You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kenya building collapse: Ụlọakwụkwọ adagbuola ụmụakwụkwọ ma gbuo ụmụakwụkwọ 7
Ụlọakwụkwọ nke di na Kenya adakwasịla ihe karịrị ụmụakwụkwọ iri na abụọ ebe ụmụaka asaa n'ime ha anwụọla.
Onyeisi ndi uweojii bụ George Seda kwuru na ụlọakwụkwọ akpọrọ Precious Talent Top School bụ nke eji gbamgbam na osisi rụọ dakwasịri ụmụakwụkwọ a.
Onye na-elekọta ya bụ uloakwụkwo bụ Moses Wainaina kwuru na ọ bụ olulu egwuru n'akuku ya bụ ụlọakwụkwo mere ka ọ daa.
O kwukwara na ọnu ọgụgụ ụmụakwụkwọ na-amu akwụkwọ ebe ahu ruru nari asatọ (800) kama ka ọ dị ugbua nanị mmadụ iri abụọ ka ha ma ebe ha nọ.
Ọ kọwara na nke a bu maka na otutu ụmụakwụkwọ gbara ọsọ gbaga na mpaghara Dagoretti mgbe ụlọakwụkwọ a daara.
Ụlọrụ gbata gbata Red Cross Kenya kwuputere nke a n'akara twitter ha ma na-ekwu na akpọgala ụmụakwụkwọ anọ ụlọọgwụ gọọmenti Kenya.
Ọnye nnọchite anya gọọmenti bụ Cyrus Oguna bịara ebe ihe a mere kwuru na ebugala ụmụakwụkwọ ruru iri ise na asaa (57) kamgbe ụlọ ahụ dachara.
Ụlọọrụ mgbasaozi NTV dị na Kenya wepụtara onyonyo gosiri ebe onye ozi gọọmenti ahụ bụ Cyrus Oguna na-agwa ndị natakaụkọ okwu ma na-ekwe ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nkwa na gọọmenti ga-
akwụ ego ụlọọgwụ ụmụ ha ọdachị a metụtara.
Anyị ka ga-ewetere ụnụ akụkọ a n'uju.