Gender-based Violence: 'Anyị na-eti ndị nwunye anyị ihe ka ha wee na-akwanyere anyị ugwu'

Aha onyonyo, 'Anyị na-eti ndị nwunye anyị ihe ka ha wee na-akwanyere anyị ugwu'

Mwakpo ụmụnwaanyị arịala elu na mba Kenya, ọkachasị oge mkpamkpa ọrịa ozuruụwa ọnụ covid-19 selitere isi.

Mana ọtụtụ ndị a wakporo na ndị a na-awakpo anaghị eme mkpesa n'aka ndị uweojii, n'ihi ụjọ nakwa enweghi ntụkwasị obi n'ihe ndị uweojii pụrụ ime.

Dịka ndị a kpọro "Health Assistance Kenya" si kwuo, mkpesa maka mwakpo ụmụnwaanyị ji pasentị 300 rịa elu karịa etu ọ na-adịbu, mgbe a amachiri ngagharị maka ọrịa covid-19 na mba ahụ.

'Ọ bụ omenala anyị iti nwaanyị ihe'

Ụfọdụ ndị obodo Soweto dị na mba Kenya, kwuru na iti nwunye ha ihe bụ ụzọ ha si enweta nkwanye ugwu n'aka ha.

Ọtụtụ n'ime ụmụnwoke ahụ kpọrọ onwe ha ndị Jacaranda Social Movement, kwuru na ha emeghi etu a, na ụmụnwaanyị nọ na ndụ ha ga na-akparị ha.

Ha sị na ọ bụ 'omenala', ọkachasị mgbe nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ.

N'ime akụkọ a, otu nwaanyị a kpọrọ Mary Mugambi, kọwara etu di ya gbarala ya alụkwaghịm si jiri mma gbukasịa ya ahụ ma gbukwaa otu nwa ha nwaanyị dị naanị afọ isii, mgbe ọ jụrụ ka ọ laghachịte na ndụ ya na ụmụ ha atọ.

Ịlụ ọgụ megide mwakpo ụmụnwaanyị

Otu nwaanyị a kpọrọ Njeri Migwi ewepụtala onwe ya n'ịlụ ọgụ megide mwakpo ụmụnwaanyị na mba ahụ.

Migwi na onwe ya bụ onye gabigakwara mwakpo ọtụtụ afọ, hibere otu a kpọrọ Usikimye, bụ ebe ụmụnwaanyị na-agabiga mwakpo n'aka ụmụnwoke nwere ike ịgbata maka enyemaka.

Migwi kọwara etu o si nyere ihe ruru ụmụnwaanyị 450 aka kemgbe mkpamkpa covid-19 malitere n'afọ 2020.

Ihe ndị uweojii kwuru

Judith Lameth bụ onyeisi ndị uweojii na-ahụ maka 'community policing, gender and child protection' na mba ahụ gwara BBC sị na oge agbanweela oge ndị uweojii ga-ana aka azụ ma ghara ịrụ ọrụ ma e meere ha mkpesa.

Lameth kpọrọ oku sị ka ndị nwere nsogbu mwakpo kpọkuo ndị uweojii, na ha ga-eleba ya anya.

Gee etu ihe si kwụrụ n'uju n'ihe onyonyo a: