Enyela ndị nkiti 12 ikike imepee mahadum na Naịjirịa nke gụnyere Ned Nwoko meepere mahadum egwuregwu mbụ n'Afrịka

Mahadum mbụ na-ekuzi egwuregwu na Naịjịrịa

Ebe foto si, Ned Nwoko

Nkọwa foto, Mahadum mbụ na-ekuzi egwuregwu na Naịjịrịa

N'ọgbakọ ime ụlọ nke gọọmentị etiti e mere n'Abuja bụ Federal Executive Council (FEC), gọọmentị etiti nyere ndị nkiti 12 ikike imepe mahadum ga-arụ ọrụ ruo oge ntozu n'uju ruru.

Mahadum ndị a ga-arụ ọrụ n'akụkụ Naịjirịa dị ịcheịche nke gụnyere Kano, Niger, Gombe, Sokoto, Delta, Abia, Anambra steeti nakwa n'Abuja.

Aha onyonyo, Stephany Ogechukwu Onuzuruka nwa afọ itoolu na-emegharị ahụ

Otu onye n'ime ndị nkiti enyere ikike a bụ Ned Nwoko na-anọchịte anya Aniocha North-South na Oshimili North-South n'ụlọomeiwu Naịjịrịa.

Ikike enyere ya pụrụiche dịka nke a bụ maka imepe mahadum mbụ na-ekuzi egwuregwu na Naịjirịa nakwa n'Afrịka

Mahadum akpọrọ 'Sports University of Nigeria' dị n'obodo Idumuje Ugboko nke Delta steeti.

Bashir Ahmad bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari depụtara nke a n'ụbọchị Wenezde (3/7/2022)

Ebe foto si, Sreenshot

Nkọwa foto, Bashir Ahmad bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari depụtara nke a n'ụbọchị Wenezde (3/7/2022)
Aha onyonyo, O nweghi mgbe m ji rọọ nrọ ịbụ onye egwuregwu - Lauritta Onye

Uloikpe enyela iwu ka gọọment kenye ụmụnwaanyị oke 35 n 'ọkwa ọchịchị

Ụmụnwaanyị Naijri

Ebe foto si, AFP

Ụlọikpe Ukwu Naijiiria enyela gọọment Naijria iwu ka ha kenye ụmụnwaanyị oke 35 n'ime 100 n'ọkwa ọchịchị na Naijria.

Nke a na-abịa dịka ụmụnwaanyị meerela ngagharịiwe izu ole na ole maka nkụchapụ ụlọomeiwu kụchapụrụ akwụkwọ iwu ise maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị..

Aha onyonyo, Onye kwesiri isi nri n'ụlọ: Di ka ọ bụ nwunye?

Na mkpebi ya, Jọstis Donatus Okoronkwo kwuru na Naijria binyere aka n'iwu nyere ụmụnwaanyị oke n'ọchịchị na mba ụwa, na o kwesịrị ka gọọmentị tinye ya n'ọrụ.

A na-ele anya na Ụlọomeiwu Naijiria ga-anabata iwu atọ n'ime ise nke ụmụnwaanyị wetaburu n'ụlọiwu ọzọ n'izu a.