Gịnị bụ 'Revenge Porn'?

Ọbịbịa soshal midia emeela ka mgbasa ozi dịwanye ngwa ngwa, mana o mekwaala ka mfesa ihe onyonyo dị aṅaa dị iche iche na-efesa.
Nke na-ewu ugbua na mba dị icheiche, tinyekwara Naịjirịa, bụ ikesa ihe onyonyo onye gba ọtọ iji megbute onye ahụ.
Ọ bụ nke a ka a na-akpọ "revenge porn" na bekee.
N'abalị ole na ole gara aga, otu nwaagbọghọ ji akara Twitter ya wee bo otu ụkọchukwu a ma ama ebubo na o dinara ya.
Nwaanyị a kesara foto gosiri ọtọ nwoke, ma kwuo na ọ bụ ụkọchukwu ahụ ziteere ya foto ahụ oge ha na-akparịtaụka n'ekwentị.
Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ malite ibo nwaada ahụ ebubo na ihe o mere bụ 'revenge porn'.
Nkọwa ihe bụ 'revenge porn'

Ebe foto si, Iwaria
Gọọmentị mba Amerịka kọwara 'revenge porn' dịka: "ikesa aramara maọbụ ọtọ mmadụ dịka foto maọbụ onyonyo, na-anataghị onye ahụ ikike, iji mee ka ihere mee onye ahụ maọbụ ka onye ahụ nwee nnukwu mwute."
Ọ bụrụgodi na mmadụ ji aka ya zigara onye ọzọ foto ọtọ ya maọbụ nke aramara ya, onye ọzọ ahụ enweghị ikike ikesa foto ahụ.
"Revenge porn" sokwa n'ụdị mpụ nke bekee na-akpọ "cyber bullying" nakwa "emotional abuse".
Na mba Amerịka, ọnụọgụgụ gosiri na ụdị mpụ a metụtara ihe ruru mmadụ nde iri.
Ya mere n'afọ 2013, steeti California tinyere iwu mere ka 'revenge porn' bụrụ nnukwu mpụ.
Ọ bụrụ na ha dị mmadụ abụọ maọbụ atọ n'ime onyonyo maọbụ foto aramara, a gaghị ikesa onyonyo ahụ ma ọ bụrụ na a nataghị ha niile ikike ime nke a.
Ọ bụrụgodi na otu onye enyeghị ikike, ọ ga-abụ ihe megidere iwu ikesa onyonyo dị otu a.
Gịnị ka iwu Naịjirịa kwuru maka 'Revenge porn'

Ebe foto si, Screen grab
Ọ bụ eziokwu na enweghị iwu machiri 'revenge porn' kpọmkwem na Naịjirịa, mana e nwere iwu ndị yitere ya.
Ngalaba 170 nke iwu 'Criminal Code Act' kwuru sị:
"Onye ọbụla kpacha anya zipụ maọbụ chọọ izipu (a) ihe ọbụla nwere ike ikpatara mmadụ mmerụ ahụ, maọbụ...
(b) ihe ọbụla na-ata arụ n'anya n'ụdị ihe e dere ede, ihe e sere ese, foto, ihe a kpụrụ akpụ, dịrị gawazie... onye dị otu a ga-aga mkpọrọ otu afọ.

Ebe foto si, Screen grab
Ọzọkwa, ngalaba 24 nke iwu 'Cybercrime Act' e wepụtara n'afọ 2015, megidekwara ikesa onyonyo ọtọ mmadụ.
Iwu a kwuru sị: "Onye ọbụla kpacha anya jiri igwe kọmputa ya ziga ozi jọrọ njọ, ozi aramara mabọbụ ihe ọbụla na-atakasị anya, maọbụ onye ọbụla mere ka e zipụ ozi dị otu a... iji kpasuo mmadụ iwe, tinye mmadụ na nsogbu, gbochiere mmadụ ihe, kparịa mmadụ, merụọ mmadụ ahụ, majaa mmadụ, wetara mmadụ iro na akpọmasị, mebie aha mmadụ...onya ahụ ga-aga mkpọrọ afọ atọ ma a maa ya ikpe, maọbụ ọ kwụọ nha nde naịra asaa (N7million), maobụ ha abụọ.















