Gọọmentị Abia steeti etiela iwu machiri gwongworo ịgba n'okporoụzọ mgbe chi ka dị

Ebe foto si, Okezie Ikpezu
Gọọmentị Abia steeti amachiela ụgbọala gwongworo igba n'okporoụzọ ọbụla na steeti ahụ maọbụladị n'oge e nyere ha ohere ịgba.
Kọmishọna njem na steeti ahụ bụ Godswill Nwanoruo ekwuola na ụgbọala gwongworo agaghị na-agba site n'elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere itoolu nke abalị, iji beleta ihe mberede okporoụzọ.
Gọọmentị steeti ahụ ekwuola na gwongworo ọbụla a hụrụ na-agba na mpaghara Aba, Umuahia nakwa Ohafia na steeti ahụ ga-ata ezigbo ahụhụ dịrị ha maka ida iwu a ehibere.
Echiche ndị mmadụ bụ na iwu ọhụrụ a dapụtara maka ihe merede okporoụzọ mere n'Ogbor Hill Aba, Abia Steeti n'ụbọchị Tọzde nke kwapịasiri akụnaụba ndị mmadụ ma kpalite ọnwụ ụfọdụ ndị mmadụ.
Cheta na ihe mberede okporoụzọ a gụnyere ụgbọala gwongworo na ụgbọala obere ndị ọzọ.
Dịka Maazị Nwanoruo si kwuo gọvanọ Okezie Ikpezu bụ gọvanọ steeti ahụ hibere otu ga-elekọta nrubeisi iwu a ma kwuo na a ga-amalite mmanye ya bụ iwu bido n'ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị, 2022.
O kwukwara na e mere nke a i ji belata kpachị kpachị ụzọ nke ọtụtụ ụgbọala gwongworo so akpalịte.
Ọ rutụlwara aka n'obi mgbawa so agwa ọjọọ ndị gwongworo na-akpa akụkụ ụzọ "Aba tollgate" ebe ha ji aka malite ibu ngwongwo agbanyeghi na gọọmentị enyeghi ha ikike ime nke a ebe ahụ.
Gọọmenti kwuru na otu ga-amalite mmanye iwu a ga-agụnye ngalaba nlekọta njem okporoụzọ bụ National Union of Road Transport Workers (NURTW) na ministri na-ahụ maka njem nakwa otu njem bụ Road Transport Employers Association of Nigeria (RTEAN).
Gịnị mere n'Ogbor Hill Aba nke Abia steeti?
Otu nwoke bi n'Aba a kpọrọ Obialor Ejimofor akọwaala etu o siri gbanahụ ọnwụ site n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Ogbor Hill Aba, Abia Steeti n'ụbọchị Tọzde.
Ọ sị na nke a mere mgbe ụgbọala ukwu 'trailer' sọbara isi n'ime ahịa a na-egbu ma na-ere anụ a kpọrọ 'Ahia udele' dị na Waterside.
Ọ sị na ha nọ n'ime ọgbatumtum Keke mgbe ụgbọala ahụ si n'ugwu na-agbatu, mana ọ dịka ihe o ji akwụsị dara nke bụ 'break failure'.
"Ụgbọala ji ọsọ na-abịa ebe keke anyị nọ mana anyị hapụrụ gbaa ọsọ ma na-elezi ka ebe ụgbọala ahụ kụụrụ ụgbọala ọzọ ma sọba isi n'ime ahịa.

"Ọ malitere imebi ọtụtụ ụlọahịa dịka ọ na-agbada n'ahịa dị n'ime ndagwuru ugwu."
Ejimofor sị na o mechara nụta akụkọ na ọtụtụ ihe mebiri nakwa na o nwe ndị nwụrụ anwụ.
N'ahịa udele ebe ihe a mere bụ ahịa ọtụtụ ndị chọrọ ịzụta anụ na-ekwo ekwo.

N'ihi nke a gọvanọ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka e mechie ahịa ahụ ma buga ya n'ebe a kpọrọ Omuma Uzor dị n'Ukwa West.
Osote ya bụ Ude Oko Chukwu gara ebe ahụ sị na e mechiri ahịa a maka ọnọdụ ọjọọ ebe ahụ dị nke na-emetụ ahụike ndị mmadụ.

Gọvanọ kelere ndị na-ere ahịa ebe ahụ maka ibuga ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede ahụ n'ụlọọgwụ.
A mabeghi kpọmkwem mmadụ ole merụrụ ahụ maọbụ nwụrụ n'ihe okporoụzọ ahụ.
Nke a abụghị mbụ ụdị ihe mberede okporoụzọ a ga-eme n'ebe a na-akpọr Ugwu Ogbor-Hill.
Ihe mbere okporoụzọ na-emekarrị ebe ahụ opekarịa mpe otu ugboro kwa afọ ọbụla, nke na-enute ọnwụ ọtụtụ mmadụ.










