Benefits of Drinking Cold Water: Lee ihe nnyocha sayensị kwuru gbasara ịṅụ mmiri oyi

Ebe foto si, Nigel Msipa
Ndụ azụ bụ mmiri, mana mmiri bụkwa ndụ ihe niile dị ndụ.
Ndị ọkachamara ekwuola na mmiri ka mkpa n'ahụ mmadụ karịa nri.
Mana ọtụtụ na-arụ ụka gbasara ụdị mmiri nke kacha edozi ahụ; ọ bụ mmiri oyi ka ọ bụ mmiri nkịtị.
Ọtụtụ na-ekwu na mmiri oyi anaghị adị mma n'ahụ ebe ndị ọzọ kwuru na mmiri bụ mmiri, mana gịnị ka nnyocha sayensị kwuru?
Mmiri oyi ọ na-enye nsogbu n'ahụ?

Ebe foto si, Getty Images
Onweghị nnyocha ọbụla gosiri kpọmkwem na mmiri oyi adịghị mma n'ahụ.
Kama nnyocha egosila na ịṅụ mmiri oyi na-eme ka mmadụ nweta ume ngwangwa ma mmiri kọọ ya n'ahụ, bekee na-akpọ nke a 'rehydration'.
Na nnyocha nke si n'aka 'International Journal of Clinical and Experimental Medicine', ha nyochara mmadụ isii bụ ndị egwuregwu (athletes) ma nye ha mmiri jụrụ oyi na nke dị ọkụ n'ụdị dị icheiche.
A chọpụtara na mmiri ịjụ oyi ya ruru '16 degree Celsius' kacha nye aka ibelata oke ọsịsọọ na-asọ onye na-emegharị ahụ.
Nnyocha ọzọ kwa e mere n'afọ 2012gosiri na mmadụ ịṅụ mmiri oyi oge ọ na-emegharị ahụ (exercise) ga-eme ka ekpomọkụ ime ahụ ya ghara ịrị elu.
Ndị ọkachamara ụfọdụ kwuru na mmiri ajụghị oyi nwere ike ime ka mmadụ ghara ịṅụzu ole mmiri ahụ ya chọrọ, nke a nwere ike ime ka mmiri malite ịkọ ya n'ahụ, nke a na-akpọ 'dehydration' na bekee.
Nke a bụ ihe nnyocha e mere n'etiti ndị agha mba Amerịka n'afọ 1989 siri gosi.
Mmiri oyi na mmiri nkịtị kedu nke ka mma?

Ebe foto si, Getty Images
Ịṅụ mmiri n'ụdị ọbụla bụ ihe dị mma maka ahụike, onweghị nnyocha gosiri na mmiri nkịtị ka mma n'ahụ karị mmiri oyi.
Ha abụọ dịcha mma, mana e nwere mgbe ahụ mmadụ na-anabata otu karịa ibe ya.
Iji maa atụ, onye na-emgharị ahụ maọbụ na-arụ ọrụ ike, mmiri oyi ga-aka nyere ya aka iweghachi mmiri si ya n'ahụ apụ.
Mana onye si n'ụra bilie n'isi ụtụtụ, mmiri nkịtị ka mma ịṅụ oge ahụ karịa mmiri oyi.
Ọzọkwa bụ na mmiri nkịtị na-aka enye aka ịkutu nri mmadụ riri, nke bụ 'digestion' na bekee, karịa mmiri oyi.
Nke a bụ maka na ahụ gị ga-emerịrị ka mmiri ahụ kpotụ ọkụ tupu o jiri ya rụọ ọrụ, nke a nwere ike ime ka oge nri ga-ewe iji rụọ ọrụ n'ahụ nwere ike too ogologo ma ị ṅụọ mmiri oyi.
Oge ka mma ịṅụ mmiri oyi:
- Mgbe ị na-emegharị ahụ, maọbụ arụ ọrụ ike
- Mgbe oke ekpomọkụ dị n'ikuku
- Mgbe ị na-enwe ahụ ọkụ
- Ọtụtụ na-ekwu na ịṅụ mmiri oyi na-enye aka maka onye chọrọ ịta ahụ, mana onweghi nnyocha gbara akaebe maka nke a.
Oge ka mma ịṅụ mmiri dị ṅaraṅara:
- I bilie ụra n'ụtụtụ
- Mgbe ị na-eri nri
- Oge ị nọ na nsọ (maka ụmụnwaanyị)

















