Isu-Aniocha 12: Ihe mere ndị uweojii ji achọ ụmụnwoke ndị a achọ

Ndí uweojii

Ebe foto si, Nigerian Police/Facebook

Ndị uweojii Naijirịa ekwuola na ha na-achọ mmadụ iri na abụọ bụ ndị obodo Isu-Aniocha dị n'Anambra Steeti maka ebubo igbu ọchụ na arụ ndị ọzọ.

Ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii Naijirịa na oha bụ Olumiyiwa Adejobi depụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha depụtara n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Eprel.

Arụ ndị eji achọ ndịa gụnyere iji egbe ezu ohi, otu oyiegwu, ịtọrọ mmadụ, otu nzuzo na mmadụ iji egbe iwu na-akwadoghi.

Ndị uweojii ewetabuola ikike n'ụloikpe iji nwuchie ndị a .

Ha niile bụ ụmụ nwoke dị afọ 25 ruo 55 bụ ndị obodo Isu-Aniocha nke Anambra Steeti.

Le aha ndị a -

  • Edward Okoye (aka Stone)
  • Donatus Okeke
  • Onyemazi Ngini
  • Onyebuchi Nwekeizu Okoye
  • Nonso Eboh
  • Chukwuka Onyibor
  • Chukwujekwu Anaekeokwu
  • Chuka Ilodigwe
  • Chinedu Nwoye Okoye
  • Nonso Awusionwu Obinna
  • Cosmos Okonkwo
  • Chukwujekwu Okoye

Boris Johnson adanyela n'aka komiti na-enyocha maka ebubo na ọ tụụrụ ụlọomeiwu mba ahụ asị

Boris Johnson

Ebe foto si, EPA

Komiti ụlọmeiwu mba Briten na-enyocha onyeisiala ha bụ Boris Johnson maka ebubo na ọ tụrụ asị banyere ịda iwu Covid-19 na mmemme e mere n'obi gọọmentị dị na 10 Downing Street oge mgbachi obodo e mere iji gbochie mfesa ọrịa ahụ n'afọ 2020.

Ndị omeiwu chọrọ ka komiti ahụ rịọ ọrụ ha ngwangwa ndị uweojii mechara nchọpụta ha mana gọọmenti gbaliri ka ha dọtịa okwu ahụ.

Mana oge ha hụrụ na ndị omeiwu pati ha akwadoghị nke ahụ, Johnson kwuru sị, Ọ bụrụ na okwu ahụ bụ ihe pati nọ na gọọmentị chọrọ ibu n'isi, ha gaa n'ihu.

Akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ ji igbeozi intanet zigara ndị ọrụ ebe o nyere ka ndị mmadụ ghụ na mmanya adịkọtaghị ọnụ nke gbapuru n'oha gosiri na obi gọọment mere mmemme n'ọha oge a machiri inwe mmemme ọbụla na mba ahụ iji gbochie mfesa Covid-19.

Nke mere ka ụfọdụ ndị omeiwu na-akpo oku ka onyeisiala Johnson tinye akwụkwọ arụkwaghịm.

Ọtụtụ ndị mmmadụ dara n'ọrịa , ebe ụfọdụ nwụrụ oge ọrịa Covid-19 chị ọkụ na Briten bụ oge e kwuru na mmemme ọha ndị a hụ mere n'obi gọọmenti Briten.