A sị na mmiri bụ ndụ mana lee ụdịrị ahụhụ ndị obodo a na-ata inwete mmiri
Ndi gbo na-asị na "mmiri bụ ndụ."
Ndi ọgbara ọhụrụ kwenyekwara na nke ahụ, nke mere ka mbaụwa kwuo na mmiri so n'ikike dịrị onye ọbụla nke Bekee na-akpọ 'human rights.'
Mana ọtụtụ mmadụ ka na-ata ezigbote ahụhụ maka inwete mmiri di ụcha ha ga-aṅụ.
Akukọ a bara obodo Olo ebe ọ bụ n'otu iyi ha na-akpọ Karawa ka ha na-echu mmiri ha ji eme ihe niile.
Lee ihe ha na-agabiga n'akụkọ a.

