Elo and Diane: Ụka gbasara nwoke na nwaanyị wuru ewu kemgbe Coronavirus bidoro

Elozonam na Diana

Ebe foto si, @elozonam/Instagram

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ije nwoke na nwaanyị bụ nke nwereike ịbute ọṅụ, obi mgbawa maọbụ anya mmiri.

N'ime izuụka abụọ, ihe na-ewu ewu n'elu soshal midia dị icheiche bụ ihe gbasara ọyị nwoke na nwaanyị.

Anyị ga-ewetara unu ndị kacha tụ ndị mmadụ n'anya ma wuo ewu ọfụma na soshal midia.

Lee ha ebe a

1. Nwoke bunyere nwunye ya coronavirus nke gburu nwa ha

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Akụkọ nke a pụtara n'ụbọchị Monde gbasara ihe a ga-eme nwoke bunyere nwunye ya coronavirus n'ihi ịgagharị mmemme.

Ọrịa ahụ rịasiri nwaanyị ike nke mere na ime ya pụrụ ebe ọ na-ekwu na o nweghizi ike ịgbaghara di ya.

2. Nwaanyị boro enyi ya nwoke ebubo mwakpo n'ike mgbe ha gbakere

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akụko a metụtara otu dọkịta a ma ama na soshal midia bụ Funmilayo Ogunsanya na enyi ya nwaanyị bịara ịleta ya ebe o bi na mba UK.

Ha mechara gbasa tupu enyi ya nwaanyị bụ Bola Aseyan e bo ya ebubo mwakpo nke dọkịta ahụ gọọrọ isi onwe ya na ya.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Dịka ọ dị ugbua, ha abụọ ekwuola na ha na-anata ndụmọdụ ndị ọkaịwu maka okwu a na-akpọtụ n'etiti ha.

3) Egwu eke dị n'etiti Elozonam na Diana nke "Big Brother"

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Elozonam na Diane bụ ndị so n'egwuregwu "Big Brother" emere n'afọ 2019 ma malite ịyị ọyị n'ime ebe ahụ.

Mgbe ha pụtara n'ihe onyonyo ebe Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-achịkọta emume ahụ jụrụ ha ajụjụ maka ọyị ha, Elo kwuputara na Diane gbahapụrụ ya soro nwoke ọzọ.

Ihe mere n'etiti ha na-ewu n'elu soshal midia dịka ụmụ nwoke malitere ịkọ akụkọ ihe mgbawa obi ụmụnwaanyị mere ha site na "Fear Women"

Victor Israel kọwara etu enyi ya nwoke si chegharịa site na mgbawa obi ọ gabigara.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

4. Alụmdinanwunye Will Smith na Jada Pinkett-Smith

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Ndị mmadụ kpụ okwu a n'ọnụ na soshal Midia dịka otiegwu mba Amerịka bụ August Alsina kwupụtara na ya na Jada Pinkett, nwunye Will Smith yịrị ọyị.

Alsina nọrọ na mkparịtaụka ya na 'Daily Mail' nwere kwukwa na Will Smith ma maka ya ma kwadokwa ha.

Mana Jada Pinkett apụtala ịgọ ihe niile Alsina kwuru.

Pinkett sị na o nweghi mgbe ya na Alsina ji nwe mmekọ nakwa o nweghi mgbe di ya jiri nye onyinye ka o dinaa nwoke ọzọ.

5. Chris Ndukwe gburu nne ụmụ ya ma gbuo onwe ya

Olamide bụ nwaanyị egburu

Ebe foto si, Olamide Omajuwa Alli/Facebook

Ọ bụ n'izuụka abụọ gara aga ka akụkọ wuru gbasara nwoke sụgburu nwunye ya ma gbuo onwe ya.

Nwoke ahụ aha ya bụ Chris Ndukwe gburu Olamide, nne ụmụ ya tupu ọ ṅụọ ọgwụ oke na be ha na Lekki, Legọs steeti.

Ezinaụlọ Olamide Alli kwuru na ha na-eme nyocha nke ha gbasara ọnwụ nwa ha nwaanyị nke wutere ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, 'Ndị mmadụ anaghị enyere m aka ka m mụta Igbo'