Ozumba Mbadiwe: Kedụ onye ọ bụ mere Reekado Banks ji jiri ya gụọ egwu?

Ebe foto si, Getty Images
Nso nso a otiegwu a ma dịka Reekado Banks ji aha ya gụọ egwu wuru ewu na Naịjiria ma gafekwaa mba ọzọ, mana onye bụ Ozumba Mbadiwe?
Ọ bụrụ na ọ dị ndụ Mbadiwe gaara adị afọ 107 taata bụ ụbọchị 15 nke ọnwa Maachị 2022.
Mana ndị ọgbara ọhụrụ matara maka ya ebe ndị ma mgbe ọ dị ndụ chetara ya ọzọ n'ọnwa Ọktoba afọ 2020, mgbe e mere ngagharịiwe ụbọchị iri maka mkpochapụ ndị uweojii pụrụ iche (end SARS), n'okporoụzọ a gụrụ aha ya dị na Victoria Island, Legọs.
Ụzọ ahụ abụrụla ebe e ji hụwa ama maka ihe gbasara okwu end SARS, nke so mee ka Reekado Banks jiri gụọ ya bụ egwu ọ kpọrọ "Ozumba Mbadiwe".
Mbadiwe so na ndị Igbo aha ha dara ụda oge ọ dị ndụ, nke a mere e ji gụọ ụfọdụ ihe gụnyere ụzọ nakwa mahadum aha ya.
A bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị o doro ya anya, ya mere o ji site na mahadum mere ihe gbasara ọchịchị ruo mgbe o tozuru bụrụ minista.
Lee ihe ndị ị maghị maka ya:
- A mụrụ Kingsley Ozumba Mbadiwe n'ụbọchị 15 nke ọnwa Maachị afọ 1915
- Ọ bụ onye Arondizuogu dị n'Imo steeti
- Ọ gara ụlọakwụkwọ praịmarị na St Mary's Catholic School dị na Rivas steeti
- Ọ gụrụ ụlọakwụkwụ sekọndịrị na Hope Waddell Training Institute dị na Kalaba, Aggrey Memorial kọleji dị n'Arọchukwu, Igbobi kọleji nakwa Baptist Academy dị na Legọs steeti
- Ọ zụtụrụ ahịa tupu o mechaa gawa mahadum na mba Amerịka (ọ gụrụ na Columbia University na New York University)
- Oge ọ nọ na Columbia University ka o zutere Mbonu Ojike ma bụrụ enyi ya

Ebe foto si, Getty Images
- O hibere otu maka ụmụakwụkwọ si mpaghara Afrịka a kpọrọ "academy of African Arts and Research" mgbe ọ nọ na mahadum na mba Amerịka, nke mere ka o zute Eleanor Roosevelt bụ nwunye onyeisiala Amerịka mgbe ahụ
- Ọ banyere ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'okpuru pati National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC), nke o mechara nwaa isi na ya chụpụ Dkt. Nnamdi Azikiwe dịka onyeisi
- N'afọ 1951 ka ọ zọtara oche n'ụlọomeiwu nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka minista na-ahụ maka Ala na Ọnatarachi, rụọ dịka minista na-ahụ maka Azụmahịa, ma mechaa rụọ dịka minista na-ahụ maka Azụmahịa na Mgbasaozi.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ pụrụiche - n'ihe ndị metụtara Afrịka - nye Tafawa Balewa bụ naanị otu Praịm Minista Naịjiria nwere ka Naịjiria natara nnwereonwe n'aka Briten.
- O hibere ụlọntaakụkọ a kpọrọ The Daily Telegraph, dịka ụzọ o si ekwupute iwe
- Ọ lụrụ Cecilia nwunye ya, mụọ ụmụ isii
- A rụrụ mahadum n'aha ya n'Ideato dị n'Imo steeti, mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria
- A gụrụ okporoụzọ dị na mpaghara Victoria Island nke Legọs aha ya
- Ụmụ ya rụgharịrị ụlọ mbụ o nwere nke dị na Yaba, Legọs , ma mee ya ụlọndina nke a kpọrọ Kings Celia Hotel
- Ọ nwụrụ n'afọ 1990





