Ihe Bruce Fein, ọkaiwu Nnamdi Kanu gwara otu UN Security Council

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu emeela ọtụtụ mkpesa banyere ebubo etu ha sị e siri nwụchịe ya n'ụzọ ezịghị ezi

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Nkọwa foto, Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu emeela ọtụtụ mkpesa banyere ebubo etu ha sị e siri nwụchịe ya n'ụzọ ezịghị ezi

Ọkaiwu nnamdi Kanu, onye ndu otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụBruze Fein ezigarala ngalaba nke otu jịkọrọ mba dị ịcheịche bụ United Nations Security Council mkpesa.

N'akwụkwọ mgbese ahụ nke Fein bụ ọkaiwu nke mba ofesi na nwunye Kanu bụ Uche Kanu binyere aka, ha kpọrọ oku ka otu UN hibe nnyocha pụrụiche ga-etinye anya n'okwu ebubo etu gọọmentị Naịjirịa na nke Kenya siri kpaa nkata 'tọọrọ' ma kpụlata Kanu na mkpagbu ndị ọzọ megidere ikike ya dịka mmadụ.n'ụzọ agbasoghị iwu.

Nke a pụtara ihe n'akwụkwọ ozi nke Fein zigara Barbara Woodward bụ onye nnọchịteanya mba Briten n'ọgbakọ United Nations ma bụrụkwa onyeisi ngalaba United Nations Security Council.

Akwụkwọ mkepsa nke Aloy Ejimakor gosiri BBC Igbo boro ebubo na gọọmentị Kenya na nke Naịjirịa tọọrọ Kanu, mmekpa ya ahụ ma jigide ya n'ụzọ ezighị ezi nke megidere ikike ya dịka onye mba Briten.

Akwụkwọ a rịọrọ ka otu nnyocha a aga ehibe tinye anya n'ime okwu ndị a.

Akwụkwo mkpesa ahụrụ kwuru na:

"'Ọtụtụ ihe igba ama na-ezoghị ezo gosiri na aka Onyeisiala Muhammadu Buhari, ọkaiwu Ukwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta na ndị ọzo nọ n'okwu a"

Akwụkwọ kwuru na ndị ọkaiwu Kanu enweghị ntụkwasị obi na gọọmenti Naịjirịa na nke Kenya ga-eme nyocha ziri ezi n'okwu ebubo ndị nke mere ha jiri eme mkpesa ka ngalaba United Nations Security Council hibere otu nọpụrụ iche ga-eme nnyocha okwu a.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

Dịka ha si dee: "Anyị na-ezite ozi a nke gbadoro ụkwụ n'ụkpụrụ Security Council Resolution nke akara 1595 nke hibere otu nnyocha nọpụrụ iche nke labanyere anyị n'okwu nnyocha ogbugbu onye bụbu Praịm minista mba Lebanon bụ Rafik Harari nakwa ụkpụrụ Security Council Resolution 1757 nke hibere usoro ikpe nye ndị enyochapụtara n'okwu a. Anyị na-ekpesa ka nnyocha okwu nwụchị Nnamdi Kanu nke gọọmentị Naịjirịa na Kenya mere soro usoro a"

Ha gara n'ihu dee na ọ ga-amasị ha izute ndị ọrụ United Nations Security Council ọbụla n'ihe maọbụ n'ịntanetị.

Cheta na gọọmentị kwuru n'ọnwa Juun nke afọ 2021 na ha nwụchịrị Nnamdi Kanu, onye bụ onye ndu otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).

Mịnịsta ikpe ma bụrụkwa ọkaiwu gọọmentị etiti nke Naijiria bụ Abubakar Malami gbara ama n'ehihie Tuzde n'oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ma kwuo na a nwuchiri Kanu ụbọchị ụka (27/6/2021).

Nnamdi Kanu onye ndu otu na-alụ ọgụ nnwereonwe ndị Biafra akpọrọ Ipob n'ịchafụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu onye ndu otu na-alụ ọgụ nnwereonwe ndị Biafra akpọrọ Ipob n'ịchafụ

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi Okwu Kanu bụ onye hibere ma bụrụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba nwere onwe ha a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.

Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.

A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.

O kwenyere na ma bụrụ onye ofufe Judaism.

Aha onyonyo, 'Ndi uweojii ejighị Nnamdi Kanu na Singapore'