Ejizi maka Soshal midia achụ ndị uweojii?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mgbe nwaada Ifeoluwa Adegoke, bụ onye ji akara @ife_luv12 na Twitter dere na otu onye uweojii wakporo ya ma yie ya egwu, n'ihi na ọ jụrụ inye ya ego n'agbanyeghị na onye uweojii ahụ kwuru na ọ gaghị ahapụ ya ma ọ bụrụ na o nyeghị ya ego, o mere ihe ndị mmadụ na-emezị ugbua iji hụ na ụwa matara ihe na-eme ha.

Adegoke dere ihe ndị SARS bụ ngalaba uweojii na-ahụ maka ndị ojiegbe ezu ohi, mere ya ma tinye akara Yomi Shogunle bụ onye uweojii na-ahụ maka ịkwụwa aka ọtọ n'uweojii.

Ihe o dere wuru ewu ọfụma, ọkachasị mgbe Shogunle zara ya.

Emechara nwụchie onye uweojii aha ya dị n'akara ụlọakụ nwaada Ife jiri kwunye ego anaara ya.

ACP Shogunle kwuru na ha nwụchịkọrọ Charles Omotosho bụ onye uweojii na-arụ ọrụ n'Ikorodụ, dị na Legọsị, wee wepụ ya n'ọrụ.

N'okwu Adegoke, ndi uweojii mere ngwa ngwa hụ na o nwetara ikpe ziri ezi ọsịsọ, kpatara ndị mmadụ ji na-ajụ ma soshal midia ọbuzị ebe a na-ewega ikpe banyere ndị uweojii iji hụ na-emere ihe maka ya?

Cheta akụkọ Immanuel James Ibe-Anyanwu, bụ nwaafọ ndị SARS wakporo ka o si n'ụlọakụ apụta.

Maazị Ibe-Anyanwu tikwara mkpụ na sosal midi nke mere ndi mmadụ ji gbatara ya ọsọ enyemaka.

Gere ihe Immanuel James Ibe-Anyanwu gwara anyi mgbe ihe mere n'elu:

Otutụ mmadu na-ekwu na soshal midia bụ ihe ọma, okachasị mgbe ọ na-enye aka n'ụdịrị ihe a.

Mana enwere ndị na-akọwa na ihe ọjọọ na-esi soshal midia apụta, nke mere na ndị mmadụ kwesịrị ịkpachara anya ma ha na-eme ihe ha na-eme.

Ndị uweojii Naịjirịa so na ndị ụlọọrụ gọọmentị na-apụta na soshal midia ọfuma maka igeta na ime mkaprịtaụka ga-enye aka hụ na ihe kwesịrị ịga etu o kwesịrị.

Unyaahụ, ha mere emume ha kpọrọ '#AskThePolice', bụ nke nyere ndị mmadụ ohere ịjụ ha ajụjụ banyere ọrụ ha. Onye sara ajụjụ bụ onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris.

Akụkọ ga-amasị gị: