Nwoke ndị NDLEA nwuchiri nyụrụ ngwugwu ọgwụike 95

Ebe foto si, NDLEA
Ngalaba Gọọmentị Naijirịa na-aluso ọgwụike ọgụ bụ Ndlea n'aha ịchafụ ekwuola na ha anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Nwakanma Uche n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe nke dị n'Abuja maka mgbere ọgwụ ike.
Nwakanma dị afọ 36 nyụpụtara ngwugwu ọgwuike iri itolu na ise ọ chọrọ iji banye ụgbọleu na-aga mba Fransị.

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
O kwuru na ọ lọtara ịlụ nwaanyị ma sị na ọ bụ otu nde Naira na ụma ka a ga-akwụ ya ma ọgbachaa mgbere ọgwụ ahụ.
N'Akwa Ibom ka ndị Ndlea kwukwara na ha nwuchiri otu nwaanyị bụ Irene Emmanuel Bassey n'ụbọchị Satọde dịka ahụrụ Igbo ruru 30.5kg n'ụlọ ya dị n'obodo Ikpa, na okpuru ọchịchị Esit Eket.
Ahụla ọrịa Monkeypox n'ahụ mmadụ 21 na Naijirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-aluso ọrịa ọgụ na Naijirịa bụ Ncdc n'ịchafụ ekwuola na ha ahụla ọrịa monkeypox n'ahụ mmadụ iri abụọ na otu na Naijirịa.
Ọ bụ onyeisi otu a bụ Ifedayo Adetifw kwuru na ọ bụ n'ime steeti itoolu ka ha hụrụ ọrịa ndị a nke gụnyere Abuja - 5 , Adamawa - 5, Legọs - 4, Bayelsa - 2, Delta - 2, Krọs Rịva - 1, Kano - 2, Imo - 1 na Rịvas Steeti - 1.
Ha depụtara na Websaịt ha na otu onye dị afọ iri anọ nwụrụla maka ya bụ ọrịa.
Ahụla ozu mmadụ14 so ụgbọelu dara a na-acho achọ na mba Nepal

Ebe foto si, Getty Images
A hụla ozu mmadụ iri anọ n'ime mmadụ iri abụọ na abụọ dịka ụgbọelu bu mmadụ iri abụọ na abụọ dara n'ụbọchị ụka na mpaghara Mustang na mba Nepal.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha mba Nepal kwuru na ha ka na-achọ ma e nwere ndị ka dị ndụ kama ọnọdụ mbara eluigwe na ugwu nọ n'ebe ahụ na-echere ha aka mgba.
Ndị nọ n'ime ụgbọelu a gụnyere mmadụ anọ si mba India, abụọ ndị mba Jamanị na mmadụ iri na isii bụ ndị mba Nepal.
Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ndị ọzọ so ya bụ ụgboleu mgbe ọ dara.








