'EFCC jidere T.A Orji makana ọ gwaghị ha na ọ na-aga njem'

T.A Orji

Ọnụ na-ekwuru T.A. Orji bụ Ifeanyi Umere sị na ọ bụ maka akwụkwọ o ji eme njem ka ngalaba na-ahụ maka mpụ na-rụrụ aka bụ "Economic and Financial Crimes Commission" (EFCC) ji kpọwa ya oku ahụ nke mere eji kwụsị ya ịga njem ofesi o na-aga.

Cheta na EFCC jidere T.A. Orji bụbu aka na-achị Abia Steeti dịka ọ nọ n'ọdọ ụgbọelu Nnamdị Azikiwe dị n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.

Kepu kepu kwuru na ọ bụ mkpesa ndị mmadụ mere banyere etu Maazị Orji jiri chịa Abia steeti butere ya nsogbu a.

Dịka Maazị Orji bụzị onye na-anọchịte Abia Central n'ụlọ omeiwu ukwu n'Abuja onweghịzị mkpuchi ikpe ikpe dịka o nwere n'oge ọ bụ gọvanọ.

Mana Maazị Umere sị na "ihe gbagwojuru anyị anya bụ na ha bịara chebiri ya n'ụzọ ebe ọ na-eme njem".

Nwa T.A. Orji bụ Chinedu Orji bụ Onyeisi Ụlọ Omeiwu n'Abia sokwa nna ya gawa ogige EFCC ụnyaahụ.

Maazị Umere gwara BBC Igbo na ọ bụ makana onweghi ihe tara akpụ eji nwuchie onyeisi ya mere eji hapụ ya ka ọ laa dịka ha gbachara ya ajụjụ ọnụ.

Ọ sị: "Maazị Orji riri ofe achalla na be ya n'abalị."

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Economic Financial Crime Commission (EFCC) bụ Wilson Uwujaren gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ha hapụrụ Ọrji ka ọ laa be ya ụnyaahụ.

Ọ sịkwa na ọnwebeghị ihe ọhụrụ pụtara n'okwu T.A. Orji onye bụbu Gọvanọ Abia steeti nakwa onye nnọchite anya Abia Central n'ụlọomeiwu ukwu.

"EFCC ekweghị ekwu ihe ha ji kpọọ ya oku ahụ"

Umere sị na ịza EFCC oku abụghị ihe ọhụrụ ebe T.A.Orji, "dịka onye chigoro steeti mbụ, a na-akpọ ya oku kwa mgbe kwa mgbe ịbịa kọwaa ihe ụfọdụ".

Aha onyonyo, 9th Assembly: Ọ dịghị mfe ịchịcha dịka gọvanọ ma bụrụ Sịnetọ - T.A Orji

Ọ sị na T.A. Orji kwesiri ịga maka nnyocha akwụkwọ o ji eme njem na EFCC tupu o mee njem, mana ọ gaghị ya, na ọ ga-abụ ya mere ha ji jide ya n'ụzọ.

Umere sị na Orji agaghịzị eme ya bụ njem ọ kwadoro ime ugbua iji nye ohere ka a mara ka ha a ga-akpọ ya ọzọ.

Orji so na ndị EFCC na-etinyere anya kemgbe ọ pụtara n'ọchịchị dịka Gọvanọ Abịa steeti maka ebubo imefu ego.

Akụkọ ga-amasị gị