Chidinma Adaora Ojukwu akọọla ihe ọ ma maka ọnwụ Michael Usifo Ataga a sị na ọ sugburu

Nwata akwụkwọ mahadum UNILAG aha ya bụ Chidinma Adaora Ojukwu ekwuola n'ezia na ya sugburu Onyeisi ụlọọrụ Super TV a si na aha ya bụ Michael Usifo Ataga. Na nkwuputa, o kpughere na ya na nwoke ahụ kwụrụ ụgwọ ọnụụlọ ezumike Lekki, Lagos Steetị.

O kwukwara na ya na nwoke ahụ ṅụrụ mmanya ma se kwa ihe osise na-aba n'anya mgbe o sụgburu ya.

Dịka akpughariri nwada ahụ taa, Komishona ndị uweojii na Lagos bụ Hakeem Odumosu gwara ndi nta akụkọ na n'ezia, n'ụbọchị 15 nke onwa juun, ya bụ nwada na nwoke ahụ kwabara na ya bụ ụlọ ezumike ka enyi na enyi, mana na nwada ahụ putaziri na ụlọ ahụ ma nwoke ahụ esoghị puta.

N'okwu ya, o kwuru na mgbe otu ụbọchị gachara, ndị na-ehicha ebe ahụ ahughi ka onye obula sị n'ụlọ ahụ pụta.

Ha banyere n'ime ya bụ ụlọ hụzie nwoke ahụ ebe ọ dina n'ala, ha hụkwara ka ọbara juru ebe ahụ.

O bụ mgbe ahụ ka akpọrọ ndị uweojii ka ha bịdo ọrụ n'isi ya. N'okwụ nwada ahụ kwuru, o sị na ya bụ nwoke dinara ya n'ike mgbe ha nọkoro n'ụlọ ahụ.

O kwukwara na ya bụ omume gbawara ya obi ma kpasukwa ya iwe.

Dịka o jiziri obi iwe nọọrọ onwe ya, we gwawa nwoke ahụ etụ obi di ya.

O kwuru na ya bu nwoke nyere ya ATM kaadị ya, gwa ya ga zụta ihe obula ọ chọrọ.

Nwada ahụ kwuru na ya bụ okwu kpasuru ya iwe, maka na n'uche ya, o dizika a na-ekwu na ọkụ gbara Fada, ya bụ nwoke a na-ajụ ma ọ gbara afọọnụ ya.

"A na-ekwu na ọ dinaghara m n'ike, nwoke nwa a na-enye m ego". Dịka ha nọzị n'akọ ọnụ, o kwuru na nwoke ahụ bakwudoro ya ma chokwara idina ya n'ike ọzọ.

Ọ bụzị oge ahụ ka nwada ahụ sị na o bịdọrọ lụwa ọgụ, ya bụ nwaada kwukwara na o weziri mma dị ya nso sugbuo nwoke ahụ n'ike, ma gbanwe akwa o yibụ werezie ATM kaadị nwoke ahụ were gbapụ ọsọ.

Akụkọ ga-amasị gị