Will Smith apụọla n'otu 'Oscars' n'ihi aka ntị ọ ji mawapụ Chris Rock agba

Aha onyonyo, Best actor winner Will Smith took offence at a joke by presenter Chris Rock

Will Smith, onye a ma n'Amerịka n'ihi ejije Hollywood nakwa ịkpa ọchị, ewepụla onwe ya n'otu 'Oscars' dịka ọ machara Chris Rock aka ntị n'emume e mere n'ụbọchị Sọnde gara aga, Maachị 27, 2022.

N'akwụkwọ ozi o wepụtara, Smith kwuru na "omume m mere tụrụ m n'anya, ọ dị njọ, onweghị etu m ga-esi gọlahụ ya."

Otu 'Academy' ndị na-ahazi emume 'Oscars' kwuru na ha anabatala arụkwaghị m Smith gbara, mana ha ga-aga n'ihu inye ya ntaramahụhụ maka ihe o mere.

Smith mara Rock ụra n'ihi njakịrị Rock mara nwunye ya bụ Jada Pinkett maka na ọ kpụrụ isi ya.

Ihe kpatara Pinkett ji kpụọ isi ya bụ maka ọrịa o nwere a na-akpọ 'alopecia', nke na-eme ka ntutu isi mmadụ na-adapụsị.

Mana njakịrị ahụ Rock mara Pinkett wutere Smith nke mere ka o were aka ntị mawapụ Rock agba.

Will Smith

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'otu ụbọchị ahụ ọ mara Chris Rock ụra, Will Smith ritere nturuugo 'Oscar' maka agwa ọ kpara n'ejije 'King Richard'

"Ndị m mejọrọ buru ibu," Smith dere n'akwụkwọ o ji rịọ mgbaghara.

"Emejọrọ m Chris na ndị ezinụlọ ya, ọtụtụ ndị enyi m na ndị m hụrụ n'anya, ndị niile bịara mmemme ahụ nakwa ọtụtụ ndị nọ n'ụlọ na-ekiri ya."

"Agharịpụrụ m 'Academy'. Anapụrụ m ndị niile e nyere nturuugo 'Oscar' ohere iji nwee ṅụrịa maka ọrụ ọma niile ha rụrụ. Obi agbawaala m."

"Olileanya m ugbu a bụ ime ka anya ndị mmadụ gbadokwa n'ebe ndị kwesịrị ka ụwa hụ ha maka ihe ọma niile ha mere."

"Mgbanwe na-ewe oge, mana adịla m njikere ịrụsị ọrụ ike iji hụ na agaghị m ekwezị ka ịkpa aghara napụ m ezi uche.

Ihe mere Will Smith jiri sị ka o were ụra mawapụ Chris Rock ntị

Chris Rock na Will Smith

Ebe foto si, Getty Images

Will Smith na-eme ihe ejije n'Amerịka mara Chris Rock na-akpa ọchị aka ntị n'emume Oscar mgbe Rock mara nwunye ya bụ Jada Pinkett njakịrị.

Rock sị na isi Pinkett kpụrụ dịka isi e ji eme ihe nkiri a kpọrọ 'GI Jane 2' maka na ọ kpụrụ isi nkwọcha n'ihi ọrịa a kpọrọ alopecia.

Smith gbagooro n'elu ọgbọ ebe Rock nọ ma maa ya aka ntị tupu ọ laghachị n'oche ya.

Smith dọkwara Rock aka na ntị sị " Ka m anụla aha nwunye n'ọnụ gị ọzọ."

Mana o Will Smith mechara rịọ mgbaghara maka agwa ahụ ọ kpara.

"Ana m arịọ otu Oscar na ndị ibem a họpụtara arịrịọ ka ha gbaghara m."

Smith ritere nturuugo mbụ ya n'emume Oscar n'ihe ejije a kpọrọ 'King Richard'.

Kedụ ndị bụ Will Smith na Chris Rock?

