpụtara na o so hiwe iwu mere ka ịtụ mgbere ahụ mmadụ bụrụ ịda iwu megide Naịjirịa.
Nwata nwoke ahụ, onye na-azụbu ahịa na Legọs abụrụla onye na-agbazi ọsọ ndụ ya maka egwu na ihe nwereike ime ya ma ọ lọghachite Naịjirịa.
N'ime akụkọ a, anyị ga na-akpọ nwata ahụ 'Daniel'.
Nwanne ya nwoke onye gwara BBC Igbo okwu, rịọkwara ka a ghara ịgba ya n’anwụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ndị ma Daniel kwuru maka ya
Ndị ma Daniel ji ụjọ gwaa anyị okwu n’ihi ha chee na etu a sịnetọ Ekweremadu bụ onye nwere agba na Naịjirịa na ndị mmadụ nwereike iji iwe maka etu e siri tụọ ya nga malite iwakpo ha.
Anyị gara n’ụlọahịa ebe nwanna Daniel na-ere ihe, bụkwa ebe ọ nọbụ na-ere ihe ndị e ji akwalite ekwentị.
Nwanna ya gwara anyị na o chee na “A ghọgburu ya aghọgbu were bupụ ya ebe a”.
O kwuru na ha na nwanne ha nwoke onye ndị uweoji Briten na-echekwa ugbua ekwubeghi okwu kemgbe Febụwarị 2022 mgbe ha malitere ịchọ ya.
Onye nwe ụlọ ebe Daniel ha bi nke bịaziri dị ka ezi nna ya ukwu gwara BBC na o kwetere na ọ gaghị eji anya ọcha ree akịrị ya.
N’ama ọ gbara banyere ya, o kwuru na nke a bụ:
“n'ihi na ọ ma na e nwere ụzọ ndị ọzọ mmadụ ga-esi nweta ego. E nyegodị ya ego ruru otu nde paụndụ, ọ gaghị eme ihe dị etu ahụ”.
BBC chọpụtakwara ihe ndị ọzọ nọ na-eme na Naịjirịa mgbe akụkọ nnwụchi Ekweremmadu na nwunye ya pụtara ihe.
Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu Naịjirịa gbara mbọ ịkpọghachite Ekweremadu
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N’etiti nnyocha ihe a mere, ụfọdụ ndị omeiwu Naịjirịa nke Ekweremadu bụbu osote onyeisi ha nwara ibulata ikpe ya bịa Naịjirịa.
Onyeisi ngalaba ndị uweojii Met na-ahụ maka ịtụ mgbere ndị mmadụ n’ọgbara ọhụrụ a bụ Detective Superintendent Andy Furphy kwuru na ha gbakwara mbọ “ịhụ nwata nwoke ahụ” nke mere “o doo anya na e nwere ihe dị aṅaa nọ ha n’uche, nke a mere anyị jiri mata na ya bụ nwata nwoke enweghizi ezi nchekwa”.
Mgbe ndị uweojii a nụchara ndụmọdụ ndị ọkaiwu ha, ha kagburu atụmatụ inye ndị omeiwu Naịjirịa ohere ịhụ nwata ahụ.
Ngalaba BBC nke File on 4 gbara onye omeiwu Naịjirịa bụ Adamu Bulkachuwa ajụjụ ọnụ banyere atụmatụ a dịka ọ bụ nye bụ onye nọchitereanya ndị ọzọ ma na-edu otu ndị chọrọ ka abulata ikpe ahụ Bulkachuwa onye bịarala leta Ike Ekweremadu n'ụlọ mkpọrọ kwuru na ọ nwara “iji ikike ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ikike ọchịchị hụ na ọ kwenyere gọọmentị mba Briten ọkụ n’ike ma hụ na a hazịgharịrị ihe a”.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na atụmatụ ha abụghị iji hụ na ogbo ha “lara na nta” n’ihi na “Naịjirịa binyereka n’iwu megidere ịtụ mgbere mmadụ”.

Ihe ndị ọzọ ndị uweojii Met gwara BBC
- Ọ bụ n’ụbọchị 21 nke ọnwa Juun 2022 ka onye uweojii Andy Owen natara ozi na Ike Ekweremadu na nwunye ya (ndị ha na-enyo) febatara Lọndọn
- Ọ bụ etu ahụ ka e si nwụchie ha abụọ ma napụ ha ekwentị ha ma hụ ọtụtụ ihe ịgbaama nke gosiri na ha kwụrụ ụgwọ maka ịwa ime ahụ nwata ahụ ọnụego ya ruru nde naịra anọ na ụma
- Ụlọikpe kpara ikpe a kwuru na Dọkịnta Obinna Obeta onye ikpe makwara maka okwu a emebuola ihe dị etu a n’afọ 2021 n’ụlọọgwụ Royal Free Hospital nke bụ ebe ha nwakwara ịwa ime ahụ nwata ahụ tupu ndị dọkịnta achọpụta na e nwere ihe ndị dị aṅaa so okwu ahụ ma kagbuo atụmatụ iwa ime ahụ nwata ahụ
- Ha kwukwara na ọ tụrụ asị na onye a wara ime ahụ ya nwere nye ya akịrị ọhụrụ bụ nwanna ya ebe nnyocha ha gosiri na nke a abụghị eziokwu
- A kwụrụ onye ga-ekuziri Daniel ihe ọ ga-ekwu ụgwọ bụ onye ma asụ asụsụ Bekee (nke ọ machaghị asụ)
- N’ụlọikpe, ụbọchị ikpe mara Ekweremadu na nwunye ya, Daniel amaghi ihe ‘Guilty’ pụtara nke bụ ‘ikpe ima mmadụ’ na Bekee
Etu ikpe a pụrụiche siri kpata mgbanwe iwu
- Okwu otu nwoke mba India dị ebe afọ 60 nke a nwụchịrị na Briten dịka a na-enyo ya maka okwu ịghọgbu mmadụ maka ịwara ime ahụ ya. A nwụchiri ya ma meecha tọhapụ ya ka o si n’ụlọ na-abịa ikpe ya
- Mkpesa olemole ndị mmadụ nyerela ndị uweojii banyere ndị e chee lọghachịtere mba Briten bụ ndị kwụrụ ọgwọ iwere ime ahụ mmadụ
- Na Julaị nke afọ gara aga, mba England, Scotland na Wales mere ọ bụrụ ihe megidere iwu mmadụ ịkwụ ụgwọ maka ịwara ma were ime ahụ mmadụ
- Ọ bụzi iwu na ụlọọgwụ niile nọ na Briten ga-eme mkpesa nye ndị uweojii banyere onye ọbụla a na-enyo maka okwu ịtụ mgbere mmadụ nakwa atụmatụ ịwa ime ahụ mmadụ nke a kwụrụ onye ahụ ụgwọ maka ya













