Prophet Joshua Iginla: E kwesịrị ịgbaghara Nnamdi Kanu maka ịdị n'otu Naịjirịa - Prophet Joshua Iginla

Onye ụkọchukwu a ma ama bụ Prophet Joshua Iginla esonyela na ndị nwere agba na-akpọ oku ka e nye ndị Ọwụwa Anyanwu ohere ịhọpụta onyeisiala Naijiria na ntuliaka 2023.

Iginla, onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'ụlọụka ya na nso nso a nke ihe onyonyo ya na-efegharị na soshal midia nke ọ sị na ọ bụ mmeremere n'ihu, gwọpịtị n'azu ị na-ekwu maka idinotu Naijiria.

Iginla bụ nnukwu ụkọchukwu nwe ụlọụka "Champions Royal Assembly' dị n'Abụja,sịrị na ọ bụrụ na e nwere ịdịnotu n'ezie, na Gọọmenti Onyeisiala Muhammadu Buharị gaara atọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Gọọmenti Naijiria jichiri Kanu kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 ma na-ekpe ya ikpe n'ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.

Iginla kwuru sị, "Anụrụ m na nso nso a na onyeisiala Buhari gbaghaara ụfọdụ ndị mmadụ, gịnị mere na iji weta ịdịnọtụ na a tọhapụghị Nnamdi Kanu?"

Ọ gara n'ihu kwuo na na ọ bụ mmegbu dị na Naịjirịa ugbua butere iti mkpu nnwereonwe.

N'okwu Ọkwa onyeisiala n'afọ 2023

Iginla kwuru na ọkwa Onyeisiala kwesịrị ị gara ndị Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụrụ n'ezie na a na-ekwu okwu ịdịnotu Naijiria.

"Anyị na-ekwu maka ịdịnotu ala anyị, anyị a sị na-agaghị akpa ya akpa." mana, o rue n'okwu ịka ọkwa ọchịchị, a na-akpaso ndị Igbo oke n'inwete ọkwa Onyeisiala.

"Maka gịnị? Ị banyere na nkwekọrịta alụmdinanwunye, otu mpaghara na-ata ahụhụ."

" Ị kweghi ka ha bụrụ Onyeisiala, ị na-atamụ na ha na-eti mkpu nnwereonwe."

" Maka gịnị ka ha agaghị eji eti mkpu nnwereonwe?"

" A kpagbuola Ọwụwa Anyanwụ karịa."

"Ị gaghị na-ekwu 'one Naijiria' mana o ruo n'ịzọ ọkwa Onyeisiala, ịsị na onye Igbo agaghị azọ ya."

"Na-agbanyeghi nke a, ị chọọ ka ha nọgide na alụmdinanwunye a.

"Nke a bụ ihe butere iti mkpu nnwereonwe."

"Ọ bụrụ na e gboghi nsogbu a, a ga-enwe ọtụtụ Nnamdị Kanụ na-eti mkpu nnwereonwe."

Iginla gara n'ihu kwuo na "ị gaghị na-agbasa oziọma ịhụnanya na ịdịnotu ma na-eme ọzọ. Nke a bụ nsogbu kachasị Naijiria nwere."

Ọ jụrụ sị, " Kedụ ihe mere na ndị Yoruba na ndị Ugwu nọ n'ọchịchị kemgbe, o ruo oge ndị Igbo ị sị na i nweghi ntụkwasị obi n'ebe ha nọ."

Ọ bụrụ na i nweghi ntụkwasaobi n'ebe ha nọ, gịnị mere i ji jide ha?"

"Ndị bụ ihe na-apụta ịzọ ọkwa mana ihe ndị mmadụ na-ahụ bụ mmadụ ego nke mere na ha agaghị ahọpụta ndị ezi ndụ"

"Ma ị bu onye nnochiteanya (delegate) ma ị bụ onye na-atụ vootu, gịnị mere ị ga-eji ere vootu gị, resi ya onye ga-eme gị ohu n'afọ anọ na-abịa?"

"Nsogbu Naijiria abụghị na anyị amaghị nke bụ Eziokwu."

" Anyị ma eziokwu mana ọ na-amasị anyị ịga n'ọchịchị."

Dịka oge ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na-abịa nso, ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ekwusi ike na ọ bụ ka o ruuru ịchị Naịjirịa.

Ọtụtụ ndị mmadụ si mpaghara ọzọ, nke gụnyere Iginla tinyekwara ọnụ ma sị ka e nye Ọwụwa Anyanwụ ohere ka ha chịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: