Jason Njoku rịọrọ Ndigbo mgbaghara dịka ọtụtụ mmadụ nyere ụlọ ọrụ Iroko TV nkwado

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Jason Njoku bụ onye nwe ogige ịntanet nke e ji ekiri ejije a kpọrọ Iroko TV arịọla Ndigbo arịrịọ maka maka okwu o kwuru banyere asụsụ Igbo.

Ọ bụ n'afọ 2019 ka Maazị Njoku dere n'akara Twitter ya na ụmụ ya "na-amụ asụsụ French. Ga-amụ asụsụ Mandarin na nsote ya ruo afọ iri na-abịa. Ha amaghị asụ Igbo dịka ya onwe ya mana nke ahụ enwghị ihe o mere makana ụwa aghaghị ama jijiji".

Ihe were ọtụtụ ụmụ afọ Igbo iwe nke mere ha ji rotekwa ya dịka ụfọdụ mmadụ malitere atụmatụ ịkwatụ ụlọọrụ ya site n'iwepu ya n'ọdụ ahịa Google Playstore.

Mana dịka ndị mmadụ gara n'igwe ga kwado Iroko TV n'izu ụka gara aga, Maazị Njoku pụtara rịọ mgbaghara.

Ọ bụ n'akara Twitter ya ka ọ dere arịrịọ a dịka ọ na-ekele maka etu e siri kwado ya na Playstore.

Ọ sị na ya dara ya n'ihe o mere ma na-ekwukwa na ya bu onye Igbo kpọmkwem dịka ya na ụmụ ya na-aza aha Igbo sọsọ.

Ihe butere ịrịọ arịrịọ a

Cheta na ndị mmadụ malitere na-ekesasị atụmatụ ịkatọ ụlọọrụ Iroko TV na ndị ọzọ na Playstore.

Ha dere na ha mere nke a iji megwara ihe ha sị na e mere Maazị Adamu Garba na akụrụngwa soshal midia ya a kpọrọ Crowwe.

Cheta na e wepụrụ Crowwe na Playstore dịka ọtụtụ mmadụ katọchara ya ma degaara Google mkpesa.

Adamu Garba mechara sị na ọ bụ ya ji aka ya wepu ya bụ akụrụngwa.

A na-eche na nkatọ ndị mmadụ katọrọ Crowwe metụtara okwu Maazị Garba kwuru oge Naijirịa machiri Twitter.

Maazị Garba sibu na dịka Twitter nọzị na mmachị, na ọ bụ ohere Crowee ga-eji were ọnọdu ọfụma.

Etu atụmatụ a si emetụta IrokoTV?

Dịka atụmatụ pụtara, ndị mmadụ na-akwado Iroko TV malitere amụma nke ha na-asị ka ndị mmadu ga na Playstore ga-akwadosie ya ike.

Mana, dịka BBC Igbo hụrụ na nyocha e mere na Playstore, okwu nkatọ etinyere na Iroko App di ole na ole n'ụbọchị 18 nke ọnwa Juun ikesa atụmatu ahụ malitere na soshal midia.

Ugbua, ndị nke na-akwado ya bụ ọkankụ, ma ka na-arịkwa elu.

Kedụ ihe Adamu Garba kwuru banyere atụmatụ ịkatọ Iroko TV?

Adamu Garba mere onyonyo na Facebook ya were na-akatọ atụmatụ ide ajọ ihe banyere Iroko TV.

Ọ sị na ya na-akwadosi Iroko TV ike makana ọ bụ ogige ya na ezinaụlọ ya ji ekiri ejije dị icheiche.

Ọ sịkwa na Jason Nkoju bụ ezigbo mmadụ, na ọdịmma obodo na ndị mmadụ na-anụ ya ọkụ n'Obi.

Ọ rịọrọ ndị mmadụ arịrịọ ka ka hapụ ide ihe ọbụla adịghị mma maka Iroko TV.

Kedu ihe Iroko TV kwuru banyere ihe a na-akpọtụ?

BBC Igbo kpọtụrụ Iroko TV ịmata etu ha si hụta nkata a na-akpa megide ha.

Ha sịrị ka anyị dere ha email banyere ya.

BBC Igbo dekwara ya bụ email ma na-eche ka ha saa ya. Ha mee etu ahụ, ọha ga-ahụ ha n'ibe akwụkwọ a.

Mana, ka okwu dị ugbua, ndị mmadụ ka majuru na ogige Iroko TV na Playstore na-ede nkwado ha aghara aghara.