Will Smith

  • Ọ bu nwafọ mba Amerịka na-eti egwu, ede egwu nakwa eme ihe ejije.
  • A mụrụ ya na 25 Sepụtemba, afọ 1968 n'obodo Philadelphia nke Pennsylvania dị na mba Amerịka
  • Ọ lụrụ nwunye mbụ ya bụ Sheree Zampino n'afọ 1992 ha gbasaa n'afọ 1995, lụọ nke abụọ bụ Jada Pinkett n'afọ 1997.
  • Ọ mụrụ ụmụ atọ gụnyere; Willard Carroll, Jaden Smith na Willow Smith.
  • Ụfọdụ ejije ndị o mere gụnyere; Men in Black, Enemy of the State, Bad Boys dgz.

Chris Rock

  • Ọ bụ nwafọ Amerịka na-eme ihe ịkpaọchị, odeakwụkwọ na-emekwa ihe ejije.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 7 ọnwa Febụwarị afọ 1965 n'obodo South Carolina nke mba Amerịka.
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Malaak Compton Rock n'afọ 1996 ha gbasaa n'afọ 2016.
  • Ọ mụrụ ụmụ abụọ gụnyere; Lola Simone na Zahra Savannah Rock.
  • Ụfọdụ ejije ndị o mere gụnyere; I'm gonna Git You Sucka, Miami Vice, Beverly Hills Cop.

Etu ndị ojiegbe si wakpoo ogige ndị uweojii n'Obowo, Imo Steeti

Ụlọorụ ndị uweojii n'Ojoto
Nkọwa foto, Foto a abụghị ya ka akụkọ a na-ekwu maka ya

Ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo Obowo n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2022.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam kwuru na ọ bụ ndị otu Indigenous People of Biafra nakwa ndị ọgụ ha bụ Eastern Security Network mere mwakpo ahụ.

Abattam kwuru na ndị ekperima ahụ tụrụ ogbunigwe nke metụtara akụkụ ụfọdụ nke ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma gbakwaa otu ụgbọala ọkụ.

"Mana ndị uweojii kwara ha mgbọ iji gbochie ha ịbata n'ogige ha kpọmkwem, nke a mere ndị ekperima ahụ ji gbaa ọsọ gbabaa ọhịa," Abattam kwuru.

"Naanị otu onye uweojii ka mgbọ tụrụ na mwakpo a, mana eburula ya gaa ụlọọgwụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii chọtara otu egbe 'pump action' nakwa ogbunigwe atọ na-agbabeghị agba oge ha na-achụ ndị ekperima ahụ ọsọ.

Abattam rịọrọ ndị mmadụ ka ha nyere ndị uweojii aka ịnwụchi ndị omekome na-akpa ike a, site n'iwetara ha ozi n'oge maka ya.

Etu ihe mberede okporoụzọ si dulaa mmadụ isii ala mmụọ

Ihe mberede mere n'Epe

Ebe foto si, Road Safety Lagos

Ọkụ agbagbuola mmadụ isii n'okporoụzụ Lekki-Epe dị na Legọs mgbe tanka bu mmanụ ụgbọala na ụgbọala ukwu ọzọ sọkatara isi na mgbede ụbọchị ụka 27 Maachị, 2022.

Olusegun Ogungbemide bụ onyeisi ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ bụ 'Road Safety' na Legọs sị na ọ bụ akpachapụghị anya ndị ọkwọ ụgbọala butere ya.

Aha onyonyo, Onitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?

Ọ sị na ihe mberede mere n'ihu ụlọọrụ a kpọrọ Eleganza n'ihe dịka elekere isii nke mgbede.

Ndị a nwụrụ bụ ụmụnwoke isii gụnyere onye ọkwọ ọgbatumtum bụ onye ọkụ ahụ dọọrọ ma gbagbuo.

Ihe mberede mere n'Epe

Ebe foto si, Road Safety Lagos

E bugala ozu ndị a n'ụlọ ebe a na-echekwa ozo mmadụ.

Ogungbemide rịọrọ ndị ọkwọ ụgbọala ka ha kpachapụ anya dịka ha na-agba n'okporoụzọ ma jiri nwayọọ.

Ihe mberede mere n'Epe

Ebe foto si, Road Safety Lagos

Cheta na ọkụ ọgbụgba sitere n'ihe mberede okporoụzọ ataala ọtụtụ ihe mmadụ na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa na nso nso a.

Ihe mberede n'Epe

Ebe foto si, Road Safety Lagos