Presidency 2023: Afọ 2023 ga-egosi ma Igbo ọ ga-apụ na Naịjirịa - Chukwuemeka Ezeife

Onye bụbụ Gọvanọ Anambra steeti bụ Ọkwadike, Chukwuemeka Ezeife kwuru na ntuliaka onyeisiala 2013 ga-ekwu ka Igbo a ka ga-anọ na Naịjirịa.

Na mkparịtụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Monde Ọkwadike ndị Igbo sị na ndị okenye Igbo ga-akwụnyere Ipob ma ha mechecha ihe niile ha kwesiri ime ghara ịnwete ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023.

Ọ sị na "Ọ bụrụ na anyị mechaa ihe niile anyị kwesiri ị me, jikọ onwe anyị ọnụ ga-zọọ ọkwa onyeisiala, ha sị na ha agaghị enye anyị maka na anyị bụ Igbo, mara na anyị agaghịziị abụ Naịjirịa".

O kwukwara na ndị Okenye ndị Igbo na-ekwu na Igbo ga-erite uru na-azụmahịa maka na Naịjiria dị ọtụtụ na ọ bụ ya bụ ihe ji ha ikpebi ịpụ na Naịjriịa.

Ọ sị na agbanyeghị na nke bụ uche obi ya, mana ọtụtụ mmadụ na-ekwu ya.

Goddy Uwazuruike bụbu onyeisi otu a kpọrọ 'Aka Ikenga' mgbe kwenyekwara n'ihe Ọkwadike kwuru.

Uwazuruike sị na "2023 Igbo ga-akwụsi ike. Ihe ọ masịrị ha mee. Anyi ga-enweteriri ọchịchị a, ọ bụrụ na anyị enweteghị ya, anyị emee ihe Ọkwadike kwuru".

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri a ga-amasị gị