Ọgba Mbọ: Agaghị m Mahadum mana eji m Tekịnụzụ akpata ihe m na-eri ugbua - Uncle IB
N'ụwa taa, ụfọdụ na-ele ndị na-agurughị akwụkwọ n'ogogo mahadum anya dịka ndị na-etozughị oke.
Ọzọkwa bụ na tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ abụghị ihe mmadụ na-anọkata mụta, ma ọ bụrụ na e nyeghị gị ọzụzụ pụrụiche.
Mana nwokorọbịa a bụ Ifeanyi Okafor, onye e ji Uncle IB mara na soshal midia, bụ ọpụrụiche.
Uncle IB gụdebere akwụkwọ na Sekọndịrị nke anọ, mana enweghị ihe gbasara tekịnụzụ na soshal midia na-agba ya gharịị.

Taa, ọ bụ Uncle IB na-elekọta akara soshal midia ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa, ma si n'ụzọ dị otu a na-enyeju onwe ya na ezinụlọ ya afọ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Uncle IB kwuru na ọ malitere ịpị ekwentị oge o pere mpe.
O kwuru sị: "Onweghị onye na-akụziri m ya, ọ bụ ka m na-apị ya ka m na-amụta."
"Ọ bụ Agwụ m na-akụziri m ya, maka na ana m anụ olu na-agwa m ihe m ga-eme na etu m ga-esi mee ya."
Uncle IB na-ejikwa akara soshal midia ya na-akụziri ndị mmadụ etu ha ga-esi chekwaa onwe ha ka ndị ekperima juru n'ịnteneetị ghara izu ha ohi.
Ọ na-ejikwa asụsụ Igbo akụzi ihe ndị a niile ka ọ na-ekwe ndị mmadụ nghọta nke ọma.
Ọtụtụ nkuzi ọ na-enye gbasara Tekịnụzụ bụ n'efu, mana ndị ọzọ ka a na-akwụ ya ụgwọ iji kuzie.
"Ọ bụghị mmadụ niile nwere nnukwu ego iji mụta ihe ndị a," Okafor kwuru.

"Ebe ọ bụ na Agwụ m kuziiri m ya n'efu, ana m akụzikwara ya ụfọdụ ndị n'efu."
Mana o nwere olileanya ịga mba ofesi otu ụbọchị wee mụọ ihe gbasara Tekịnụzụ nke ọma.
Uncle IB dọrọ ndị ntoroọbịa aka na ntị ka ha sepụ aka n'izu ohi ịntaneetị ụdị a na-ewu ebe niile ugbua a na-akpọ 'yahoo yahoo'.
N'okwu ya, onye kwụba aka ya ọtọ, na-agbasi mbọ ike, otu ụbọchị ọganihu ga-ezute ya.
Kirie ihe o kwuru n'uju ebe a;
Ọ bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi mere akụkọ a




