America Visa: Ihe Naịjirịa ga-eme ka Amerịka gbapere ha ụzọ ime njem

Gọọmentị mba Amerịka enyela Naịjirịa ọnọdụ ihe ha ga-eme ka e mepere ha ọnụ ụzọ mba ha.
Onye na-anọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ Mary Beth Leonard kwụpụtara nke a mgbe o zutere mịnịsta ndị ọrụ bụ Chris Ngige.
Nke a na-abịa dịka Amerịka tinyere aha Naịjirịa na mba ndị ha agaghị enye akwụkwọ njem bịa biri n'Amerịka.
Amerịka sị na ọ bụ maka ọnọdụ ọjọọ nchekwa dị na mba ndị a gụnyere Eritrea, Sudan, Tanzania, Kyrgyzstan and Myanmar.
Kedụ ihe ha chọrọ ka Naịjirịa mee?

Ebe foto si, Nigeria Immigration Service
1. Mary Beth Leonard bụ onye na-anọchiteanya Amerịka n'ime Naịjirịa kwuru ụfọdụ ihe gọọmenti ha sị ka Naịjirịa mee.
Ọ sị na ọ bụrụ na Naịjirịa wulite ọba ozi banyere njirimara ụmụafọ ya a kpọrọ 'data intelligence' nke ọma.
Amerịka sị na nke a ga-enyere mba ha aka inyocha nwafọ Naịjirịa ọbụla na-abata na mba ha.
2. Ha kwuru na Naịjirịa ga-agbalị hazie igwe nkekọrịta ozi ha na ndị Amerịka nke ọma.
Leonard sị na ọ bụrụ na Naịjirịa mee nke a na ha ga-elebanya iwepụ mmachi ahụ a machiri ha.
Kedụ ndị mmachi na-emetutaghị?
Mba Amerịka sị na mmachị a emetụtaghị ndị bi n'Amerịka ugbua, ndị na-aga ịgụ akwụkwọ, na ndị mere njem nlereanya.
Kama na ọ bụ naanị ndị na-achọ akwụkwọ ị ga biri n'Amerịka a kpọrọ 'Permanent visa'.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









