Inner Galaxy: Gọvanọ Ikpeazu ehibela kọmịtị mmadụ itoolu ga-elebaanya n'ụlọọrụ a

Okezie Ikpeazu

Gọvanọ Abia steeti bụ Gọvanọ, Dkt Okezie Ikpeazu ehiwela kọmịtị mmadụ itolu ka ha nyocha ebubo ajọ ọnọdụ ọru eboro ụlọọrụ Inner Galaxy Steel Company dị n'Obuzor Ukwu, Ukwa West.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ahụ tiri mkpụ maka mmegbu na ọnọdụ ọjọọ ndị ọzọ dị n'ụlọọru ahụ.

Nke a sị n'ozi kọmịshọna mgbasa ozi gọọmenti Abia steeti bụ Maazị John Okeiyi Kalu derela ndị ntaakụkọ na Tọọzde 13 Ọgọst, 2020.

Kalu sị na e nyere ndị kọmịtị a izuụka abụọ iji nye Gọvanọ Ikpeazụ mpụtara nchọpụta ha.

Ụlọọrụ na-eme steel

Ebe foto si, ABSG

Nkọwa foto, Ndị gọọmentị Abịa steeti zigara ka ha gaa nchọpụta na Inner Galaxy Group

Ndị nọ na komiti a bụ:

Ụlọọrụ na-eme steel

Ebe foto si, ABSG

Nkọwa foto, Ndị gọọmentị Abịa steeti zigara ka ha gaa nchọpụta na Inner Galaxy Group

1. Chief Uwaoma Olewengwa - (Onyeisi oche)2. Barr Sam Hart (Odee akwụkwọ)3. Hon Godwin Adiele4. Chinenye Nwaogu5. Onyeisiala okpuruọchịchị Ukwa West6. Emmanuel Alozie 7. Chief Stanley Eche8. Comrade Nelson Nnanna Nwafor9. Venerable F E Iwela A ga-anabata ndị otu kọmịtị a n'elekere iri na otu ụtụtụ n'ụbọchị Fraịde Ọgọst 14, 2020.

Osote Gọvanọ Abia steeti bụ Ude Oko Chukwu ga-anabata ha.

Nlebaanya a si n'akụkọ kpọrọ ndị mmadụ n'ihu na Twitter bụ arịrị ụmụ Naijiria na-arụ n'otu ụlọọrụ ndị Chaịna dị n' Abia steeti na-atụ arịrị maka ọnọdụ ọrụ ha sị dị.

Ụlọọrụ na-eme steel

Ebe foto si, Inner Galaxy.com

Ya bụ foto na ihe onyonyo dị na Twitter gosiri ka ndị Inner Galaxy Group, ụlọọrụ ndị Chaịna si anyụ ndị ọrụ ha ịkpakwụ.

Dịka ha dere ebe ahụ, e wezụga na-anaghị enye ndị ọrụ ezumike ọbụla n'izu, a na-akụ ha ihe tinka kụrụ panụ ma onye mehie.

Ya bụ ihe ngosi gosiri foto ndị mmadụ apịawachara azụ.

Gịnị bụ ebubo ebooro ụlọọrụ Inner Galaxy?

Ụlọọrụ na-eme steel
  • Ha sị na ndị nwe ya bụ ụlọọrụ na-akwasa ụmụ nwanyị nọọ be ahụ iko n'ike.
  • Ha sịkwa na-enwereike ịchụ mmadụ n'otu ntabi anya ma nwere ndị agha maọbụ ndị uweojii tịapụ onye ahụ ezi.
  • Ha bokwara na ọ nwere onye igwe eji arụ ọrụ ebe hụ bepụrụ ọkpa, mana ọnweghị enyemaka ọ nwetere.
  • Ndị mmadụ kwukara na otu n'ime iwu ọrụ ha bụ na ha gana akpọ onyeisi ha ọga (Master), onye nwaa anwa ghara ịme etụ ahụ, ọ nwere anya ya hụ ntị ya.
  • Ndị mmadụ na-akatọ ya bụ agwa na Twitter ma kwukwa na gọọmentị Abia steeti maara maka ya bụ mpụ, ma gbaa ntị (gbankịtị).

BBC akpọọla ndị ọrụ ahụ bụ Inner Galaxy Group, dị n'Umuahala community, Aba, Abia steeti, mana ha achọghị ịza ajụjụ maka ebubo a.

Ụlọọrụ na-eme steel

Ebe foto si, Inner Galaxy.com

Inner Galaxy na-arụpụta igwe steel na igwe ndị ọzọ.

Gọọmentị Abịa steeti sị na ha anụla ya bụ ebubo ma zịga mmadụ anọ ga-achọpụta ihe na-eme n'ebe ahụ.

Ụlọọrụ na-eme steel

John Okeiyi Kalu bụ Kọmịshọna mgbasa ozị n'Abịa steeti sị na onye nnọchịte anya ndị Ukwa West bụ ebe ya bụ ụlọọrụ dị bụ Godwin Adiele so na mmadụ anọ ahụ.

Ọ sị na ha tụrụ anya na ndị ahụ ga-ewepụta nchọpụta ha na mgbede taa.

Ụlọọrụ na-eme steel

Ebe foto si, Inner Galaxy.com

BBC ka na-emekwa nchọpụta gbasara ihe ndị a niile.

Akụkọ ga-amasị gị