Press Freedom Day 2022: Mkpagbu gọọmentị na-akpagbu ọrụ ntaakụkọ karịrị na Naịjirịa - Nigeria Guild of Editors

Ebe foto si, NUJ
Otu jikọrọ ndị welitere isi n'ọrụ ntaakụkọ na Naịjirịa, a kpọrọ 'Nigerian Guild of Editors' akpọkuola gọọmentị ka ha kwụsị mmegbu na mkpagbu ha na-akpagbu ndị ntaakụkọ na Naịjirịa.
Ha mere nke a dịka taa bụ abalị atọ nke ọnwa Mee 2022 bụ ụbọchị nnwereonwe ọrụ mgbasa akụkọ nke Bekee kpọrọ 'World Press Freedom Day' nke afọ 2022.
Ọ bụ ụbọchị pụrụ iche nke otu mbaụwa bụ 'United Nations' wepụtara iji kpọkuo ndị ọchịchị mba dị iche iche ka ha nye ndị ntaakụkọ ohere ka ha rụọ ọrụ ha na-enweghị mgbochi ọbụla.
Isiokwu emume nke afọ a na bekee bụ 'Journalism under digital siege', nke pụtara "Njikpa e jikpara ọrụ ntaakụkọ site n'akụrụngwa ọgbara ọhụrụ ịntanet dị iche iche".
N'akwụkwọ ozi si n'aka Mustapha Isah na Iyobosa Uwugiaren, bụ onyeisi na odeakwụkwọ otu NGE, ha kwuru na mkpagbu ndị ntaakụkọ akarịala na Naịjirịa.
"Ndị ntaakụkọ bụ mgbọrọgwụ siri ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya."
"Ọ bụ ha bụ ikuku ndụ nye obodo ọbụla, nke mere o ji dị nnukwu mkpa ka gọọmentị etiti tinye aka ka ọrụ ntaakụkọ ghara ịghasa."
"Ọ dị mkpa ka anyị chetara ngalaba gọọmentị Naịjirịa niile ka ha cheta mkpa ndị ntaakụkọ dị n'ọchịchị onye kwuo uche ya."
Ihe mere ọrụ ndị ntaakụkọ ji dị mkpa

Ebe foto si, Reuters
Uru ndị ntaakụkọ bara n'ụwa taa juru eju bara abara, maka na ọrụ ha dị oke mkpa.
Nurudeen Yekeen, onye ntaakụkọ rụrụla ọrụ ihe karịrị afọ iri na ise, kwuru na "e wepụ ndị ntaakụkọ, ụwa anyị ga-adị ka ebe onye kpuru isi na-edu onye kpuru isi".
Yekeen bụ onye nchịkọta ndị ọrụ n'ụlọntaakụkọ 'Human Angle' nke isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

Ebe foto si, Screen grab
O kwuru, "Cheta na e nwere ngalaba atọ na ọchịchị onyekwuoucheya, mana ọ bụ ndị ntaakụkọ bụ ngalaba nke anọ,"
"Ọrụ anyị bụ iwepụta ihe ahụ achọghị ka mmadụ mata, ma gbaa ya n'anwụ ka onye ọbụla mara ya."
"E wepụ ndị ntaakụkọ, ndị ọgaranya na ndị ọchịchị ga na-eme ihe masịrị ha maka na ha ma na o nweghị onye ga-ajụ ha ese."
"Ọ bụ ya mere oge niile ha jị achọ ụzọ ime ka ọrụ ntaakụkọ na-esiwanye ike maka ndị otu anyị."

Ebe foto si, @AIT_Online
Lee ụzọ ise mkpagbu ndị ntaakụkọ nwereike isi metụta gị bụ onye nkịtị
1) Ị gaghị enwe ohere ime ka ụwa nụrụ olu gị
Ọ bụ eziokwu na n'ihi sosha midia pụtarala ugbua, ndị mmadụ enweela ohere ime ka ụwa nụrụ olu ngwangwa.
Mana ọ bụ ndị ntaakụkọ na-enye aka mee ka akụkọ ruo n'aka ndị kwesịrị itinye ọnụ na ya.
Iji maa atụ n'ọdị nso a, dịka akụkọ pụtara gbasara ọnwụ otiegwu a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu, ọ bụ n'ihi ọrụ ndị ntaakụkọ ka ndị uweojii ji tinye ọnụ n'okwu ahụ ma malite ime nnyocha so ya.
Cheta na ọ bụ na BBC Igbo ka nne Osinachi na ụmụnne ya kọrọ akụkọ ihe ọ gabigara n'aka di ya tupu ọ nwụọ.
2) Ọ na-ewulite ọchịchị ọjọọ
"Obodo ọbụla ebe ndị ntaakụkọ enweghị ike ịrụ ọrụ ha nke ọma, ajọ ọchịchị na-arị elu n'obodo ahụ."
Nke a bụ nkọwa Nurudeen Yekeen nyere na mkparịtaụka ya na BBC Igbo.
"Gịnị ka i che mere ndị ọchịchị ji agbasi mbọ ike ịkpachi ikike dịịrị ndị ntaakụkọ?"
"Ọ bụ ka a ghara inwe ndị na-enyocha mpụ na nrụrụaka ha na-eme kwa mgbe."
3) Ị gaghị ama akụkọ nke bụ eziokwu na nke bụ ụgha

Ọbịbịa soshal midia mere ka mgbasaozi na-efesa ngwa ngwa, mana o mekwara ka akụkọ ụgha sikwa etu ahụ na-agbasa.
Mana ndị ntaakụkọ na-enye aka ime ka ndị mmadụ mara akụkọ ụgha, ma zeere ha.
Nke a bụ maka na ụlọntaakụkọ nwere aha a ma ama ga-eme nchọpụta ha nke ọma tupu ha ebipụta akụkọ ọbụla.
Ọ bụrụ na mkpagbu ndị ntaakụkọ na-arịwanye elu, ọ pụtara na akụkọ ụgha ga na-efesa na-enweghị mgbochi ọbụla.












